Igbo Mass Readings for February 7 2027, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 7 2027, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1-4,6-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Job

Isi Okwu: A nọ m na ntụgharị ntụgharị wee ruo na chi ọbụbọ.

Job kwuru sị: Ndụ mmadụ dị n’elu ụwa, ọ bụghị ndọlị ka a na-adọlị? Ọ bụ na oge ya adịghị ka nke onye e goro ọrụ? Dịka o si agụ ohu agụụ ịbanye n’okpuru ndo; dịkwa ka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya; otu ahụ kwa ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa jupụtara na nsogbu.

Kwa abalị kwa abalị, ume na obi anaghị eru m ala. Mgbe m dina n’ute, ihe m kpụ n’ọnụ bụ: “Olee mgbe m ga-ebili.” Abalị wee tooro m oke ogologo. Anọ m na ntụgharị ntụgharị wee ruo na chi ọbụbọ.

Oge m na-agba ọsọ karịa ọkpa e ji akpa akwa. Oge m na-agwụ n’enweghị olile anya. Cheta na ndụ m dị ka ifufe. Anya m agaghị ahụkwa añụrị ọzọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 146:1-6, Az. 3

Azịza: Toonụ Onyenweanyị, onye na-agwọ ndị obi gbawara agbawa. Ma ọ bụ Aleluya.

1. Toonụ Onyenweanyị n’ihi na Ọ dị mma.

Kweerenụ Chineke anyị ukwe otito n’ihi na Ọ dị ọgọ.

O kwesịrị ito Ya. Onyenweanyị na-ewugharị Jerusalem ọzọ.

Ụmụ Izrel gbasara agbasa ka Ọ na-akpọkọta ọnụ.

Azịza: Toonụ Onyenweanyị, onye na-agwọ ndị obi gbawara agbawa. Ma ọ bụ Aleluya.

2. Ọ na-agwọ ndị obi gbawara agbawa,

bịakwa na-ekechi ọnya ha.

Ọ na-agụ kpakpando ọnụ,

bịakwa na-akpọ nke ọ bụla aha n’otu n’otu.

Azịza: Toonụ Onyenweanyị, onye na-agwọ ndị obi gbawara agbawa. Ma ọ bụ Aleluya.

3. Onyenweanyị dị ebube, ike Ya dị egwu.

Amamihe Ya enweghị njedebe.

Onyenweanyị na-ewelite ndị e wedara ala,

bịakwa na-eme ka ndị na-emebi iwu daruo ala.

Azịza: Toonụ Onyenweanyị, onye na-agwọ ndị obi gbawara agbawa. Ma ọ bụ Aleluya.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 9:16-19,22-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Etosiri ịta m ahụhụ ma ọ bụrụ na m agbasaghị oziọma

A naghị m anya isi n’ihi na ana m ezisa Oziọma. N’ihi na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m iwu ka m rụọ. N’ihi na ahụhụ dịrị m ma ọ bụrụ na ezisaghị m Oziọma!

Ọ bụrụ na ọrụ izisa Oziọma si na nhọpụta nke m, enwere m ụgwọ ọrụ. Ma ọ bụrụ na o sighị na nhọpụta nke m ihe m na-arụzi bụ naanị ọrụ Kristi nyere m iwu ka m rụọ.

Gịnị kwa bụ ụgwọ ọrụ m? Naanị nke a: Na ana m ezi ndị mmadụ Oziọma ahụ n’efu, n’anaraghị ha ego, na n’ejighị ike niile m nwere n’ọrụ m na-anara ndị mmadụ ihe.

N’eziokwu, ka m nwe onwe m. Ọ dịghị onye m bụ ohu ya! Ma ana m eme onwe m odibo onye ọ bụla ka m wee rite ndị ka n’ọnụ-ọgụgụ n’uru. N’ebe ndị na-adịghị ike n’okwukwe nọ, ana m eme onwe m onye na-adịghị ike, ka m wee rite ndị na-adịghị ike n’uru.

Aghọọla m ihe niile n’ebe mmadụ niile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ n’ime ha. Ma ana m eme ihe ndị a niile n’ihi Oziọma ahụ, ka m wee keta oke n’ọtụtụ ngọzi nke dị n’ime ya.

MBEKU – Jọn 17:17

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, okwu Gị bụ eziokwu. Mee ka anyị dị asọ n’eziokwu Gị.

Aleluya!

OZIỌMA – 1:29-39

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Ọ gwọrọ ọtụtụ mmadụ nrịa nrịa dị iche iche na-esogbu ha.

Mgbe ha si n’ụlọ nzukọ ahụ pụta, n’atụfughị oge, Jesu na Jemis na Jọn banyere n’ụlọ Saịmọn na Andrụ. Ma nne nwunye Pita dina n’ahụ ọkụ. Ngwa ngwa ha wee kọọrọ Jesu maka ahụ mgbu ya.

O wee jekwuru ya, jide ya n’aka, palie ya. Ahụ ọkụ ahụ wee hapụ ya. O wee malite ile ha ọbịa. Na mgbede ụbọchị ahụ, mgbe anyanwụ dasịrị, ha kpọtaara Jesu ndị niile ahụ na-adịghị ike na ndị mmụọ ọjọọ ji.

Ndị obodo ahụ niile wee zukọọ n’ihu ụlọ ahụ Jesu nọ n’ime ya. Jesu wee gwọọ ọtụtụ mmadụ nrịa nrịa dị iche iche na-esogbu ha. Ọ chụpụkwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ.

O kweghị ha kwuo okwu, n’ihi na ha matara Ya. Jesu wee bilie n’isi ụtụtụ echi ya, n’ụzọ ụtụtụ, jee n’ebe dara jụụ n’ime ọzara ka O kpee ekpere. Ma Saịmọn na ndị ya na ha nọ pụrụ, na-achọgharị Ya.

Mgbe ha chọtara Ya, ha wee sị Ya: “Mmadụ niile na-achọ Gị.” Ma ọ sịrị ha: “Ka anyị jeenụ ebe ọzọ, n’obodo nta niile nọ nso n’ebe a, ka M wee kwusakwaa okwu Chineke n’ebe ahụ.

N’ihi na ọ bụ ime nke a ka M bịara.” Ya mere, Ọ gagharịrị na Galili niile, na-ezisa Oziọma n’ụlọ nzukọ ha, na-achụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ.

Igbo Mass Readings for February 8 2027, Mọnde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for February 7 2027, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.