Igbo Mass Readings for August 2 2026, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 2 2026, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 55:1-3
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi okwu: Bịanụ rie nri.
Geenụ ntị, ọ bụ Dinwenụ n’ekwu: ndị niile akpịrị kpọrọ nkụ, bịanụ na mmiri. Ndị niile na-enweghị ego, bịanụ nara nri ọka, rie. Bịanụ ñụọ mmanya na mmiri ara n’akwụghị ụgwọ, n’atụnyeghị ego ọ bụla.
Kedụ ihe ụnụ na-azụfusị ego ụnụ n’ihe na-abụghị nri? Gịnị ka ụnụ na-azụfusị ego ụgwọ ọnwa ụnụ n’ihe na-anaghị eju afọ? Geenụ m ntị nke ọma ka ụnụ wee rijuo afọ.
Ụnụ ga-eji ihe gbara abụbà rijuo afọ. Leruọnụ anya ala bịakwute M. Tọọnụ ntị n’ala ka ụnụ wee nwee ezi ndụ. Mụna ụnụ ga-agba ọgbụgba ndụ ahụ dị ebighị ebi, maka irite uru ahụ dị na nkwa e kwere Devid.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 144:8-9, 15-18. Az. 16
Azịza: Aka nke Onyenweanyị na-azụ anyị. Ọ na-aza anyị oku na mkpa anyị niile.
1. Onyenweanyị bụ Onye amara na onye ebere.
Ọ naghị ewe iwe ọkụ.
Obi ọma Ya ebuka.
Ọ na-emere ihe niile O kere eke ebere.
Azịza: Aka nke Onyenweanyị na-azụ anyị. Ọ na-aza anyị oku na mkpa anyị niile.
2. Anya niile ji nchekwube na-ele Gị;
ka I nye nke ọ bụla nri ya na mgbe Ya.
Ị saghee ọba aka Gị,
ihe niile dị ndụ na-enwe afọ ojuju.
Azịza: Aka nke Onyenweanyị na-azụ anyị. Ọ na-aza anyị oku na mkpa anyị niile.
3. Onyenweanyị kwụbara aka Ya ọtọ n’ụzọ ya niile.
Ọrụ Ya niile dị asọ.
Onyenweanyị nọ nso n’ebe ndị niile na-akpọku Ya nọ;
ndị niile ji ezi okwu na-akpọku ya.
Azịza: Aka nke Onyenweanyị na-azụ anyị. Ọ na-aza anyị oku na mkpa anyị niile.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:35, 37-39
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: O nweghị ihe ọ bụla ekere eke nwere ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke.
Onye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya Kristi? Ọ bụ nsogbu ka ọ bụ ahụhụ; ka ọ bụ mmegbu ka ọ bụ agụụ; ọ bụ ịgba ọtọ ka ọ bụ ize ndụ ka ọ bụ mma agha?
A bịa n’ihe niile ndị a, anyị karịrị dikeọgụ n’ihi Onye ahụ hụrụ anyị n’anya. Maka na o were m anya na, ma ọnwụ ma ndụ, ma ọ bụ ike niile dị n’ụwa, ma ike niile dị n’ala mmụọ; ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ nke ga-adị n’ọdịnihu.
Ma ọ bụ ike mmụọ na mmadụ, ma ọ bụ elu ma ọ bụ ala, ma ọ bụ ihe ọ bụla e kere eke – o nweghị nke ọ bụla nwere ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya ahụ Chineke mere ka o rute anyị aka, site na Jesu Kristi Onyenweanyị.
MBEKU – Ọrụ ndị Ozi 16:14
Aleluya, aleluya!
Ka Nna Onyenweanyị Jesu Kristi meghee anya nke obi anyị. Ka anyị wee hụ ka olile anya nọ n’oku ahụ Ọ kpọrọ anyị si buo ibu.
Aleluya!
OZIỌMA – 14:13-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Mmadụ niile riri rijuo afọ
Mgbe Jesu nụrụ maka ọnwụ Jọn Ome MMmiichukwu, O jiri ụgbọ mmiri gafee ebe mmadụ na-ebighị. Igwe mmadụ ahụ nụrụ ya; ndị si n’obodo dị iche iche weere ụkwụ soro Ya gawa.
Mgbe Ọ pụtara n’ụgbọ mmiri wee hụ oke igwe mmadụ, ebere jupụtara Ya n’obi kpalitere Ya ịgwọ ndị na-arịa ọrịa n’etiti ha. N’oge mgbede, Ụmụazụ Jesu bịakwutere Ya, sị: “Ebe a bụ ọzara mmadụ ọ bụla na-ebighị.
Chi ebidola jiwe. Zilaa igwe mmadụ ndị a, ka ha jee n’ime obodo zụrụ nri ha ga-eri.” Ma Jesu zara ha sị: “Ọ dịghị mkpa ịsị ha laa. Werenụ aka ụnụ nye ha nri ka ha rie.”
Ha wee sị Ya, Ihe anyị nwere ebe a bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ.” Jesu wee sị ha, “Chịtaranụ m ha n’ebe a. O wee nye iwu ka igwe mmadụ niile ahụ nọdụ ala n’elu ahịhịa.
O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ, lee anya n’eluigwe, gọzie ha, nyawaa ha, wee nye Ụmụazụ Ya achịcha ahụ. Ụmụazụ Ya wee keere ha igwe mmadụ ahụ.
Mmadụ niile rie ya wee rijuo afọ. Ha wee tụtụkọọ iberibe achịcha fọdụrụnụ; nkata iri na abụọ wee ju n’ọnụ. Ndị riri achịcha ahụ dị puku mmadụ ise, n’agụnyeghị ụmụ nwanyị na ụmụ ntakịrị.
Igbo Mass Readings for August 3 2026, Mọnde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for August 2 2026, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.