Igbo Mass Readings for July 2 2028, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 2 2028, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:16, 19-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ Nke Ndị Eze

Isi Okwu: Elisha bilitere sowe Ilaịja

Onyenweanyị gwara Ilaịja sị: “Gaa tee Elisha, nwa Shafat, onye Ebel Mehola, mmanụ, ka ọ bụrụ onye amụma ga-anọchi anya gị”. Ilaịja hapụrụ ebe ahụ bịakwute Elisha nwa Shafat, ebe o ji ehi e kekọrọ abụọ, abụọ, ụzọ iri na abụọ, were na-akọ ubi.

Mgbe ahụ, o so nke iri na abụọ na-aga. Ilaịja abịarute ya nso, were uwe mwụda ya wụkwasị ya n’ubu ya. Elisha hapụrụ ehi ya gbasowe Ilaịja n’azụ. O kwuru sị: “Hapụ m ka m gaa kelee nna m na nne m, e mechaa aga m esoro gị”.

Ilaịja azaa ya: “Gawa! Laghachi azụ! O nwere ihe ọ bụla m mere gị? Elisha laghachiri azụ, gaa were ehi abụọ e kekọrọ ọnụ gbuo. O ji osisi ndị ahụ eji jikọtaa ha kwanye ọkụ o ji sie anụ ha. E mesịa, ọ kpọkọtara ndị mmadụ nye ha anụ ahụ ka ha rie. N’ikpeazụ, Elisha hapụrụ ụlọ ha pụọ, iso Ilaịja ịbụ onye na-enyere ya aka.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 16:1-2.5.7-11

Azịza: Onyenweanyị, Gị bụ oke m

1. Onyenweanyị, chekwaba m; agbabatala m na nchedo Gị.

A gwara m Onyenweanyị, sị: Gị bụ Chukwu m.

Onyenweanyị, Gị bụ oke m na iko m; ọ bụ Gị bụ ụgwọ m.

Azịza: Onyenweanyị, Gị bụ oke m

2. Aga m agọzi Onyenweanyị, onye na-enye m ndụmọdụ;

onye na-eduzi obi m ọ bụladị n’abalị.

Ana m akwụba Onyenweanyị n’ihu m mgbe niile.

Ebe ọ nọ n’aka nri m, aga m akwụdosi ike.

Azịza: Onyenweanyị, Gị bụ oke m

3. N’ihi ya, obi m na-añụrị; mkpụrụobi m na-egorị;

ahụ m ga-eso zuru ike n’udo.

Maka na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m n’etiti ndị nwụrụ anwụ;

ị gaghị ekwe ka onye ị hụrụ n’anya ree ure.

Azịza: Onyenweanyị, Gị bụ oke m

4. Ị ga-egosi m ụzọ ndụ, añụrị zuru oke n’ihu Gị;

n’aka nri Gị, añụrị dị ebighị ebi.

Azịza: Onyenweanyị, Gị bụ oke m

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:1. 13-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshia

Isi Okwu: A kpọrọ ụnụ ka ụnụ bịa nwere onwe ụnụ.

Mgbe Kristi gbapụtara anyị, ebum n’obi Ya bụ, na anyị ga-abụ ndị nwe onwe ha. N’ihi ya, kwụrụnụ chịm. Ụnụ etibakwala onwe ụnụ ọzọ n’agbụ nke ịgba ohu.

Ụmụnna m, dịka ụnụ si mara, oku a kpọrọ ụnụ bụ ka ụnụ nwere onwe ụnụ. Ma hienụ aka n’anya, ka inwere onwe ụnụ nke a, ghara ịbụrụ ụnụ ohere ịdị na-achọ ihe ga-abara sọ anụ ahụ uru.

Kama werenụ ọrụ ịhụnanya, nyewerenụ ibe ụnụ aka; ebe ọ bụ na, otu mkpirisi okwu chịkọtara ihe niile e dere n’iwu bụ: ‘Hụ mmadụ ibe gị n’anya, otu i si hụ onwe gị n’anya.’

Ọ bụrụ na ụnụ na-agagharị na-atagbu ibe ụnụ, na-ebuso ibe ụnụ okwu na ụka, na-adọkasị ibe ụnụ n’ibe, n’ibe; kpacharanụ anya ụnụ! Ma ọ bụghị otu ahụ, lee ka ụnụ na-ala Nzukọ n’iyii. Ka m si otu a kwuo ya: A sị na ọ bụ Mmụọ Nsọ na-edu ụnụ, ụjọ ịdaba n’oke ọchịchọ nke anụ ahụ adịghị.

N’ihi na ihe anụ ahụ ochie anyị chọrọ bụ ime naanị ihe ọjọọ ahụ megidere ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ka anyị mee. Ihe ọma ọ bụla anyị na-eme mgbe Mmụọ Nsọ na-achị ndụ anyị abụghị ihe ndụ anyị chọrọ.

Ọchịchọ nke ndụ anyị na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ anaghị adakọta. Nke a mere o ji bụrụ na ịgba mgba na-adị mgbe niile n’uche anyị, mgbe anyị chọrọ ime ihe ọ bụla, n’ihi na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ na ọchịchọ nke anụ ahụ anyị na-agbalị ịchị mkpebi anyị banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime. Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu ụnụ, ụnụ anọkwaghị n’okpuru iwu.

MBEKU – 1 Sam. 3:9; Jon 6:68

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, kwube! Nwodibo Gị na-ege ntị. Ọ bụ Gị nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.

Aleluya!

OZIỌMA – 9:51 – 62

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Jesu na-eje Jerusalem; aga m eso Gị ebe ọ bụla Ị na-eje.

Oge e ji ewego Ya n’eluigwe na-abịa nso, Jesu wee kachie obi, na-azọ ije n’ụzọ e si aga Jerusalem. O zipụrụ ndị ozi ka ha bute ụzọ. Ndị a pụrụ, banye n’otu obodo Samerịa, maka ịkwado ihe e ji anabata Jesu.

Ma ndị obodo ahụ jụrụ ịnabata Ya, maka na Ọ na-aga Jerusalem. Mgbe Ụmụazụ Ya bụ Jemis na Jọn hụrụ ihe a, ha sịrị: “Onyenweanyị, Ị chọrọ ka anyị kpọtuo ọkụ, ka o si n’eluigwe bịa repịa ha?”

Jesu tụgharịrị bawara ha mba. Ha wee gafee n’obodo ọzọ. Mgbe ha na-aga n’ụzọ, ha zutere otu nwoke sịrị Ya: “Aga m eso Gị ebe ọ bụla Ị na-eje”. Jesu zara ya: “Nkịta ọhịa nwere ime ọnụ ebe ha na-edina; ụmụ nnụnụ nwekwara akwụ ebe ha na-edina.

Ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe Ọ ga-edina zuru ike” Onye nke ọzọ Ọ sịrị ‘Sowe M’, zara Ya: “Ka m buru ụzọ gaa, lie nna m”. Ma Jesu zara ya: “Hapụ ndị nwụrụ anwụ, ka ha lie ndị nwụrụ anwụ.

Ọrụ gị bụ ịga, gbasaa Oziọma nke alaeze Chineke. Onye nke ọzọ sịrị: “Nna anyị ukwu, aga m eso Gị. Ma aga m ebu ụzọ gaa sị ndị ikwu na ibe m nọ n’ụlọ nọdụ mma”. Ma Jesu sịrị ya: “Onye ọ bụla ji ọgụ ya malite ịrụ ọrụ n’ubi, mesịa hapụ ọrụ ọ na-arụ, lewe anya n’azụ, ekwesịghị ịba n’alaeze Chineke.”

Igbo Mass Readings for July 3 2028, Emume nke Tọmọs dị Asọ

Igbo Mass Readings for July 2 2028, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.