Igbo Mass Readings for August 8 2027, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 8 2027, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:4-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ Nke Ndị Eze
Isi Okwu: Agbamume o nwetara na nri ka o jiri gaa ije wee rute n’ugwu nke Chineke.
Ilaija gara ije otu ụbọchị n’ime ọzara wee rute n’okpuru otu oke osisi na-enye ndo. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya wee sị: “Onyenwe m, ike ụwa agwụla m. Bịa wepụ ndụ m n’ihi na akaghị m ndị nna nna m ochie nwụrụ anwụ.
O wee dina ala n’ukwu osisi ahụ, ụra eburu ya. Ma otu mmụọma bịara metee ya, tiere ya iwu ka o bilie rie nri. O wee legharịa anya hụ ogbe achịcha e ghere eghe na otu udu mmiri n’akụkụ ebe o hiliri isi.
Ọ bịa rie nri, nụọkwa mmiri, bịakwa dina ala ọzọ. Ma otu mmụọma Onyenweanyị ahụ bịakwara ọzọ nke ugboro abụọ metụ ya aka sị: “Ngwa kulite rie nri ka njem ghara ịdịrị gị oke ogologo.”
O wee kulite rie nri, nụọkwa mmiri. Agbamume o nwetara na nri ahụ ka o jiri gaa ije iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị wee rute na Horeb bụ ugwu nke Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 33:2-9, Az. 9
Azịza: Detụ Onyenweanyị ọnụ ka ị hụ na Ọ dị ụtọ.
1. Aga m agọzi Onyenweanyị mgbe niile.
Aga m akpụ otito Ya n’ọnụ m.
Ka mkpụrụ obi m tobe Onyenweanyị.
Ndị umeala ga-anụ olu m wee ñụrịa.
Azịza: Detụ Onyenweanyị ọnụ ka ị hụ na Ọ dị ụtọ.
2. Soronụ m too Onyenweanyị.
Ka anyị tikọtanụ ọnụ too aha Ya.
Achọrọ m Onyenweanyị,
O wee zaa m oku.
Ọ bịara wepụrụ m ihe niile na-atụ m egwu.
Azịza: Detụ Onyenweanyị ọnụ ka ị hụ na Ọ dị ụtọ.
3. Legide Ya anya ka añụrị chawapụta gị n’ihu;
ka ihere ghara ikpuchi gị ihu.
Mgbe onye ahụ nọ na nsogbu kpọkuru Onyenweanyị, Ọ zara ya oku.
Ọ zọpụtara ya na mmekpa ahụ ya niile.
Azịza: Detụ Onyenweanyị ọnụ ka ị hụ na Ọ dị ụtọ.
4. Mmụọma nke Onyenweanyị gbara ndị na-asọpụrụ Onyenweanyị gburugburu, iji gbapụta ha.
Detụ Onyenweanyị ọnụ ka ị hụ na Ọ dị ụtọ.
Azịza: Detụ Onyenweanyị ọnụ ka ị hụ na Ọ dị ụtọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:30-5:2
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs
Isi Okwu: Soro nụ Kristi site n’inwe ụdị ịhụnanya o nwere.
Ụnụ emekwela ihe ga-ewute Mmụọ Nsọ Chineke, Onye a kara ụnụ akara Ya, ka ọ bụrụ akara e ji agbapụta ụnụ, mgbe ụbọchị ahụ ruru. Ụnụ eburula ibe ụnụ iwe na ọnụma n’obi.
Ụnụ ewela iwe ọkụ, ma ọ bụ gwa onye ọ bụla okwu n’olu ike. Ụnụ ekwutọkwala onye ọ bụla, ma ọ bụ kwuluo onye ọ bụla n’ụdị ọ bụla. Kama nwerịtanụ ịhụnanya n’etiti onwe ụnụ; na-enwenụ obi ọma na obi nro n’ahụ ibe ụnụ.
Na-agbagharanụ ibe ụnụ, dịka Chineke si gbaghara ụnụ n’ime Kristi. Ebe ụnụ bụ ụmụ Chineke hụrụ n’anya, gbaanụ mbọ iñomi Chineke. Soronụ Kristi site n’inwe ụdị ịhụnanya ahụ Kristi nwere maka ụnụ; ụdị ịhụnanya ahụ kpalitere Kristi iwere onwe Ya tinye n’ọnọdụ anyị, bịa chụnyere Chineke aja nwere isi ọma.
MBEKU – Jọn 14:23
Aleluya, aleluya!
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu M. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Aleluya!
OZIỌMA – 6:41-51
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Abụ m achịcha dị ndụ nke si n’eluigwe gbadata.
Ndị Juu bidoro ịtamu ntamu, n’ihi na Jesu kwuru sị: “Abụ M achịcha ahụ si n’eluigwe gbadata.” Ha jụwa sị: “Onye a, ọ bụghị Jesu, nwa Josef? Ọ bụ na anyị amaghị nna ya na nne ya?
Gịnị mere O ji ekwu ugbu a sị: “E si M n’eluigwe gbadata?” Jesu wee zaa ha sị: “Ngwa, kwụsịnụ ntamu ahụ ụnụ na-atamu. Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike ịbịakwute M karịakwa ma Nna M Onye zitere M, mere ka Ọ bịakwute M.
Aga M ebilite ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpe azụ. E dere ya n’Akwụkwọ ndị amụma sị: “Chineke ga-akuziri ha niile ihe!” Ịnụ ihe Nna kuziri na isi na ya mụrụ akọ bụ ịbịakwute M.
Ọ pụtaghị na e nweela mmadụ nkịtị jirila anya nkịtị hụ Nna, karịakwa Onye ahụ si na Chineke bịa. O jila anya Ya hụ Nna. N’ịgwa ụnụ ezi okwu: Onye ọ bụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi.
Abụ M achịcha nke ndụ. Nna ụnụ ha riri achịcha ọcha (mana) n’ime ọzara. Ma ha anwụọla. Ma nke a bụ achịcha ahụ si n’eluigwe gbadata, nke Ọ ga-abụ, onye rie ya, ọ gaghị anwụ anwụ.
Abụ M achịcha dị ndụ nke si n’eluigwe gbadata. Onye ọbụla riri achịcha nke a ga-adị ndụ ebighị ebi. Achịcha ahụ M ga-enye bụ anụ ahụ M, maka ndụ nke ụwa.”
Igbo Mass Readings for August 9 2027, Mọnde Izuụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for August 8 2027, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.