Igbo Mass Readings for June 13 2027, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 13 2027, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:22-24
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Izikel
Isi Okwu: A na m ewelite osisi nta elu
Lee ihe Onyenweanyị Chineke kwuru: Site n’elu osisi seda, aga M esi n’ebe kacha elu na ngalaba ya gbajiri ome ya. Aga M eji aka M kụnye ome osisi ahụ na nnukwu ugwu dị oke elu.
Aga M akụnye ya n’ugwu dị elu nke Izrel. Ọ ga-epupụta ngalaba, bịakwa mịa mkpụrụ: bịakwa ghọọ osisi seda dị ebube. Ụdị nnụnụ niile ga-ebi n’okpuru ya.
Anụ ufe niile ga-ebi na ndo ngalaba ya. Osisi niile nọ n’ọhịa ga-amata na Mụ onwe M bụ Dinwenụ, na-ewedata osisi ukwu ala, bịakwa na- ewelite osisi nta elu; ma ọ bụ M na-eme ka osisi dị ndụ kpọọ nkụ, bịakwa na-eme ka osisi kpọrọ nkụ jupụta na ndụ. Mụ onwe M bụ Dinwenụ ekwuola ya. Aga M eme ya!
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 91:2-3, 13-16 Az. 2
Azịza: Onyenweanyị, ọ dị mma inye Gị ekele.
1. Ọ dị mma inye Onyenweanyị ekele;
ya na ikwere Gị bụ Onye Kacha Elu ukwe otito.
Bịakwa na-ekwupụta obi ọma Gị n’ụzọ ụtụtụ,
bido kwa n’abalị na-ekwupụta ịdị mma Gị ruo na chi ọbụbọ.
Azịza: Onyenweanyị, ọ dị mma inye Gị ekele.
2. Onye ezi omume ga-eto ogologo maa mma dịka nkwụ.
Ọ ga-etowapụ dịka osisi seda nke Lebanọn.
Ndị a kụrụ n’ụlọ nke Onyenweanyị ga-eto ogologo,
maa mma n’ogige nke Chineke anyị.
Azịza: Onyenweanyị, ọ dị mma inye Gị ekele.
3. Ha ga-amịgide mkpụrụ mee agadi;
bịakwa jupụta na ndụ gbasiekwa ike;
na-ekwupụta ka Onyenweanyị si kwụba aka ọtọ.
Nkume m, onye na-ebughị ọrụ ọ bụla.
Azịza: Onyenweanyị, ọ dị mma inye Gị ekele.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:6-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Ma anyị nọ n’eluigwe, ma anyị nọ n’ụwa a, uche anyị bụ ime ihe ga-adị ya ụtọ.
Anyị jupụtara n’obisike mgbe niile. Mgbe ọ bụla anyị chetara na ibi ndụ n’anụ ahụ bụ, isi na be Onyenweanyị kwapụ, gbalaa n’obodo ọzọ. Ọ bụrụ na anyị jiri okwukwe biri, n’agbanyeghị ihe anya hụrụ, ekwuru m na anyị jupụtara n’obisike, nke na, n’ezie, anyị chọrọ ịkwapụ n’anụ ahụ, bịakwa kwaba n’ụlọ anyị, nke dị na be Onyenweanyị.
Ma anyị bi n’anụ ahụ, ma anyị kwapụrụ n’anụ ahụ, ihe anyị bu n’obi bụ, ime ihe na-amasị Ya. Maka na a ga-agba eziokwu niile banyere anyị n’anwụ, n’ụlọ ikpe nke Kristi. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-erite ụgwọ kwesịrị ya, maka ihe niile o mere n’anụ ahụ ma ha bụ nke ọma, ma ha bụ nke ọjọọ.
MBEKU – Jọn. 15:15
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: “Ana M akpọ ụnụ ndị enyi M, n’ihi na emeela M ka ụnụ mata ihe niile Nna gwara M.”
Aleluya!
OZIỌMA – 4:26-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Ọ bụ mkpụrụ kacha ibe ya ntakịrị na mkpụrụ osisi niile a kụrụ n’ala.
Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị: “Lee ihe alaeze Chineke dị ka ya. Otu nwoke ghara mkpụrụ n’ubi ya. Ma n’abalị, ma n’ehihie; ma mgbe ọ nọ n’ụra, ma mgbe ọ mụ anya, mkpụrụ ahụ na-epulite, na-eto.
Otu o si eto, nwoke ahụ amaghị! Ala ji aka ya na-eme ka mkpụrụ buru ụzọ pupụta ome; bịakwa mepụta okooko; bịakwa mịta mkpụrụ kara aka n’ime okooko.
Mgbe ihe a kọrọ n’ubi chara ọ naghị atụfu oge, o bido iwe ihe ubi, n’ihi na oge ya eruola. Ọ bịakwara sị: “Olee ihe anyị ga-asị na alaeze Chineke dị ka ya?
Gịnị ka anyị ga-eji tụnyere ya? Ọ dị ka mkpụrụ mọstad, nke bụ mkpụrụ kacha ibe ya ntakịrị, na mkpụrụ osisi niile a kụrụ n’ala. Ma mgbe a kụsịrị ya, o too, bụrụ osisi kacha ibe ya ibu n’ime ha niile.
Ọ na-etopụta buo ibu nwee ngalaba dị ogologo nke na ụmụ nnụnụ na-efe n’elu nweziri ike wuo akwụ n’okpuru ya”. O jikwara ọtụtụ ilu dị otu a, gwa ha okwu ha nwere ike ịghọta. Sọ n’ilu, n’ilu, ka ọ na-agwa ha okwu. Ma mgbe naanị Ya na Ụmụazụ Ya nọ, Ọ na-akọwara ha ihe niile.
Igbo Mass Readings for June 14 2027, Mọnde Izuụka nke Iri na Otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for June 13 2027, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.