Igbo Mass Readings for July 27 2025, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 27 2025, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:20-32
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis
Isi Okwu: E nwere m nchekwube na Onyenwe m agaghị ewe iwe, kama Ọ ga-enye m ohere ka m kwuo okwu.
Osebụrụwa Chineke wee kwuo sị: “Mkpu ihe ọjọọ, na arụ niile jupụtara obodo Sodom na Gomora na-abawanye. Njọ ha na-ebuwanye. Achọrọ M ịga chọpụta ma ha na-eme ihe ọjọọ niile a a na-eti mkpu maka ha nke na-erute M ntị.
Achọrọ M ịmanụ”. Mgbe mmadụ abụọ ahụ hapụrụ gawa Sodom, Ebreham guzoro n’ihu Osebụrụwa. Ebreham wee kpụdebe Osebụrụwa nso sị Ya: “Ọ bụ ezie na Ị ga-emebikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume?
Ọ bụrụ na i nweta iri mmadụ ise dị mma n’obodo ahụ, Ị ga-emenyere ha egwu n’ezie? Ọ bụ na Ị gaghị ahapụ imebi obodo ahụ n’ihi iri mmadụ ise ahụ bụ ndị ezi omume? E chekwala echiche ime ihe dị otu a: igbukọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume; ime ndị ezi omume ihe e mere ndị ajọ omume.
E chekwala ụdị echiche ahụ. Ọ bụ na onye ga-ekpe ụwa niile ikpe agaghị ekpezi ikpe ziri ezi? Osebụrụwa zara ya sị: “Ọ bụrụ na M enweta iri mmadụ ise bụ ndị ezi omume n’obodo Sodom, aga M eji n’ihi ha agbaghara obodo ahụ niile”.
Ebreham agwakwa Ya sị: “Obi siri m ike ikwu okwu n’ihu Osebụrụwa, mụ onye bụ naanị aja na ntụ. Ma ọ bụrụkwanụ na a hụ iri mmadụ anọ na ise bụ ndị ezi omume n’ebe ahụ. Ị ga-emebi ya?”
Osebụrụwa zara ya sị: “Mba, agaghị M emebi ya ma M nweta iri mmadụ anọ na ise bụ ndị ezi omume n’obodo ahụ.” Ebreham wee sịkwa Ya ọzọ: “Ọ bụrụkwanụ na e nweta iri mmadụ anọ ndị ezi omume n’obodo ahụ?” Osebụrụwa azaa ya sị: “Agaghị M emebi ya n’ihi iri mmadụ anọ ndị ezi omume ahụ.”
Ebreham wee kwuo sị: “Onyenwe m, enwere m nchekwube na Ị gaghị ewe iwe, kama hapụ m ka m kwuo okwu. “Ọ bụrụkwanụ na e nweta naanị iri mmadụ atọ?” Osebụrụwa zara ya sị: “Agaghị M emebi ya ma ọ bụrụ na e nweta iri mmadụ atọ.”
Ebreham wee kwukwaa sị: “E nwere m nchekwube n’ịgwa Osebụrụwa okwu. “Ọ bụrụ na ndị ezi omume dịkwanụ naanị iri mmadụ abụọ?” Osebụrụwa zara sị: “Agaghị M emebi ya n’ihi iri mmadụ abụọ ahụ bụ ndị ezi omume.”
Ebreham wee kwuo ọzọ sị: “Eji m n’aka na Osebụrụwa m agaghị ewere m iwe ma m kwuo okwu ọzọ, sọsọ otu ugboro: “Ọ bụrụkwanụ na e nweta naanị mmadụ iri ndị ezi omume?” Osebụrụwa zara ya sị: “Agaghị M emebi ya ma e nweta mmadụ iri ndị ezi omume n’obodo ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 137:1-3.6 – 8 Az. 3
Azịza: Onyenweanyị, Ị zara m n’ụbọchị m kpọkuru Gị.
1. Onyenweanyị aga m eji obi m niile ekele Gị,
n’ihi na Ị nụla okwu sị m n’ọnụ.
Aga m ekwe ukwe otito Gị n’ihu ndị mmụọma.
Aga m efe Gị n’ụlọ nsọ Gị.
Azịza: Onyenweanyị, Ị zara m n’ụbọchị m kpọkuru Gị.
2. Aga m ekele aha Gị,
n’ihi obi ọma na ezi okwu Gị.
Mgbe m kpọrọ Gị oku, Ị zara m.
Ị gbara m ume.
Azịza: Onyenweanyị, Ị zara m n’ụbọchị m kpọkuru Gị.
3. Onyenweanyị dị n’ebe kacha elu,
ma Ọ na-ahụ ndị e ji n’ala.
Ọ nọ n’ebe dị anya na-ele ndị nganga.
Onyenweanyị, obi ọma Gị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.
A jụkwala ọrụ aka Gị.
Azịza: Onyenweanyị, Ị zara m n’ụbọchị m kpọkuru Gị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:12-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Kolosi
Isi Okwu: O meela ka ụnụ soro Ya bata na ndụ; Ọ gbagharala anyị njọ anyị niile
Mgbe e mere ụnụ mmirichukwu, ọ bụghị naanị na e likọrọ ụnụ na Kristi, kama ụnụ sokwara Ya bilie n’ọnwụ; maka na ụnụ kwere n’ike Chineke, Onye ahụ siri na ndị nwụrụ anwụ kulite.
Ya bụrụgodụ mgbe ahụ ụnụ nwụrụ anwụ n’ime njọ, mgbe ahụ a na-ebibeghị ụnụ ugwu n’anụ ahụ, Chineke nyekọtara ụnụ na Kristi ndụ ọhụrụ. Ọ gbaghaara njọ anyị niile.
Ọ kagburu ụgwọ dịịrị anyị maka iwu dị n’Ọgbụgba Ndụ Ochie nke anyị dara. O hichapụrụ ụgwọ mmehie niile ụnụ ji, ụgwọ iwu ahụ niile ụnụ na-edebeghị. O weere mmehie ndị a niile laa ha n’iyi, site n’ịkpọgide ya n’elu obe Kristi.
MBEKU
Aleluya, aleluya!
Ụnụ anatala mmụọ nke ịbụ ụmụ, nke mere anyị ji etiku Abba, Nna.
Aleluya!
OZIỌMA – 11:1-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Rịọnụ, a ga-enye ya ụnụ
Otu ụbọchị, Jesu nọ n’otu ebe na-ekpe ekpere. Mgbe o kpesịrị ekpere, otu onye n’ime Ụmụazụ Ya wee sị Ya: “Onyenweanyị, kuziere anyị otu e si ekpe ekpere, dịka Jọn, onye ome mmirichukwu si kuziri ndị na-eso ụzọ ya.
Jesu kuziiri ha: “Mgbe ọ bụla ụnụ na-ekpe ekpere, sịnụ: “Nna: Ka otito dịrị aha Gị: Ka alaeze Gị bịa; Nye anyị nri nke ụbọchị anyị n’ụbọchị ọ bụla; Gbaghara anyị mmehie anyị; N’ihi na anyị na-agbaghara ndị mehiere anyị; E kwela ka anyị daba n’ime ọnwụnwa”.
Jesu wee jụọ Ụmụazụ Ya, sị: “Ọ bụrụ na otu onye n’ime ụnụ nwere enyi, wee gakwuru enyi ya n’etiti abalị sị ya: ‘Enyi m, binye m ogbe achịcha atọ. N’ihi na otu enyi m si n’ije pụta n’ụlọ m.
E nweghịkwa m ihe oriri ọ bụla m ga-enye ya!’ Ọ bụrụ na enyi ahụ esi n’ime ụlọ zaa, sị, ‘E sogbula m! A kpọchiela ụzọ; mụ na ụmụ adaala otu nda ụra!
Agaghị m ebiliteli inye gị ihe ọ bụla! “Ana M agwa ụnụ: ọ bụrụgodụ na ọ bilighị nye enyi ya ihe ọ rịọrọ ya n’ihi ihe dị n’agbata enyi na enyi, ọ ga-ebili nye ya ihe ọ rịọrọ ka ọ kwụsị inye ya nsogbu. “Ihe M na-agwa ụnụ bụ: Rịọnụ, ụnụ ga-arịọta, Chọọnụ, ụnụ ga-achọta.
Kụọnụ aka, a ga-emeghere ụnụ ọnụ ụzọ. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọnụ, na-arịọta. Onye ọ bụla na-achọnụ, na-achọta. Onye ọ bụla na-akụ aka, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ. “Ọ dị onye ọ bụla bụ nna n’etiti ụnụ, onye nwa ya ga-arịọ azụ ya enye ya agwọ?
Ma ọ bụ nwa ya arịọ ya akwa ya enye ya akpị? Ọ bụrụ na ụnụ onwe ụnụ, bụ ndị njọ, ma ka e si enye ụmụ ụnụ ihe ọma; ọ bụ na Nna nke eluigwe, agaghị enye ndị na-akpọku Ya Mmụọ Nsọ?”
Igbo Mass Readings for July 28 2025, Mọnde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for July 27 2025, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.