Igbo Mass Readings for May 18 2025, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 18 2025, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:21-27
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: Ọ kọọrọla Nzukọ akụkọ ihe niile Chineke ji ha mee.
Pọl na Banabas wee zisaa Oziọma na Debe, wee mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jesu. E mesịa, ha wee laghachi na Listra, na Ikoniọm, na Antiọk nke Pisidia.
Ma ha mere ka obi ndị na-eso ụzọ Jesu nọ n’obodo ndị a sie ike bịakwa dụọ ha ọdụ ka ha kwụrụ chịm n’okwukwe. Ha gbakwara ha ume, na anyị ga-ahụrịrị ọtụtụ ahụhụ tupu anyị abanye n’alaeze Chineke.
N’ime nzukọ Kristi ọ bụla ndị ozi ahụ ruru, ha họpụtara ndị okenye, bịakwa were ekpere na ibu-ọnụ tinye ha n’aka Onyenweanyị, bụ onye ha kweere na Ya.
Mgbe Pọl na Banabas gafesịrị ala Pisidia, ha bịaruru ala Pamfilia. Ha wee zisaa Oziọma na Pega, si n’ebe ahụ garuo Atalia. Ha wee si n’ebe ahụ gbara ụgbọ mmiri ruo Antiọk nke Siria, ebe e jiri ekpere na abụ hanye ha na nlekọta na amara nke Chineke, maka ọrụ izisa Oziọma nke a ha rụzurula ugbu a.
Mgbe ha laruru na Antiọk nke Siria, ha mere ka Nzukọ Kristi zukọta. Ha wee kọọrọ ha ihe niile Chineke jiri ha rụọ, na otu O si megheere ndị mba ọzọ ọnụ-ụzọ nke okwukwe.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 144:8-13, Az. 1
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m eto aha Gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma ọ bụ Aleluya
1. Onyenweanyị bụ onye amara, jupụtakwa n’ebere.
Ọ naghị ewe iwe ọkụ. Ịhụnanya Ya ebuka.
Lee ka ịdị mma nke Onyenweanyị si gazuo ihe niile.
O ji nnukwu ebere na-elekwa ihe niile O kere.
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m eto aha Gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma ọ bụ Aleluya
2. Onyenweanyị, ihe niile I kere eke ga-ekele Gị.
Ndị enyi Gị ga-agọzikwa Gị.
Chineke m, ha ga-akọ akụkọ ebube nke alaeze Gị bịakwa kwupụta ike Gị.
Ha ga-eme ka ụmụ mmadụ mata ọrụ ebube Gị;
bịakwa mee ka ha mara ebube na ịma mma nke alaeze Gị.
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m eto aha Gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma ọ bụ Aleluya
3. Alaeze Gị dị ebighị ebi.
Ọchịchị Gị sikwa na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m eto aha Gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma ọ bụ Aleluya
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 21:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe
Isi Okwu: Chineke ga-ehicha ha anya mmiri niile.
M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. N’ihi na eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agafeela. Oke osimiri adịghịkwa ọzọ. A hụrụ m Obodo Nsọ ahụ, bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si n’eluigwe, ebe Chineke nọ, na-arịdata. E dozisịrị ya, chọọ ya mma dị ebube, dịka nwagbọghọ gaje izute di ga-alụ ya. M wee nụ oke olu ka o si n’oche eze ahụ daa, sị:
“Lee, obodo ọma nke a! N’ebe a ka Chineke binyere ụmụ mmadụ. Chineke ga-ewu ebe obibi Ya n’etiti ndị mmadụ. Ha ga-abụ ndị nke Ya. Chineke abịakwa bụrụ Chineke ha site ugbu a gawa.
Aha Ya bụ: “Chineke-Nọnyeere-Ha”. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị n’anya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Akwa, iru uju na ọnụma, na ihe mgbu agaghị adịkwa ọzọ.
Ihe ochie niile agafeela”. Onye ahụ nọ n’oche eze ahụ wee sị m: “Lee, ana M eme ka ihe niile dị ọhụrụ”! O wee zie m ọzọ, sị: “Deba ihe ndị a n’Akwụkwọ! N’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa ezi okwu”.
MBEKU – Jọn. 13:34
Aleluya, Aleluya!
Jesu kwuru sị: Iwu ọhụrụ ka M na-enye ụnụ. Hụnụ ibe ụnụ n’anya ka M si hụ ụnụ n’anya.
Aleluya!
OZIỌMA – 13:31-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Ana M enye ụnụ iwu ọhụrụ. Hụnụ ibe ụnụ n’anya.
Mgbe Judas hapụrụ, Jesu sịrị: “Ugbu a ka a na-enye Nwa Nke Mmadụ otito. A na-enyekwa Chineke otito n’ime Ya. Ọ bụrụ na e nyere Chineke otito n’ime Ya, Chineke ga-enyekwa Ya otito n’ime onwe Ya.
Ọ ga-enyekwa Ya otito ahụ ngwa ngwa. Ụmụntakịrị m, ọ fọdụrụ nwa oge ntakịrị Mụ na ụnụ ga-anọ. Ụnụ ga-achọ M. Ma ụdị ihe M gwara ndị Juu ka M na-agwa ụnụ ugbu a.
Iwu ọhụrụ ka M na-enye ụnụ: Hụnụ ibe ụnụ n’anya. Otu M si hụ ụnụ n’anya, sinụ otu ahụ hụrịta ibe ụnụ n’anya. Ọ bụrụ na ụnụ enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe ụnụ nọ, mmadụ niile ga-eji nke ahụ mara na ụnụ bụ ndị na-eso ụzọ M”.
Igbo Mass Readings for May 18 2025, Mọnde Izuụka nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi
Igbo Mass Readings for May 18 2025, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.