Igbo Mass Readings for March 14 2027, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 14 2027, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 31:31-34

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Jeremaya

Isi Okwu: Aga m ehiwe Ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Mmehie ha agaghịkwa agbata m n’obi.

Onyeweanyị na-ekwu sị: Lee, oge na-abịa mgbe M na ezi na ụlọ Izrel na ezi na ụlọ Juda ga-agba ndụ ọhụrụ. Ma ọ gaghị adịkwa ka ọgbụgba ndụ ahụ Mụ na nna nna ha gbara, mgbe M seere ha n’aka, dọpụta ha n’ala Ijipt.

Ha mebiri ọgbụgba ndụ M ahụ, M wee gosịkwanụ ha na M ka ha ike. Ọ bụ Onyenweanyị na-ekwu ihe ndị a. Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ nke M na ezi na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ahụ ruru: ọ bụ Onyenweanyị na-ekwu.

Aga M akụnye iwu M n’ime ha, bịakwa dee ya edee n’obi ha. Mgbe ahụ, aga M abụ Chineke ha, ha abịakwa bụrụ ndị nke M. Ọ gaghị adịkwa mkpa ọzọ na mmadụ ga-akụziri ibe ya, ma ọ bụ nwanne ịsị nwanne ya: “Mụta maka Onyenweanyị”, n’ihi na ha niile ga-ama onye M bụ, ma onye ukwu, ma onye nta.

Ọ bụ Onyenweanyị na-ekwu: n’ihi na aga M agbaghara ha njọ ha niile bịakwa chefuo ajọ omume ha niile kpam kpam.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 50:3-4, 12-15. Az. 12

Azịza: Chineke m, kenye m obi dị ọcha.

1. Chineke m, were obi ọma Gị meere m ebere.

Site na nnukwu obi ebere Gị hichapụ mmehie m niile.

Sachaa m, sachaakwa m ọzọ,

ka m si na mmehie m pụta.

Ghụchapụ ajọ omume m.

Azịza: Chineke m, kenye m obi dị ọcha.

2. Onyenweanyị, kenye m obi dị ọcha.

Tinye mmụọ kwụdosiri ike n’ime m.

A chụpụkwala m n’ihu Gị.

A napụkwala m mmụọ Gị dị nsọ.

Azịza: Chineke m, kenye m obi dị ọcha.

3. Nyeghachie m obi ụtọ nke enyemaka Gị.

Were mmụọ nke ịkwụdosi ike guzowe m.

Ka m wee kuziere ndị na-agahie agahie ụzọ Gị,

ka ndị njọ were laghachikwa n’ebe Ị nọ.

Azịza: Chineke m, kenye m obi dị ọcha.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:7-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi e degaara ndị Hibru

Isi Okwu: Ọ mụtara irube isi were bụrụ ụzọ nzọpụta ebighị ebi.

Mgbe Jesu nọ n’ụwa, o kpere ekpere nye Chineke. Mgbe ụfọdụ n’ọnọdụ ekpere ahụ, ọ na-akwa akwa. Mgbe ọzọ kwa, anya mmiri na-ejupụta ya n’anya.

O kpere ekpere ya nye Chineke n’ihi na ọ maara na Chineke pụrụ ịzọpụta ya site n’ọnwụ. Chineke nụkwara ekpere ya, n’ihi na Jesu bụ onye nchụaja na-erube isi.

Jesu bụ Ọkpara Chineke, ma ọ hụrụ ahụhụ. N’ime ahụhụ a niile, ọ mụtara irube isi site n’ihe niile dakwasịrị ya. Ma Kristi sitere n’ahụhụ ghọọ onye zuru oke. Ọ ghọrọ ụzọ nzọpụta zuru oke, nye mmadụ niile bụ ndị na-erubere ya isi.

MBEKU – Jọn 12:26

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Onyenweanyị kwuru sị: “Odibo M ọ bụla ga na-eso M. Ebe M nọ, ka odibo M ga-anọkwa.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

ΟΖΙỌΜΑ – 12:20-33

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ọ bụrụ na mkpụrụ osisi a kụrụ n’ala anwụọ, ọ ga-amịta ọtụtụ mkpụrụ.

Ma ụfọdụ n’ime ndị Grik so n’etiti ndị bịara Jerusalem ịkpọrọ Chineke isi ala n’oge emume ahụ. Ha wee bịakwute Filip, bụ onye Betsaịda nke Galili, wee rịọ yọ, sị: “Nna anyị ukwu, anyị na-achọ ịhụ Jesu.”

Filip wee bịa gwa Andru. Ha abụọ wee soro, jee gwa Jesu. Jesu wee zaa sị ha: “Oge ezuola, ka e wee nye Nwa nke Mmadụ otito. N’ịgwa ụnụ ezi okwu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka adaghị n’ala, nwụọ, naanị ya ga-anọgide.

Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ na-amịta ọtụtụ mkpụrụ. Onye ọ bụla hụrụ naanị ndụ ya n’anya, na-atụfu ya. Onye ọ bụla nke kpọrọ ndụ ya asị n’ụwa nke a, ga-edebe ya ruo ndụ ebighị ebi.

Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ejere M ozi, ọ ga-esorịrị M. Ebe Mụ onwe M nọ ka onye ozi M ga-anọkwa. Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ejere M ozi, ya ka Nna m ga-asọpụrụ. “Ugbu a ka mkpụrụobi na-alọ m mmiri.

Gịnị ka M ga-ekwukwa? Nna, zọpụta M n’oge elekere nke a. N’ihi na abịara M n’ụwa ka M wee garuo oge elekere ahụhụ nke a. Nna, nye aha Gị otito!”

Na mgbe ahụ, otu olu sitere n’eluigwe daa, sị: “Enyela M ya otito. Aga M enyekwa Ya otito ọzọ!” Igwe mmadụ ndị guzo n’ebe ahụ nụrụ olu ahụ, wee sị: “Egbe elu agbaala!”

Ndị ọzọ wee sị: “Mmụọ ozi agwala Ya okwu!” Ma Jesu gwara ha, sị: “Ọ bụghị n’ihi M ka olu a ji daa, kama ọ bụ n’ihi ụnụ. Ugbu a ka a ga-ekpe ụwa ikpe! Ugbu a ka a ga-achụpụ onye isi nke ụwa a.

Ọ bụrụ na e si n’ala welie M elu, aga M adọtara onwe M mmadụ niile.” O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ Ọ gaje ịnwụ. Igwe mmadụ ahụ, wee zaghachi, sị Ya: “Anyị nụrụ n’iwu anyị na Kristi ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Olee otu I si ekwu na a ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu? Onye bụ Nwa nke Mmadụ a?”

Igbo Mass Readings for March 15 2027, Mọnde Izuụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for March 14 2027, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.