Igbo Mass Readings for June 14 2026, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 14 2026, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:2-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Isi Okwu: Aga m eji ụnụ eme alaeze ndị Ụkọchukwu na obodo e doro asọ.

Ọbụ Refidim ka ụmụ Izrel si bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha n’ebe ahụ, n’akụkụ ugwu Saịnaị. E mesịa, Mosis rịgooro n’elu ugwu ahụ izute Chineke.

Mgbe ahụ Onyenweanyị sitere n’elu ugwu ahụ kpọọ Mosis oku sị ya, “Iwu ndị a ka ị ga-enye ụlọ Jekọp, gwa ndị Izrel okwu ndị a sị, Ụnụ ahụla ụzọ m siri meso ndị Ijipt, na ụzọ m siri buru ụnụ na nku dị ka ugo, sị otu a dọtara ụnụ onwe m.

N’ihi nke a, ọ bụrụ na ụnụ ga-edebe iwu m, sọpụrụ okwu m, ụnụ ga-abụ ndị e doro iche nye m karịa mba niile nke ụwa. N’ihi na ụwa niile bụ nke m. Ọ bụghị naanị nke a, ụnụ ga-abụkwara m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 99:2-3,5 Az. 3

Azịza: Anyị bụ ndị nke Ya, na atụrụ nke igwe atụrụ Ya.

1. Mba niile, kweerenụ Onyenweanyị ukwe añụrị.

Werenụ obi ọma fee Onyenweanyị.

Werenụ ukwe ọñụ bịa n’ihu Ya.

Azịza: Anyị bụ ndị nke Ya, na atụrụ nke igwe atụrụ Ya.

2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke.

Ọ bụ Ya kere anyị, ọ bụ Ya nwe anyị.

Anyị bụ ndị nke Ya,

bịakwa bụrụ igwe atụrụ Ọ na-azụ.

Azịza: Anyị bụ ndị nke Ya, na atụrụ nke igwe atụrụ Ya.

3. Onyenweanyị dị mma.

Obi ọma ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ na-edebe nkwa O kwere ruo ndụdụgandụ niile.

Azịza: Anyị bụ ndị nke Ya, na atụrụ nke igwe atụrụ Ya.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:6-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Ebe ọ bụ na e ji ọnwụ Nwa Ya kpee udo n’agbata anyị na Ya, o were anya na anyị ga- enwetarịrị nzọpụta site na ndụ nke Nwa Ya.

N’ihi na mgbe anyị nọ n’enweghị ike imere onwe anyị ihe ọ bụla, mgbe oge ahụ Chineke kara aka ruru, Kristi nwụrụ n’ihi ndị njọ. Ọ dịghị nfe ịnwụ n’ihi onye ezi omume.

E leghị anya, mmadụ dị añaa nwere ike ịnwụchitere ezi mmadụ ọnwụ. Ma ihe gosịrị na ịhụnanya Chineke hụrụ anyị pụrụ iche bụ na, Kristi nwụrụ maka anyị, oge anyị bụ ndị njọ.

Ebe ọ bụ na Ọ nwụrụ, iji mee anyị ndị ezi omume; ọ dị gị ka Ọ gaghị enwe ike ugbu a, ịzọpụta anyị n’iwe Chineke? Anyị na Chineke ka nọ n’iro, mgbe e jiri ọnwụ nke Nwa Ya kpezie iro dị n’agbata anyị na Chineke; ugbu a e kpeziri iro dị n’agbata anyị na Ya, ọ bụ na ọ bụghị ihe were anya n’ezie, na a ga-azọpụtarịrị anyị site na ndụ nke Nwa Ya?

Ọ bụghị naanị na e kpeela udo n’agbata anyị na Ya, ọ bụ n’ihi na anyị jupụtara n’añụrị ntụkwasa obi na Chineke, site na Jesu Kristi; Onye e sitere na Ya kpeziere anyị na Chineke.

MBEKU – Jọn. 10:27

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Atụrụ M na-ege ntị n’olu M. Ama m ha. Ha na-esokwa M.

Aleluya!

OZIOMA – 9:36-10:8

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ọ kpọrọ Ụmụazụ Ya iri na abụọ wee zipụ ha.

Mgbe Jesu hụrụ igwe mmadụ ahụ, o nwere ọmịko n’ahụ ha, n’ihi na ha bụ ndị a na-esogbu, ndị na-enweghị onye inyeaka, ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.

O wee gwa Ụmụazụ Ya: “Ihe mịrị n’ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị sọ olemole. N’ihi ya, rịọnụ Onyenwe ihe mịrị n’ubi, ka O ziga ndị ọrụ n’ubi Ya.” Ọ kpọrọ Ụmụazụ Ya iri na abụọ, wee nye ha ike kariri nke ajọ mmụọ, na ike ịchụpụ ajọ mmụọ, na ịgwọ ụdị ọrịa niile, na nrịanrịa dị iche iche.

Lee aha Ụmụazụ iri na abụọ ahụ: onye mbụ bụ, Saịmọn, onye a na-akpọ Pita, na nwanne ya Andru; Jemis, nwa Zebedi, na nwanne ya Jọn; Filip na Batalomi; Tọmọs na Matiu, onye ọna-ụtụ; Jemis nwa Alfiọs, na Tadịos; Saịmọn nke Zilọt, na Judas Iskarịọt, onye raara Jesu nye n’aka ndị gburu ya.

Jesu zipụrụ Ụmụazụ iri na abụọ ndị a, bịakwa dụọ ha ọdụ, sị: “Ụnụ azọbakwala ụkwụ n’ala ndị ọgọmmụọ. Ụnụ abanyekwala n’obodo ndị Sameria. Kama jekwurunụ atụrụ furu efu n’Ụlọ Izrel.

Mgbe ụnụ na-aga, na-ekwupụtanụ na alaeze eluigwe abịala nso. Gwọọnụ ndị ọrịa; kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ; meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụnụ ajọ mmụọ. Ụnụ natara ihe n’akwụghị ụgwọ, nyenụ ya ndị mmadụ n’anaghị ha ego.

Igbo Mass Readings for June 15 2026, Mọnde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for June 14 2026, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.