Igbo Mass Readings for August 1 2027, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 1 2027, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:2-4,12-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Isi Okwu: A ga m eme ka nri si n’igwe zooro ụnụ ka mmiri.
Ụmụ Izrel niile bidoro ntamu na-ekwutọ Mosis na Eron na ọzara na-asị: “N’ezie ọ gaara akara anyị mma ma a sị n’anyị nwụnyere n’aka Onyenweanyị mgbe ahụ anyị nọdụrụ ala n’akụkụ ite anụ n’ala Ijipt, bịakwa na-eriju nri afọ.
Ma ụnụ bịara dupụta anyị n’ọzara ebe a ka igwe mmadụ niile a nwụchaa n’agụụ”. Onyenweanyị ewee gwa Mosis: “Ugbu a, aga M eme ka nri si n’igwe zooro ụnụ ka mmiri.
Kwa ụbọchị kwa ụbọchị, ndị mmadụ ga-apụ tụtụkọta nri ga-ezuru ha n’ụbọchị ahụ. Aga M esi n’ụzọ dị otu a lee ha ule iji chọpụta ma ha ga-edebekwa iwu M, ma ọ bụ na ha agaghị edebe ya.
Anụla M ntamu niile a ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị: Na mgbede anyasị ọ bụla, ụnụ ga-eri anụ. Ma n’ụtụtụ ọ bụla, ụnụ ga-erigide nri rijuo afọ. Nke a ka ụnụ ga-eji mara na Mụ onwe M bụ Dinwenụ, bụ Chineke ụnụ.”
N’uhuruchi, ụmụ nnụnụ na-efepụta, kpuchichaa elu ụlọ ndo ha niile. N’ụtụtụ, igirigi na-ejupụta na mbara ọzara niile gbara ụlọ ndo ha gburugburu. Mgbe igirigi ahụ kọrọ n’ala ọzara, ihe dị ka akpụ e bere ebe jupụtara n’ala ahụ niile.
Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị: “Ihe a ọ bụ gịnị?” N’ihi na ha amaghị ihe ọ bụ. Ma Mosis gwara ha sị: “Ihe a bụ nri ahụ Onyenweanyị nyere ụnụ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 77:3-4, 23-25,54 Az. 24
Azịza: Onyenweanyị nyere ha achịcha si n’igwe.
1. Ihe anyị nụrụ, na ihe anyị ma, na ihe nna nna anyị ha gwara anyị, ka anyị ga-ekwupụtara ụmụ ụmụ anyị na-abịanụ.
Anyị ga-akọrọ ha na aka ọrụ Onyenweanyị dị egwu,
kọkwaara ha maka ike Ya na ọrụ ebube Ọ rụrụ.
Azịza: Onyenweanyị nyere ha achịcha si n’igwe.
2. O tiiri mbara igwe iwu,
ọnụ ụzọ eluigwe niile ewee meghee.
Achịcha ha ga-eri wee zooro ha ka mmiri.
O nyere ha nri nke eluigwe.
Azịza: Onyenweanyị nyere ha achịcha si n’igwe.
3. Mmadụ nkịtị riri nri nke ndị mmụọozi.
O ziteere ha nri ha jiri riju afọ nke ọma,
bịakwa kpọbata ha n’ala Ya dị nsọ;
bịakwa kpọbata ha n’elu ugwu nke aka nri ya lụtara n’agha.
Azịza: Onyenweanyị nyere ha achịcha si n’igwe.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:17, 20-24
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs
Isi Okwu: Yikwasị onwe ụnụ oyiyi ọhụrụ Chineke.
E ji m aha Onyenweanyị na-arịọ ụnụ, na-adọkwa ụnụ aka na ntị, ka ụnụ ghara ịdị na-ebi ụdị ndụ aghara ahụ e ji mara ndị ọgọmmụọ, ndị uche ha tọgbọrọ n’efu.
Ama m na ọ bụghị ihe ahụ ka ụnụ mụtara na Kristi, e wepụ ma ọ bụ na ụnụ aghọtaghị Ya nke ọma, mgbe a kuziiri ụnụ nke bụ eziokwu dị n’ime Jesu. Ọ pụtara na ụnụ ga-ahapụ ụdị ndụ ochie ahụ ụnụ na-ebi.
Tụfuonụ onwe ụnụ nke ochie; onwe ụnụ nke ahụ na-adaba n’ureghure na mmerụ site n’ịgbaso agụụ mmehie niile dị n’anụ ahụ. Ụnụ ga-eji mkpalite ọhụrụ nke mmụọ nwọghaa obi ụnụ; ka ụnụ wee yikwasị onwe ụnụ nke ọhụrụ ahụ e kere n’oyiyi Chineke; onwe ụnụ nke ahụ dị n’oyiyi nke ịdịmma na ịdị nsọ nke eziokwu ahụ.
MBEKU – Jọn. 6:63, 68
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA – 6:24-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Agụụ agaghị agụkwa onye ọ bụla bịakwutere m
Ma mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ na Jesu na Ụmụazụ Ya anọghịkwa n’ebe ahụ a mụbaara ha achịcha, ha banyere n’ụgbọ mmiri ndị ahụ, gawa Kapanọm, na-achọ Jesu.
Mgbe ha kufere hụ Jesu n’ofe osimiri, ha sịrị Ya: “Onye nkuzi, olee mgbe Ị bịara ebe a”? Jesu zara ha sị: “N’ịgwa ụnụ eziokwu, ihe ụnụ ji achọ M abụghị na ụnụ hụrụ ihe ịrịba-ama, kama ọ bụ n’ihi na ụnụ ejila achịcha rijuo afọ.
Kwụsịnụ ịrụ ọrụ maka nri nke na-emebi emebi; kama rụwanụ ọrụ inweta nri ahụ na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, nke bụ nri ahụ Nwa nke Mmadụ ga-enye ụnụ. N’ihi na Chineke Nna kara Nwa nke Mmadụ akara ịrịba-ama Ya.”
Mgbe ahụ, ha jụrụ Ya sị: “Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji rụọ ọrụ Chineke?” Jesu wee zaa ha sị: “Lee ihe bụ ịrụ ọrụ Chineke: ikwere n’Onye ahụ O zitere.” Ha jụwa Ya sị: “Olee ọrụ ịrịba-ama Ị ga-arụrụ anyị, ka anyị wee hụ kwere na Gị?
Gịnị ka Ị ga-emere anyị? Nna nna anyị ha riri achịcha ọcha n’ọzara, dịka e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị: ‘O nyere ha nri nke sitere n’eluigwe ka ha rie.” Jesu wee sị ha, “Ana M agwa ụnụ eziokwu: Ọ bụghị Mosis nyere ụnụ nri ahụ sitere n’eluigwe, kama ọ bụ Nna M na-enye ụnụ ezi nri ahụ sitere n’eluigwe.
N’ihi na nri Chineke bụ nke ahụ si n’eluigwe arịdata, wee na-enye ụwa ndụ.” Ha arịọba Ya: “Onyenweanyị, nye anyị ụdị nri a mgbe niile.” Jesu wee sị ha: “Mụ onwe M bụ nri nke ndụ. Onye ọ bụla bịakwutere M, agụụ agaghị agụkwa ya ọzọ. Onye ọ bụla kwere na M, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ.
Igbo Mass Readings for August 2 2027, Mọnde Izuụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for August 1 2027, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.