Igbo Mass Readings for July 25 2027, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 25 2027, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:42-44

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Abụọ Nke Ndị Eze

Isi okwu: Ha ga-eri ya, rijukwuaa afọ.

Otu nwoke si Baal-shalisha bịa. O weere iri ogbe achịcha abụọ si na mkpụrụ mbụ nke ọka ọhụrụ ya, wetara onye nke Chineke Ilisha. Ilisha asị: “Nye ya ndị mmadụ a ka ha rie.

Mana nwodibo ya jụrụ ajụ sị: “Kedụ ka m si enye narị mmadụ nwa ihe ntakịrị a”? Ma Ilisha zara sị ya: “Nye ya ndị mmadụ a ka ha rie. N’ihi na, lee ihe Onyenweanyị kwuru: “Ha ga-eri ya, bịakwa rifọ ya erifọ.” Mgbe ha rijuchara afọ, e nwekwara nke e rifọrọ erifọ, dịka Onyenweanyị si kwuo.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 144:10-11, 15-18. Az. 16

Azịza: Aka Onyenweanyị na-azụ anyị. Ọ na-egboro anyị mkpa anyị niile.

1. Onyenweanyị, ka ọrụ aka Gị niile kelee Gị.

Ka ndị kwere na Gị gọzie Gị.

Ha ga-akọ akụkọ ebube nke alaeze Gị,

bịakwa na-ekwupụta ike Gị.

Azịza: Aka Onyenweanyị na-azụ anyị. Ọ na-egboro anyị mkpa anyị niile.

2. Anya niile ji ntụkwasa obi na-ele Gị.

Ọ bụ Gị na-enye ihe ọ bụla nri ya na mgbe ya.

Ọ bụ Gị na-asaghe aka were nye ihe ọ bụla dị ndụ afọ ojuju.

Azịza: Aka Onyenweanyị na-azụ anyị. Ọ na-egboro anyị mkpa anyị niile.

3. Onyenweanyị ziri ezi n’ụzọ Ya niile.

Ọrụ Ya niile dịkwa asọ.

Onyenweanyị nọ ndị na-akpọku Ya nso.

Ọ nọ ndị ji ezi okwu na-akpọku Ya nso.

Azịza: Aka Onyenweanyị na-azụ anyị. Ọ na-egboro anyị mkpa anyị niile.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs

Isi okwu: Otu ahụ, otu Onyenweanyị, otu okwukwe, otu mmirichukwu.

Mụ onwe m bụ onye a tụrụ mkpọrọ n’ihi Onyenweanyị, na-arịọ ụnụ, ka ụnụ chegharịa, dị ndụ kwesịrị ọkpụkpọ Chineke kpọrọ ụnụ. Dịnụ ume ala, dịkwanụ nwayọọ.

Nweenụ ogologo ntachi obi; werenụ ịhụnanya na-edi ihe ibe ụnụ mere ụnụ. Gbaanụ mbọ, mee ka ịdị n’otu ahụ Mmụọ Nsọ na-enye gbaa mgbọrọgwụ, site n’inwe obi udo nke bụ ihe na-ekekọta mmadụ na ibe ya.

E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, otu e siri nwee otu nchekwube e nyere ụnụ niile bụ ndị Chineke kpọrọ oku. Ọ dị otu Onyenweanyị, na otu okwukwe na otu mmirichukwu.

Ọ dịkwa otu Chineke na Nna mmadụ niile, Onye bụ isi na Onyenwe ihe niile, Onye nọ n’ime ihe niile bịakwa si n’ihe niile na-arụ ọrụ.

MBEKU – Ọrụ Ndị Ozi 16, 14

Aleluya, aleluya!

Ka Nna Onyenweanyị Jesu Kristi tinye ihe n’anya nke obi anyị. Ka anyị wee hụ ka olile anya dị n’oku a kpọrọ anyị si buo ibu.

Aleluya!

OZIỌMA – 6:1-15

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi okwu: Jesus nyere ndị nọdụrụ ala ihe ha chọrọ.

Jesu gafere n’akụkụ nke ọzọ nke Osimiri Galili, ma ọ bụ Tiberias. Oke igwe mmadụ so ya, n’ihi na ha hụrụ ọrụ ịrịba ama dị iche iche Ọ rụrụ site n’ịgwọ ndị ọrịa.

Jesu rịgooro n’elu ugwu, Ya na Ụmụazụ Ya wee nọdụ ala n’ebe ahụ. Emume Ngabiga nke ndị Juu dị nso. Mgbe Jesu lepụrụ anya, hụ na oke igwe mmadụ na-abịakwute Ya.

O wee jụọ Filip: “Olee ebe anyị ga-azụta nri a ga-enye ndị a ka ha rie?” O kwuru ihe a ka Ọ mata ihe Filip ga-aza. N’ihi na Ya onwe ya maara ihe Ọ na-ezube ime. Filip zara ya sị: “Olee otu nke a ga-esi mee?

Ọ ga-efu ego dị ukwuu ịzụta nri nke onye Ọ bụla n’ime ha ga-eritụ naanị nri ntakịrị.” Otu onye n’ime ndị Ụmụazụ, nke bụ Andru, nwanne Saịmọn Pita, wee sị Ya: “E nwere otu nwantakịrị nọ n’ebe a, onye ji ogbe achịcha ise na azụ abụọ a mịkpọrọ amịkpọ.

Ma gịnị ka nke a bụ iji zụọ igwe mmadụ ha otu a? Jesu asị ha: “Meenụ ka ndị mmadụ nọdụ ala.” Ahịhịa juru n’ebe ahụ. Ndị a niile nọdụrụ ala. Ha dị puku mmadụ ise! Jesu naara ogbe achịcha ise ahụ, nye ekele, wee kesaara ha ndị nọdụrụ ala n’ebe ahụ.

Otu aka ahụ kwa ka O si kesaa azụ ahụ a mịkpọrọ amịkpọ. Onye ọ bụla riri nke ọ chọrọ. Mgbe ha rijusịrị afọ, Jesu sịrị Ụmụazụ Ya: “Kpokọtanụ iberibe achịcha fọdụrụnụ, ka a ghara inwe ihe ọ bụla a lara n’iyii.”

Ha tụtụkọtara ihe niile fọdụrụnụ n’ogbe achịcha ise ahụ, wee kpojuo nkata iri na abụọ. Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịba-ama nke a Jesu mere, ha sịrị: “N’ezie, onye a bụ Onye Amụma ahụ na-abịanụ n’ụwa!” Mgbe Jesu matara na ha na-achọ ịbịa dọkpụrụ Ya n’ike, chie Ya eze, Ọ gbalara n’ugwu nọdụ naanị ya.

Igbo Mass Readings for July 25 2027, Mọnde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for July 25 2027, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.