Igbo Mass Readings for July 4 2027, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 4 2027, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:2-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Izikel
Isi Okwu: Ha bụ ndị na-enupụ isi, ha ga-amata na onye amụma nọ n’etiti ha.
Mmụọ nke Onyenweanyị banyere n’ime m. Ọ bịakwara mee ka m guzo ọtọ n’ụkwụ m abụọ. Anụrụ m ka ọ na-agwa m okwu sị: “Nwa nke mmadụ, ana m eziga gị ka i jekwuru ndị Izrel, ndị bụ mba na-enupụ isi, ndị nupụrụ isi megide m.
Ha na nna nna ha enupụla isi ha megide m, ruo ọ bụladị ugbu a m na-ekwu okwu. Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isi ike, na ndị nnupụ isi. Gwa ha ihe ndị a sị ha.
Lee ihe Onyenweanyị Chineke kwuru. Ha bụ ndị na-enupụ isi, n’ihi ya, ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị, ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma nọ n’etiti ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 122:1-2, 3-4. Az. 2
Azịza: Anya anyị wụkwasara n’Onyenweanyị ruo mgbe Ọ ga egosi anyị ebere Ya.
1. Gị bụ onye ahụ nọdụrụ ala n’oche eze nke igwe,
eweliteere m Gị anya m elu,
n’ụdị ahụ anya ohu si ele aka nke nna ya ukwu.
Azịza: Anya anyị wụkwasara n’Onyenweanyị ruo mgbe Ọ ga egosi anyị ebere Ya.
2. Dịka anya odibo nwanyị si ele aka nne ya ukwu,
otu ahụ kwa ka anya anyị si ele Onyenweanyị Chineke,
wee ruo mgbe O meere anyị ebere.
Azịza: Anya anyị wụkwasara n’Onyenweanyị ruo mgbe Ọ ga egosi anyị ebere Ya.
3. Onyenweanyị, meere anyị ebere.
Biko, meere anyị ebere.
N’ihi na nleda anya e ledara anyị akarịala.
Obi agbapịala anyị n’ebe ndị nganga ji anyị akpa ọchị.
Azịza: Anya anyị wụkwasara n’Onyenweanyị ruo mgbe Ọ ga egosi anyị ebere Ya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:7-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt.
Isi Okwu: Obi dị m ụtọ nke ukwuu mgbe m na-anya isi n’ime adịghị ike m.
Ka m wee ghara ịfụli onwe m elu karịa, n’ihi ihe ịtụ n’anya na oke mkpughe Chineke kpugheere m, e tinyere ihe mgbu n’anụ ahụ m, ka ọ na-adụ m dịka ogwu.
Ihe mgbu a dị n’anụ ahụ m na-eti m aka dịka mmụọ ozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụli onwe m elu karịa. Ugboro atọ ka m rịọrọ Onyenweanyị arịrịọ banyere ihe a, ka ọ pụọ n’ahụ m.
Ihe Ọ zara m bụ: “Amara M ezuorela gị! N’ihi na ike M na-apụta ihe mgbe ike mmadụ na-adịghị.” Ya mere, obi dị m ụtọ nke ukwu mgbe m na-anya isi n’ime adịghị ike m niile, ka ike nke Kristi wee rịdakwasị m, birikwa n’ime m.
Ya mere, n’ihi Kristi, ka m na-anagide adịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, mkpa, nsogbu niile, na ihe ndakwasị dị iche iche. N’ihi na mgbe m na-adịghị ike n’anụ ahụ ka m nwere ike na mmụọ karịa.
MBEKU – Jọn 1:12.14
Aleluya, aleluya!
Okwu Chineke ghọrọ mmadụ wee binyere anyị. O nyere ndị nabatara Ya ike ịghọ ụmụ Chineke.
Aleluya!
OZIỌMA – 6:1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Onye amụma nwere nsọpụrụ ebe ọ bụla ma e wepụ n’aka nna ya.
Jesu wee si n’ebe ahụ pụọ laghachi n’obodo amụrụ Ya. Ụmụazụ Ya sokwa Ya gaa. Mgbe ụbọchị izuike ruru, Ọ malitere izi ihe n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ibobo wee nwụọ ndị niile nụrụ nkuzi Ya n’ahụ, nke mere na ha malitere ịjụ sị: “Ebee ka nwoke a nọrọ mụọ ihe ndị a niile?
Olee ụdị amamihe e nyere Ya? Leekwa ọrụ ebube nke a rụrụ site n’aka Ya. Nwoke a, ọ bụghị nwa kapịnta, nwa Meri, na nwanne Jemis, na Josef, na Judas, na Saịmọn?
Ụmụnne Ya ndị nwanyị, ọ bụ ha anọghị n’ebe a n’etiti anyị?” Ha wee hie ụzọ n’okwukwe ha, jụ ịnabata Ya. Jesu wee sị ha: “Onye amụma nwere nsọpụrụ ebe ọ bụla ma e wepụ n’ala nna ya, n’etiti ndị ikwu na ibe ya, na n’obi nna ya.”
N’ihi ekweghị ekwe ha, O nwezighị ike ịrụ ọrụ ebube ọ bụla n’ebe ahụ, ma e wepụ na O bikwasịrị ndị ọrịa olemole aka Ya, wee mee ka ahụ ha dị ike. Ekweghị ekwe ha wee juu Ya anya.
Igbo Mass Readings for July 5 2027, Mọnde Izuụka nke Iri na Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for July 4 2027, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.