Igbo Mass Readings for February 16 2025, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 16 2025, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:5-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya

Isi Okwu: Ihu ọjọọ kpọrọ onye ọ bụla tụkwasịrị obi na mmadụ nkịtị. Ngọzi bụ nke onye tụkwasịrị obi na Dinwenụ.

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụmọnụ ga-adịrị onye ọ bụla tụkwasịrị obi na mmadụ, onye chekwubere n’ihe nke anụ ahụ, onye nke kpọchiri obi ya n’ebe Dinwenụ nọ. Ọ dị ka ahịhịa dị n’ala kpọrọ nkụ: oge ihe ọma bịara, o nweghị anya iji hụ ya.

Ọ na-anọ na mbara ịkpa, bụ ala nnu, na-enweghị onye bi na ya. Ngọzi dịrị onye tụkwasịrị Dinwenụ obi, bịa were Dinwenụ mee nchekwube ya. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbara mgbọrọgwụ ruo n’ime mmiri.

Oge okpomọkụ bịara, ọ naghị erute ya; akwụkwọ ya niile na-anọgide ndụ. N’oge ọkọchị bịara, ọ naghị enwe nsogbu ọ bụla, abịakwa, o nweghị mgbe ọ naghị amịta mkpụrụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 1:1-4. 6 Az. 39:5

Azịza: Añụrị ga-adịrị onye tụkwasịrị obi na Dinwenụ.

1. N’ezie añụrị bụ nke onye ahụ anaghị eso ndụmọdụ ndị ajọ omume;

onye anaghị eguzo n’ụzọ ndị mmehie ma ọ bụ sonye n’otu ndị na-akwa emu.

Kama añụrị ya bụ n’iwu nke Dinwenụ.

Ọ na-atụgharị ya obi ehihie na anyasị.

Azịza: Añụrị ga-adịrị onye tụkwasịrị obi na Dinwenụ.

2. Ọ dị ka osisi a kụnyere ebe mmiri si ehudata,

nke na-amịta mkpụrụ n’oge ya,

akwụkwọ ya agaghị agbụchasị,

agamnihu ga-adị n’ọrụ ya mgbe niile.

Azịza: Añụrị ga-adịrị onye tụkwasịrị obi na Dinwenụ.

3. Ọ dịghị otu a maka ndị ajọ omume.

Ikuku ga-ebusasị ha dịka o si ebusa ụtụ ọka.

Onyenweanyị na-echegide ụzọ ndị ezi omume,

mana nke ndị ajọ omume na-eduba na mbibi.

Azịza: Añụrị ga-adịrị onye tụkwasịrị obi na Dinwenụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:12.16-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Ọ bụrụ na e biliteghị Kristi, Okwukwe ụnụ lara n’iyii.

Ọ bụrụ na okwuchukwu anyị na-ekwu bụ na Kristi bilitere n’ọnwụ, gịnị mere ụfọdụ n’ime ụnụ ji ekwu na ndị nwụrụ anwụ anaghị ebilite ọzọ? Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ anaghị ebilite ọzọ, ọ pụtara na e biliteghị Kristi.

Ọ bụrụ na e biliteghị Kristi, okwukwe ụnụ lara n’iyii. Ụnụ ka nọkwa n’ime njọ ụnụ. Ma nke jọgburu onwe ya na njọ bụ na, ndị niile nwụrụ na Kristi nwụgidere ọnwụ, nwụọ pịịị.

Ọ bụrụ na nchekwube niile anyị nwere na Kristi gwụsịrị sọ na ndụ ụwa a, ọ pụtara na ụwa ọjọọ anyị kacha njọ karịa nke onye ọ bụla ọzọ dị n’elu ụwa. Ma nke bụ ezi okwu bụ na e bilitere Kristi n’ọnwụ. Ọ bịakwa bụrụ mkpụrụ mbụ nke ndị dara mba n’ụra.

MBEKU – 1 Sam. 3:9. Jọn. 6:69

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, kwube maka na nwodibo Gị na-ege ntị. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.

Aleluya!

OZIỌMA – 6:17, 20-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Ngọzi dịrị ụnụ bụ ndị ogbenye Ma ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị ọgaranya.

Mgbe Jesu si n’ugwu gbadata, Ọ kwụsịrị ebe ala dị larịị, ebe ọtụtụ Ụmụazụ gbakọrọ. Nnukwu igwe mmadụ so Ya nọrọ ebe ahụ; ndị si na Judia niile na Jerusalem, tinyekwara ndị si na mba mmiri nke ọnụmara Taya na Sidọn.

Jesu wụkwasara Ụmụazụ na ọtụtụ ndị otu Ya anya wee kwuo sị: “Ngọzi dịrị ụnụ bụ ndị ogbenye, alaeze Chineke bụ nke ụnụ, Ngọzi dịrị ụnụ bụ ndị agụụ na-agụ, ụnụ ga-enwe afọ ojuju; Ngọzi dịrị ụnụ bụ ndị na-akwa akwa, eze ga-awa ụnụ ọchị; Ngọzi ga-adịrị ụnụ mgbe ndị mmadụ ga-akpọ ụnụ asị, mapụ ụnụ n’iwu, bịakwa na-akọcha ụnụ, na-ekwutọ aha ụnụ n’ihi Nwa nke Mmadụ ka a ga-asị na ụnụ mere arụ.

N’ụbọchị ha mere ihe a, ñụrịwanụ ọñụ! Goriwenụ! N’ihi na ụgwọ buru ibu na-eche ụnụ n’eluigwe! Otu a ka nna nna ha mere ndị amụma agba ochie.” “Ma ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị ọgaranya na-amaghị Chineke, n’ihi na ụnụ enwetala ihe ụtọ ụnụ ugbu a!

Ahụhụ ga-adịrị ụnụ, ndị afọ jurula ugbu a; N’ihi na agụụ ga-agụ ụnụ! Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị nọ n’ọchị ugbu a, n’ihi na ụnụ ga-eru ụjụ kwaakwa akwa! Ahụhụ ga-adịrị ụnụ mgbe mmadụ niile na-ekwu ihe ọma banyere ụnụ, na-ajafu, n’ihi na otu ahụ ka ndị nna nna ha siri jafue ndị amụma ụgha.”

Igbo Mass Readings for February 17 2025, Mọnde Izuụka nke Isii N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for February 16 2025, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.