Igbo Mass Readings for July 5 2026, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 5 2026, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:9-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Zekaraya

Isi Okwu: Lee, eze gị ji umeala na-abịakwute gị.

Gị bụ ada Zayọn, were obi gị nile ñụrịa nnukwu ọñụ. Gị bụ ada Jerusalem, tie mkpu ọñụ. N’ihi na lee, Eze gị na-abịakwute gị. Ọ bụ Onye Nzọpụta aka Ya kwụ ọtọ.

Ọ dị nwayọọ, bịakwa na-agba ịnyịnya ibu. Ọ nọkwasara n’elu nwa ịnyịnya ibu. Ọ ga-ebipụ ụgbọ ala nke Ifrem na ịnyịnya agha nile nke Jerusalem. Ọ ga-agbajikwa ụta agha bịakwa gwa mba nile okwu udo.

Ọgbọ ọchịchị ya ga-esite n’oke osimiri ruo n’oke osimiri nke ọzọ bịakwa site n’osimiri, ruo na nsọtụ nile nke ụwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 144:1-2. 8-11 13-14. Az. 1

Azịza: Chineke m na eze m, aga metogide aha Gị ruo mgbe ebịghị ebi. ma ọ bụ Aleluya.

1. Chineke m na eze m, aga m eto Gị.

Aga m agọzi aha Gị ebịghị ebi.

Aga m eto Gị kwa ụbọchị, kwa ụbọchị.

Aga m eto aha Gị ebighị ebi, ebighị ebi.

Azịza: Chineke m na eze m, aga metogide aha Gị ruo mgbe ebịghị ebi. ma ọ bụ Aleluya.

2. Onyenweanyị bụ onye amara na onye ebere.

Ọ naghị ewe iwe ọkụ. Obi ọma Ya ebuka.

Ọ na-emere ihe nile O kere ebere.

Azịza: Chineke m na eze m, aga metogide aha Gị ruo mgbe ebịghị ebi. ma ọ bụ Aleluya.

3. Onyenweanyị, ka ihe dum I kere kelee Gị.

Ka ndị kwere na Gị too Gị.

Ha kọọ akụkọ ebube nke alaeze Gị.

Ha kwuo okwu banyere ịdị ike Gị.

Azịza: Chineke m na eze m, aga metogide aha Gị ruo mgbe ebịghị ebi. ma ọ bụ Aleluya.

4. Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasa obi n’okwu Ya nile.

Ọ dịkwa asọ n’ọrụ aka Ya niile.

Onyenweanyị na-ebulite ndị nile na-ada ada.

Ọ na-ekulite ndị nile huru ehuru.

Azịza: Chineke m na eze m, aga metogide aha Gị ruo mgbe ebịghị ebi. ma ọ bụ Aleluya.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:9, 11-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Ụnụ ga-ebi ndụ ka ụnụ were Mmụọ Nsọ kpagbuo mmehie nke anụ ahụ.

Ihe ụnụ chọrọ abụghị ihe nke anụ ahụ, kama ihe nke mmụọ, ebe ọ bụ na Mmụọ Chineke bi ebi n’ime ụnụ. N’ezie, ọ bụrụ na ụnụ enweghị Mmụọ nke Kristi, ụnụ abụghị ndị nke Ya.

Ọ bụrụ na Mmụọ nke Onye ahụ kulitere Jesu n’ọnwụ, bi ebi n’ime ụnụ; ọ pụtara na Onye ahụ kulitere Jesu n’ọnwụ, ga-esite na Mmụọ Ya, were ndụ nye ahụ ụnụ pụrụ ịnwụ anwụ.

Ụmụnna m, n’ihi ya, o nweghị mkpa ọ bụla ọ dị, irubere onwe anyị nke bụ anụ ahụ isi, ma ọ bụ ibi ndụ nke anụ ahụ. O bụrụ na ụnụ biwe ndụ dị otu ahụ, ụnụ ga-ala n’iyi. Ma ọ bụrụ na ụnụ were Mmụọ Nsọ pịgbuo mmerụ nke anụ ahụ, ụnụ ga-adịkwa ndụ.

MBEKU – Jọn 14:5

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ụzọ, ezi okwu na ndụ. O nweghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna, e wepụ ma o si n’aka M.

Aleluya!

OZIỌMA – 11:25-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Isi Okwu: Adị M nwayọọ dịkwa umeala n’obi.

N’oge ahụ, Jesu kwuru sị: “Nna!, Onyenwe eluigwe na ụwa! Ana M ekele Gị, n’ihi na, ihe a I zonarịrị ndị oke mmụta na oke aghụghọ, ka i kpugherela ụmụntakịrị na-amaghị ihe!

Nna! E, ọ bụ otu o si masị Gị, ka I si mee ya! “Nna M weere ihe nile nyefee M n’aka. O nweghị onye ma onye Nwa bụ, ma ọ bụghị sọ Nna; otu o si bụrụ, na o nweghị onye ma onye Nna bụ, ma ọ bụghị sọ Nwa, ma ọ bụ onye ọ bụla ọ sọrọ Nwa igosi Ya.

“Bịakwutenụ M, ụnụ nile bụ ndị na-adọgbu onwe ụnụ n’ọrụ, ndị e bokwara ibu dị arọ, aga M enye ụnụ ezumike. Nyaranụ ibu M n’ubu ụnụ. Mụtakwanụ ihe site n’aka m, maka na adị M nwayọọ, dịkwa umeala n’obi. Mmụọ ụnụ ga-achọta ezumike. N’ezie, ibu M dị nfe. Ibu M adịghị arọ.

Igbo Mass Readings for July 6 2026, Mọnde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for July 5 2026, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.