Igbo Mass Readings for May 3 2026, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 3 2026, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: Ha họpụtara ụmụ okorobịa asaa juputara na Mmụọ Nsọ.
Mgbe ụbọchị na-aga, ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jesu wee na-abawanye ụba. Esemokwu wee dapụta: Ndị Juu ndị a mụrụ na mba, ndị na-asụ asụsụ Grik, tamuru ntamu megide ndị Juu ndị a mụrụ n’ụlọ, ndị na-asụ asụsụ Hibru.
Iwe ndị Juu ndị na-asụ Grik bụ na e lefuru ụmụ nwanyị ha di ha nwụrụ anwụ anya, mgbe a na-ekesa ego ma ọ bụ ihe oriri kwa ụbọchị n’ọgbakọ ndị otu Kristi.
Ụmụazụ iri na abụọ ahụ wee kpọọ ọgbakọ nke ndị na-eso ụzọ Jesu, wee gwa ha, sị: “O zighị ezi na anyị ga-akwụsị ikwusa okwu Chineke, na-ekwu naanị maka ihe afọ ga-eri!
Ụmụnna n’ime Kristi, n’ihi nke a, họpụtanụ n’etiti ụnụ ụmụ nwoke asaa, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị juputara na Mmụọ Nsọ na amamihe, ndị anyị ga-etinye ọrụ a dị mkpa n’aka.
Anyị onwe anyị ga-anọgidesi ike n’ekpere, na ije ozi nke ikwusa okwu Chineke. Ndị otu Kristi nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha wee họpụta Stivin, bụ nwoke tozuru etozu n’okwukwe, bịakwa juputa na Mmụọ Nsọ.
Ha họpụtakwara Filip, na Prokorọs, na Nikanọ, na Timọn, na Pamenas, na Nikọlas, bụ onye mba ọzọ a kpọbatara n’okpukpe ndị Juu, onye si n’obodo Antiọk.
Ọgbakọ ahụ wee chee mmadụ asaa ndị a n’ihu Ụmụazụ. Ụmụazụ kpeere ha ekpere, bikwasị ha aka n’isi. Okwu Chineke wee na-aga n’ihu. Ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jesu wee na-abawanye hie nne na Jerusalem. Ọtụtụ ndị nchụaja nabatakwara okwukwe nke ndị otu Kristi.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 32:1-2, 4-5, 18-19 Az. 22
Azịza: Biko Onyenweanyị, ka ịhụnanya Gị dakwasa anyị, ebe anyị tụkwasara nchekwube anyị niile na Gị. Ma ọ bụ Aleluya
1. Ụnụ bụ ndị ezi omume, tierenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,
n’ihi na otito bụ ihe kwesịrị ekwesị n’ebe obi ndị umeala nọ.
Werenụ ụbọ akwara kelee Onyenweanyị.
Werenụ une bụọrọ Ya abụ.
Azịza: Biko Onyenweanyị, ka ịhụnanya Gị dakwasa anyị, ebe anyị tụkwasara nchekwube anyị niile na Gị. Ma ọ bụ Aleluya
2. N’ihi na okwu Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasa obi.
Ọrụ Ya bụ ihe a na-atụkwasa obi.
Onyenweanyị hụrụ ezi omume na ikpe-nkwụmọtọ n’anya.
O mere ka ụwa jupụta n’ịhụnanya.
Azịza: Biko Onyenweanyị, ka ịhụnanya Gị dakwasa anyị, ebe anyị tụkwasara nchekwube anyị niile na Gị. Ma ọ bụ Aleluya
3. Anya Onyenweanyị dị n’ebe ndị na-asọpụrụ Ya;
Ọ na-ele ndị na-eche ịhụnanya Ya;
ka O wee zọpụta ha n’ọnwụ,
bịakwa debe ha ndụ na n’oge ụkọ nri.
Azịza: Biko Onyenweanyị, ka ịhụnanya Gị dakwasa anyị, ebe anyị tụkwasara nchekwube anyị niile na Gị. Ma ọ bụ Aleluya
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:4-9
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Mbụ Pita dị asọ dere
Isi Okwu: “Ụnụ bụ agbụrụ a họtara ahọta, ndị nchụaja nọ n’ọkwa eze.
Bịakwutenụ Onyenweanyị, bụ nkume ahụ dị ndụ, nke ndị mmadụ jụrụ ajụ; ma Chineke họọrọ Ya gụnye Ya n’ihe dara oke ọnụ n’ihu Chineke. Bịakwutenụ Chineke ka e were ụnụ, dịka nkume dị ndụ, wee wuo ụlọ nke Mmụọ Nsọ, ebe ụnụ ga-abụ agbụrụ ndị nchụaja dị nsọ, na ndị na-achụ aja mmụọ ahụ na-adị Chineke ezi mma, site na Jesu Kristi. N’ihi na Akwụkwọ Nsọ kwuru sị:
“Lee ka M na-atọgbọ nkume dara oke ọnụ, nke M họọrọ na Zayọn. Onye ọ bụla kwere na Ya agaghị enwe ihe mwute ma ọlị.” Ihe ọ pụtara bụ na, ebe ụnụ ndị kwere ekwe nọ, nkume ahụ dị oke ọnụ, ma ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, ọ bụ:
“Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume kachasị mkpa n’ụlọ ahụ ugbu a.” Ekwukwara n’ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ, sị:
“Ọ bụ nkume nke na-eme ka ndị na-ekweghị ekwe sụọ ngọngọ, maa n’ọnya, bụrụkwa nkume ga-eme ka ha daa.”
Ọ ga-eme ka ha daa n’ihi na ha ekwenyeghị n’okwu ahụ a gwara ha. Ha mekwara otu Chineke kara aka na ha ga-eme.
Ma ụnụ onwe ụnụ bụ ebo Chineke họpụtara, otu ndị nchụaja nọ n’ọkwa eze, mba dị nsọ, na ndị Chineke nwe. Ụnụ onwe ụnụ bụ ndị a họpụtara ka ụnụ na-ekwusa aka ọrụ nke Chineke, onye siri n’ọchịchịrị kpọbata ụnụ n’ihe Ya dị ebube.
MBEKU – Jọn. 14:6
Aleluya, aleluya!
Jesu kwuru sị: “Abụ M Ụzọ, Eziokwu na Ndụ. O nweghị onye ọ bụla nwere ike ịbịakwute Nna, ma ọ bụghị site n’aka M.
Aleluya!
OZIỌMA – 14:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Abụ M Ụzọ, Eziokwu na Ndụ
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Ka obi ghara ịlọ ụnụ mmiri. Kwerenụ na Chineke. Kwerekwanụ na M. N’ụlọ Nna M, e nwere ọtụtụ ụlọ obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara M agwa ụnụ. Kama ana M aga idoziri ụnụ ha.
Ọ bụrụ na M ejee dozichaara ụnụ ebe obibi, aga M alaghachi ịkpọrọ ụnụ ka Mụ na ụnụ nọdụ. Ụnụ maara nke ọma ebe m na-aga.” Ma Tọmọs sịrị Ya: “Onyenweanyị, anyị amaghị ebe Ị na-aga.
Olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ahụ?” Jesu zara ya sị: “Mụ onwe M bụ ụzọ, na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna M ma ọ bụghị site na M.
A sị na ụnụ maara M, ụnụ ga-amatakwa Nna M. Site ugbu a, ụnụ amatala Ya, ụnụ ahụkwala Ya.” Filip wee sị Ya: “Onyenweanyị, ọ bụrụ na I zi anyị Nna, anyị ga-enwe afọ ojuju.”
Jesu wee sị ya: “Filip! Mụ na gị anọọla ogologo oge dị otu a ma ị matabeghị onye M bụ? Onye hụrụ M anya ahụla Nna M. Gịnị mere i ji na-asị m: ‘Zi anyị Nna.’
I kweghị na anọ M n’ime Nna M, na Nna M nọkwa n’ime M? Okwu M na-agwa ụnụ abụghị site n’ike aka M. Kama Nna M nọ n’ime M na-arụ ọrụ Ya. Kwerenụ ihe M kwuru na anọ M n’ime Nna M; na Nna M nọkwa n’ime M.
Ọ bụrụ na enweghị ihe ọzọ kpatara ụnụ ji ekwere, kwerenụ ihe M na-ekwu n’ihi ọrụ ebube ndị a M na-arụ. N’ịgwa ụnụ eziokwu: Onye ọ bụla kwere na M, ga-enwe ike rụọ ọrụ ndị a niile M na-arụ. Ọ ga-arụkwa ọrụ kariri ndị a, n’ihi na ana M alakwuru Nna M.
Igbo Mass Readings for May 4 2026, Mọnde Izuụka nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi
Igbo Mass Readings for May 3 2026, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.