Igbo Mass Readings for Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:17-24
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ Nke Ndị Eze
Isi Okwu: Lee, nwa gị dị ndụ
Nwa nwoke nwanyị nwe ụlọ dara n’ọrịa: Ọrịa ahụ bịara karịa nke na ume kupuru ya. Nne ya gakwuuru Ilaija sị ya: “Onye nke Chineke, kedụ esemokwu dị n’etiti mụ na gị?
Ị bịara ebe a ka ị bulatara m njọ m n’ụlọ bịakwa gbuo nwa m”? Ilaija were gwa ya sị: “Kunye m nwa gị”. O kuuru nwa ahụ n’apata ụkwụ nne ya, kuru ya rịgoro n’ụlọ elu ebe ya onwe ya na-arahụ, wee nyibe ya n’elu akwa ya.
Ọ kpọkuru Chineke sị: “Osebụrụwa Chineke m, ọ bụ nwanyị isimkpe a na-elekọta m ka I wetaara iwe na ọnụma site n’igbu nwa ya nwoke? O wee gbatịa onwe ya ugboro atọ n’elu nwata ahụ, kpọkuo Osebụrụwa sị: “Osebụrụwa Chineke m, ana m arịọ Gị, biko were ume ndụ nyeghachi nwatakịrị a.”
Onyenweanyị nụrụ ekpere Ilaija, werekwa weghachiere nwa ahụ ume ndụ. Ilaija si n’ụlọ elu kpọdata ya bụ nwata kunye ya nne ya sị: “Lekwa nwa gị! Ọ dị ndụ!” Nwanyị ahụ gwara ya sị: “N’eziokwu, ugbu a ka o doro m anya na ị bụ onye nke Chineke. Okwu Chineke si n’ọnụ gị na-apụta n’ezie.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 29:2.4-6. 11-13. Az. 2
Azịza: Onyenweanyị, aga m eto Gị, n’ihi na Ị zọpụtala m.
1. Onyenweanyị, aga m enye Gị nnukwu otito n’ihi na Ị dọpụtara m nke ọma.
I kweghị ka ndị iro chị a m ọchị.
Onyenweanyị, ọ bụ n’ala mmụọ ka I si kpọpụta m;
bịakwa chekwaba m ka m ghara ịdị ka ndị e liri n’aja.
Azịza: Onyenweanyị, aga m eto Gị, n’ihi na Ị zọpụtala m.
2. Ụnụ bụ ndị kwerenụ, kweerenụ Onyenweanyị ukwe otito.
Nyenụ aha nsọ Ya ekele.
N’ihi na iwe Ya na-abụ sọ otu ntabi anya.
Ma obi ọma Ya na-esi na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
N’anyasị, ịkwa akwa ga-abata. Ma ọñụ ga-adị na chi ọbụbọ.
Azịza: Onyenweanyị, aga m eto Gị, n’ihi na Ị zọpụtala m.
3. Biko Onyenweanyị, nụrụ olu m, nwee ọmịko n’ebe m nọ.
Biko Onyenweanyị, bụrụ onye enyemaka m.
Ị gbanwoola iru ụjụ m ka ọ ghọọ ịgba egwu.
Biko Onyenwe m na Chineke m, aga m enye Gị ekele mgbe ebighị ebi.
Azịza: Onyenweanyị, aga m eto Gị, n’ihi na Ị zọpụtala m.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:11-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshia.
Isi Okwu: Chineke ziri m ozi Nwa Ya ka m were kwusaa Oziọma Ya n’ebe ndị na-amaghị Chineke nọ.
Ụmụnna m! Ana m agwa ụnụ na Oziọma nke m na-ekwusa abụghị nke mmadụ nkịtị chepụtara. Anataghị m ya mmadụ ọ bụla. O nweghị mmadụ ọ bụla kuziiri m ya.
Kama o sitere na mkpughe nke Jesu Kristi rute m aka. Eji m aka na ụnụ anụla akụkọ maka otu m si bie ndụ n’oge gara aga n’usoro okpukpe ndị Juu; ka m si nye Nzukọ Chineke oke nsogbu nke na ebere ọ bụla adịghị m n’obi na mbọ niile m gbara n’ịla Nzukọ Chineke n’iyii.
Agara m n’ihu n’usoro okpukpe nke ndị Juu karịa ndị ọgbọ m niile dị n’ala anyị. Idebe omenala nna nna anyị ha nụkwara m ọkụ n’obi karịa. Ma Chineke, Onye ahụ họọrọ m site n’afọ nne m, sitere n’amara Ya kpọọ m oku, bịakwa họrọ igosi m Nwa Ya, ka m kwusaara ndị mba ọzọ Oziọma nke Nwa Ya ahụ.
O nweghị onye ọ bụla m jekwuru maka ndụmọdụ. Agaghịkwa m Jerusalem ịhụ ndị buru m ụzọ bụrụ Ụmụazụ. Kama, ebiliri m ngwa ngwa gaa Arebia. E mesịa, esikwara m ebe ahụ laghachi azụ na Damaskọs.
Ọ bụ ezie na mgbe afọ atọ gasịrị, ejere m Jerusalem ịhụ Sefas. Mụ na ya nọrọ abalị iri na ise. Ma ọ dịghịkwa onye ọ bụla ọzọ n’ime ndị Ụmụazụ m hụrụ karịakwa Jemis, nwanne nke Onyenweanyị.
MBEKU- Luk. 7:16
Aleluya, aleluya!
Nnukwu onye amụma ebilitela n’etiti anyị; Chineke abịala leta ndị nke Ya.
Aleluya!
OZIỌMA – 7:11-17
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Nwokorobịa, agwa M gị, Bilie!
Jesu gara n’obodo na-akpọ Nein. Ụmụazụ Ya na oke igwe mmadụ so Ya gaa. Ma mgbe ha na-abịarute n’ọnụ ụzọ ama obodo ahụ, e bu ozu nwokorobịa na-aga ili.
Nwokorobịa ahụ nwụrụ anwụ bụ sọ otu nwa nne ya mụtara; nne ya bụ nwanyị di ya nwụrụ anwụ. Oke igwe mmadụ ndị obodo ahụ sokwa nwanyị ahụ na-aga. Mgbe Onyenweanyị hụrụ nwanyị ahụ, O nwere ọmịko n’ahụ ya, jekwuru ya, gwa ya okwu sị, “Nne, akwala akwa ọzọ.” Mgbe ahụ Jesu gara nso metụ igbe ozu ahụ aka.
Ndị bu ya kwụsịrị. O wee sị: “Nwokorobịa, asị M gị, bilie”, Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu. Jesu kpọọrọ ya nye nne ya. Egwu jidere ha niile, ha wee malite inye Chineke otito, na-asị: “Nnukwu onye amụma ebilitela n’ala anyị.
Chineke abịala ileta ndị nke Ya.” Ihe a bụ akụkọ a na-akọ maka Ya; akụkọ nke gbasara na Judia niile na obodo niile gbara ya gburugburu.
Igbo Mass Readings for Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.