Igbo Mass Readings for April 25 2027, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 25 2027, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:26-31
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: “Banabas kọwara ka Onyenweanyị si zute Sọl n’ụzọ.”
Sọl wee gaa Jerusalem, chọọ ụzọ isonyere ndị na-eso ụzọ Jesu, ma ha niile tụrụ oke egwu mgbe ha hụrụ ya. N’ihi na ha ekwetaghị na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jesu n’eziokwu.
Ma Banabas kpọọrọ ya, duru ya jekwuru ndị ozi, kọọrọ ha otu Sọl si hụ Onyenweanyị n’ụzọ, kọkwaara ha na Ọ gwala ya okwu. Ọ kọkwaara ha otu Sọl si zisaa Oziọma n’aha Jesu na Damaskọs, n’asọghị onye ọ bụla anya.
N’ihi nke a, ha wee nabata Sọl, ya na ha wee nọdụ. O wee gagharịa ebe dị iche iche na Jerusalem, na-ezisa Oziọma n’aha Onyenweanyị, n’atụghị egwu.
Ọ gwakwara ndị Juu ndị na-asụ asụsụ Grik okwuchukwu, ha na ya rụrịtara ụka. Ma ha gbasiri izu ike igbu ya. Mgbe ndị otu Kristi chọpụtara nzube ha, ha mere ngwangwa duru Sọl duruo Sizarịa, wee zilaa ya obodo ya bụ Tasọs.
Nzukọ Kristi dị n’ala Judia na Galili, na Sameria niile nwere udo. Ọ bịakwara na-eto n’okwukwe; na-ebi ndụ n’ịtụ egwu nke Onyenweanyị, bịakwa na-enweta ntasiobi nke Mmụọ Nsọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 21:26-28, 30-32. Az. 26
Azịza: Onyenweanyị, ọ bụ Gị bụ otito m n’ime Nzukọ Gị. Ma ọ bụ Aleluya
1. Aga m akwụghachi ihe m kwere na nkwa n’ihu ndị na-asọpụrụ Gị.
Ụmụ ogbenye ga-erigide nri wee rijuo afọ.
Ndị na-achọ Onyenweanyị ga-eto Ya.
Obi ha ga-adịgidekwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Azịza: Onyenweanyị, ọ bụ Gị bụ otito m n’ime Nzukọ Gị. Ma ọ bụ Aleluya
2. Ụwa niile ga-echeta Onyenweanyị,
bịakwa laghachikwuru Ya.
Ezi na ụlọ niile nọ na mba niile ga-efe Ya.
Ndị niile ji ike ọchịchị n’ụwa niile ga-egburu Ya ikpere n’ala.
Ndị niile na-arịda n’aja ga-akpọrọ Ya isi ala.
Azịza: Onyenweanyị, ọ bụ Gị bụ otito m n’ime Nzukọ Gị. Ma ọ bụ Aleluya
3. Obi m ga-adị ndụ maka Ya.
Ụmụ m ga-efe Ya.
Ha ga-akọrọ ndụdụgandụ na-abịanụ akụkọ banyere Onyenweanyị.
Ha ga-akọrọ ndị a na-amụbeghị amụ ka Onyenweanyị si kwesị ntụkwasa obi,
wee sị: ‘Ọ bụ Onyenweanyị mere ihe niile ndị a.’
Azịza: Onyenweanyị, ọ bụ Gị bụ otito m n’ime Nzukọ Gị. Ma ọ bụ Aleluya
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:18-24
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ nke Jọn dị asọ dere
Isi Okwu: Iwu O nyere anyị bụ: I kwere na Nwa Ya na ịhụ ibe anyị n’anya.
Ụmụ m! Ụnụ ekwela ka ihụnanya anyị bụrụ naanị n’okwu ọnụ, ma ọ bụ n’egbugbere ọnụ. Kama ka anyị na-egosi ya site n’okwu ọnụ anyị na omume anyị.
Site n’ụzọ dị otu a, anyị ga-amata na anyị bụ ndị otu eziokwu ahụ. Mgbe ahụ kwa akọnuche anyị agaghị ama anyị ikpe, ọ bụladị ma anyị guzoro n’ihu Chineke.
Ọ bụrụkwa na akọnuche anyị ama anyị ikpe, anyị, ga-amata na Chineke kariri akọnuche anyị; na Ọ mazuru ihe niile. Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na akọnuche anyị adịghị ama anyị ikpe, anyị ga-enwe ntụkwasị obi iguzo n’ihu Chineke.
Anyị ga-anatakwa n’aka Chineke ihe ọ bụla anyị na-arịọ, n’ihi na anyị na-edebe Iwu Ya, na-emekwa ihe na-atọ Ya ụtọ. Nke a bụkwa ihe ahụ Chineke nyere n’Iwu: Ka anyị kwere n’aha Nwa Ya, Jesu Kristi; ka anyị hụrịtakwa ibe anyị n’anya dịka Kristi nyere anyị n’Iwu.
Onye na-edebezu Iwu Chineke na-anọgide n’ime Chineke. Chineke na-anọgidekwa n’ime ya. Anyị na-amata na Chineke bi n’ime anyị site na Mmụọ Nsọ ahụ O nyere anyị.
MBEKU – Jọn.15:4-5
Aleluya, Aleluya!
Birinụ n’ime M, otu M si biri n’ime ụnụ. Onye ọ bụla nọ n’ime M ga-amịta mkpụrụ n’uju.
Aleluya!
OZIỌMA – 15:1-8
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Onye ọ bụla bi n’ime M, M biri n’ime ya, ga-amịta ọtụtụ mkpụrụ.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya: Abụ M ezi osisi vaịnị. Nna M bụkwa onye ọrụ ubi. Ngalaba ọ bụla n’ime M nke na-adịghị amị mkpụrụ, Ọ na-egbupụ ya. Ma Ọ na-akwacha ngalaba ọ bụla na-amị mkpụrụ, ka o wee mịkwuo mkpụrụ karịa.
Ugbu a, ụnụ dị ọcha n’ihi okwu niile M gwara ụnụ. Birikwenụ n’ime M, dịka M si biri n’ime ụnụ. N’ihi na dịka ngalaba na-apụghị ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị n’ogwe osisi, otu ahụ kwa ka ụnụ na-apụghị ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na ụnụ anọgideghị n’ime M.
“Mụ onwe M bụ osisi vaịnị. Ma ụnụ bụ ngalaba nke M. Onye ọ bụla nke na-anọgide n’ime M, ma Mụ onwe M kwa n’ime ya, ga-amịta ọtụtụ mkpụrụ. N’ihi na e wezuga M, ụnụ apụghị ime ihe ọ bụla. Onye ọ bụla na-ebinyeghị n’ime M, a ga-egburu ya tụpụ, dịka ngalaba; ka ọ kpọnwụọ, ndị mmadụ a chịkọta ya, tụnye n’ọkụ, o wee repịa.
Ma ọ bụrụ na ụnụ ebiri n’ime M, ọ bụrụkwa na okwu M ebiri n’ime ụnụ, rịọnụ ihe ọ bụla ụnụ chọrọ, a ga-emekwara ya ụnụ. Site n’ịmị ọtụtụ mkpụrụ ka ụnụ ga-esi enye Nna M otito. Sitekwa n’ime otu a, ụnụ ga-abụ ndị na-eso ụzọ M n’eziokwu.
Igbo Mass Readings for April 26 2027, Mọnde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Igbo Mass Readings for April 25 2027, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.