Igbo Mass Readings for July 18 2027, Ụka nke Iri na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 18 2027, Ụka nke Iri na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 23:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya

Isi Okwu: A ga m eji aka m kpọkọta igwe atụrụ m fọrọnụ.

Onyenweanyị kwuru sị: “Ahụhụ dịrị ndị nche atụrụ ahụ na-edufu igwe atụrụ M, na-achụsa ha n’ọgbọ atụrụ M. N’ihi ya, lee ihe Onyenweanyị Chineke nke Izrel jiri kwugide ndị nche atụrụ ahụ na-echekwaba ndị nke M bụ Izrel. “Ụnụ achụsaala igwe atụrụ M.

Ụnụ achụfuola ụmụ atụrụ M. Ụnụ elekwaghị ha anya nke ọma. Ma aga M eji aka m taa ụnụ ahụhụ maka agwa ọjọọ ụnụ. Aga M esi n’ala niile M tụsasịrị ha, jiri aka M kpọkọtakwa igwe atụrụ M fọrọnụ, bịakwa kpọghachie ha azụ n’ebe ha na-akpa nri.

Ebe ahụ ka ha ga-anọ amụba mmaji kwuru mmaji. Aga M eji aka M họtara ha ndị nche atụrụ ga-akpachapụrụ ha anya, ka egwu na ịma jijiji gharakwa ịdị ọzọ n’ebe ha nọ.

O nweghịkwa nke ọ bụla n’ime ha ga-efu efu, ọ bụ Onyenweanyị na-ekwu ihe a.’ Onyenweanyị kwuru sị: “Lee anya, oge na-abịa mgbe M ga-eme ka ome osisi ezi omume pulitere Devid.

Dịka eze, Ọ ga-eji ezigbo uche achịkwaba ndị nke M. Ọ ga-akwụba aka ọtọ mee ihe ziri ezi n’ala ahụ. N’oge Ya, a ga-azọpụta Juda. Izrel ebirikwa n’udo. Lee aha ha ga-akpọ Ya: “Onyenweanyị na ezi omume anyị.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 23:1-3, 22 Az. 1

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m, o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

1. Dinwenụ bụ onye nche m, o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

Ebe ahịhịa ndụ juru eju ka Ọ na-enye m ezumike.

Ọ na-eduga m n’agịga mmiri ka m zuru ike,

bịakwa na-agba m ume ka m kute ume ndụ.

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m, o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

2. Ọ na-eduzi m n’ụzọ ziri ezi n’ihi aha Ya.

Ọ bụrụgodụ na m na-aga na ndagwurugwu ọchịchịrị,

egwu ọ bụla agaghị atụ m.

N’ihi na I ji mkpara na ngu Gị nọrọ m n’akụkụ,

iji gbaa m ume.

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m, o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

3. I ji aka Gị kwadoro m oriri nke m ga-eri n’ihu ndị iro m.

I ji aka Gị tee m ude n’isi.

Iko mmanya m ejula n’ọnụ.

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m, o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

4. Sọ ịdịmma na obi ọma Gị ga na-eso m n’ụbọchị ndụ m niile.

Aga m ebi n’ụlọ nke Onyenweanyị ebighị ebi ebighị ebi.

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m, o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:13-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs

Isi Okwu: Kristi mere ka udo dị n’etiti anyị abụọ.

Ma ugbu a, n’ime Krist Jesu ụnụ ndị nọbu n’ebe dị anya na mgbe gara aga ka Chineke wetara nso n’ime ọnwụ Kristi. N’ihi na Kristi n’ọnwụ Ya wetaara anyị udo, site n’ime ka ndị Juu na ndị mba ọzọ bụrụ otu ndị.

N’ọnwụ Ya, O jiri ahụ Ya kwada mgbidi nke nkewa ahụ, nke na-akpa oke na-eweta iro n’etiti ndị Juu na ndị mba ọzọ. O jiri ahụ Ya kagbuo iwu ndị Juu niile, bịakwa mee ka omenala na ụkpụrụ ha ghara ịdị ire; iji were anyị bụ mmadụ abụọ mepụta otu mmadụ ọhụrụ, n’ime onwe Ya.

O mere ka udo dị, site n’ikpezi ihe dị n’agbata anyị abụọ na Chineke n’ime otu ahụ, bịakwa site n’obe Ya gbuo iro ahụ dị n’etiti ndị Juu na ndị mba ọzọ. Kristi bịara, zisaara ụnụ bụ ndị bi na-ebe dị anya na ụnụ bụ ndị nọ nso ozi ọma nke udo. Ọ bụ site na Kristi, ka anyị ji nwee ike isite n’otu Mmụọ Nsọ ahụ rute n’ihu Chukwu Nna.

MBEKU – Jọn 10,27

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: Atụrụ M na-ege ntị n’olu M. Ama M ha. Ha na-esokwa M.

Aleluya!

OZIỌMA – 6:30-34

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Ha dị ka atụrụ na-enweghị onye nche.

Ụmazụ Jesu lọghachiri, wee kọọrọ Ya ihe niile ha mere na ihe niile ha kuziri. O wee sị ha: “Bịanụ n’ebe dara jụụ, ka ụnụ zurutụ ike”. O kwuru nke a n’ihi na ndị mmadụ na-abịa n’igwe n’igwe, na alakwa, nke mere na ha enweghị ohere ọ bụla iri ihe.

Naanị Jesu na Ụmụazụ Ya weere ụgbọ mmiri gawa ebe dara jụụ. Ndị mmadụ hụrụ mgbe ha na-apụ. Ụfọdụ matara ebe ha na-eje. Ndị si n’obodo niile gbara ebe ahụ gburugburu jiri ọsọ na ije buru ha ụzọ rute ebe ha na-aga.

Mgbe Jesu pụtara n’ụgbọ mmiri, Ọ hụrụ nnukwu igwe mmadụ, wee meere ha ebere; maka na ha ghasara ka atụrụ na-enweghị onye nche. O wee malite ikuziri ha ọtụtụ ihe.

Igbo Mass Readings for July 19 2027, Mọnde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for July 18 2027, Ụka nke Iri na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.