Igbo Mass Readings for April 6 2025, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 6 2025, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 43:16-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Lee, ana M emepụta ihe ọhụrụ na-enyekwa ndị nke M họọrọ ihe ọñụñụ.

Lee ihe Onyenweanyị kwuru: Onye ahụ mere ka ụzọ gafee n’oke osimiri bịakwa si na nnukwu mmiri kwaa okporo ụzọ. Onye na-eme ka ụgbọ ala na ịnyịnya na igwe ndị agha ghasara n’ọhịa ekuliteghị ọzọ e wee menyụọ ha ka emenyụrụ ọkụ.

Ọ dịghị mkpa ichetawa ihe gara aga. Ọ bụghị ihe mere mgbe ochie ka a ga-atụgharịwa n’obi. Lee anya, ana M eme ihe ọhụrụ. O bidolarị ugbu a na-apụta ihè. Ọ bụ na ụnụ anaghị ahụ ya?

N’ezie, ana M arụ ụzọ n’ime ọzara, na-arụkwa okporo ụzọ n’ala tọgbọrọ n’efu. Anụ ọhịa ga-asọpụrụ M, ma nkịta ọhịa, ma enyi nnụnụ, n’ihi na ana M etinye mmiri n’ime ọzara bịakwa na-etinye iyi n’ala tọgbọrọ n’efu, iji nye ndị M họtara ahọta mmiri ọñụñụ. Ndị M kpụrụ maka onwe M ga-ekwe ukwe otito M.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 125:1-6 Az. 3

Azịza: Leenụ ọrụ ebube Onyenweanyi rụụrụ anyị. N’ezie obi dị anyị ụtọ.

1. Mgbe Onyenweanyị zọpụtara Zayọn n’ọnọdụ ịgba ohu,

ọ dị ka ihe mere na nrọ.

Mgbe ahụ ka ọnụ anyị bụ sọ ọchị,

egbugbere ọnụ anyị a bụrụ sọ ukwe.

Azịza: Leenụ ọrụ ebube Onyenweanyi rụụrụ anyị. N’ezie obi dị anyị ụtọ.

2. Ndị ọgọ mmụọ n’onwe ha na-asị:

Leenụ ọrụ ebube Dinwenụ rụụrụ ha!

Leekwanụ ọrụ ebube Onyenweanyị rụụrụ anyị.

N’ezie, obi dị anyị ụtọ.

Azịza: Leenụ ọrụ ebube Onyenweanyi rụụrụ anyị. N’ezie obi dị anyị ụtọ.

3. Onyenweanyị, zọpụta anyị n’ọnọdụ ịgba ohu,

dị ka mmiri na-asọ asọ si eme n’ala kpọrọ nkụ.

Ndị bụ anya mmiri na-akụ mkpụrụ ihe ga-ejiri ọñụ na-aghọrọ ha.

Azịza: Leenụ ọrụ ebube Onyenweanyi rụụrụ anyị. N’ezie obi dị anyị ụtọ.

4. Ha bu anya mmiri buru mkpụrụ ihe ha ga-akụ na-eje n’ubi:

ha na-ekwe ukwe mgbe ha na-alọta, buruchaa ihe-owuwe-ubi ha.

Azịza: Leenụ ọrụ ebube Onyenweanyi rụụrụ anyị. N’ezie obi dị anyị ụtọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:8-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndị Filipaị

Isi Okwu: N’anya m, o nweghị ihe ọ bụla bara uru, karịakwa inwe ike inweta Kristi bịakwa keta oke n’ahụhụ Ya niile.

N’ezi okwu, agụrụ m ihe niile n’ihe lara n’iyii n’ihi uru ahụ nke kachasị ukwu, bụ ịmata Kristi Jesu, Onyenwe m. N’ihi Kristi, anarala m ịla n’iyii nke ihe niile m nwere.

Agụkwara m ha n’ihe mkpofu, ka m wee rite Kristi n’uru, ewee hụ m n’ime Ya. Mgbe ahụ ezi omume m agaghị abụkwa nke aka m ọzọ, ma ọ bụ nke sitere n’idebe Iwu.

Kama ọ ga-abụzi ezi omume nke sitere n’okwukwe mmadụ kwere na Kristi, bụ ezi omume nke dabeere n’okwukwe, nke Chineke na-enye ndị nwere okwukwe.

Ihe dị m mkpa bụ ka m mara Kristi, matakwa n’ime m ike nke mbilite n’ọnwụ Ya; ka m wee kete oke n’ahụhụ Ya niile, wee yie ya n’ọnwụ Ya. Ọ dị m mkpa, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka m ruo n’isi na ndị nwụrụ anwụ bilie.

Anaghị m ekwu na emetachaala m ihe niile dị mkpa ugbu a, ma ọ bụ, na ndụ m ezuola oke n’ihe niile ugbu a. Kama ana m agbasi ọsọ ike, na-aga n’ihu, ka m wee rite ihe a na-agbata n’ọsọ; ka m wee nwude, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ihe ahụ Kristi Jesu nwudere m n’ihi ya.

Ụmụnna m, n’eziokwu, anaghị m eche na-enwetala m ihe ahụ m na-achụ ugbu a. Ma otu ihe ka m na-eme ugbu a. Ana m ebufe ihe gara aga n’azụ, jiri ọsọ na-agba, ka m wee chụkwuru ihe dị n’ihu.

Ya mere, ana m agba oke ọsọ, na-aga n’ihu, ebe a ga-ebi ọsọ, ka m wee nweta ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ, nke Chineke kpọrọ anyị site na Kristi Jesu.

MBEKU – Joel 2: 12-13

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Dinwenụ na-ekwu ugbu a sị: “Lọghachinụ azụ. Werenụ obi ụnụ niile bịakwute M n’ihi na abụ M sọ ebere na ịhụnanya.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 8:1-11

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Ozọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: “Ọ bụrụ na o nwere onye n’ime ụnụ na-emebeghị njọ, ngwa, ya buru ụzọ tụọ nwanyị a nkume.”

Jesu wee gaa n’ugwu Olivu. Mgbe O ruru isi ụtụtụ. Ọ pụtakwara ọzọ n’ogige Ụlọ Nsọ. Mgbe ndị mmadụ bidoro na-abịakwute Ya n’igwe, Ọ nọdụrụ ala, malite ikuziri ha ihe.

Ndị Ode-akwụkwọ na ndị Farisii wee kpụtara Ya otu nwanyị e jidere ebe ọ na-akwa iko, wee kwụba ya ọtọ n’etiti mmadụ niile. Ha wee sị Jesu: “Onye nkuzi, e jidere nwanyị a ebe ọ na-akwa iko.

N’iwu anyị, Mosis kwuru na a ga-eji okwute tụgbuo nwanyị mere ihe dị otu a. Ma gịnị ka I kwuru?” (Ihe a ha kwuru bụ ọnya ka ha kweere Ya, iji si n’okwu ọnụ Ya nwete ihe ha ga-eji bo Ya ebubo.)

Sọ ihe Jesu mere bụ iji nwayọọ hudata ala, were mkpịsị aka Ya na-ede ihe n’ala. Ma mgbe ha nọgidere, na-ajụ Ya ajụjụ, Jesu kulitere sị ha: “Onye ọ bụla n’ime ụnụ nke na-emehiebeghị mbụ, ya buru ụzọ tụọ nwanyị a okwute.”

Mgbe O kwuru ihe a, O hulatara ala ọzọ, na-ede ihe n’ala. Ndị ahụ jiri nwayọọ nwayọọ na-apụ otu, otu, malite na ndị okenye. Ha hapụrụ naanị Jesu na nwanyị ahụ, onye guzorokwa ebe ahụ ha kwụbara ya.

Mgbe Jesu kulitere, Ọ sịrị ya: “Nwanyị, olee ebe ha niile gara? Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ mara gị ikpe?” Nwanyị ahụ zara Ya: “Onyenweanyị, ọ dịghị onye ọ bụla.” Jesu wee sị ya: “Mụ onwe M agaghị ama gị ikpe. Kama, lawa, site ugbu a gawa n’ihu, e mekwala njọ a ọzọ.”

Igbo Mass Readings for April 7 2025, Mọnde Izuụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for April 6 2025, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.