Igbo Mass Readings for Ụka nke Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for Ụka nke Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:18, 26-28, 32
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi
Isi Okwu: Lee, taa, ana m eche ụnụ ngọzi na abụmọnụ n’ihu.
Mosis gwara ndị mmadụ ahụ sị: “Tinyenụ okwu ndị a m gwara ụnụ n’obi ụnụ. Tinyenụ ha n’ime mmụọ ụnụ. Gbaranụ ha n’aka dịka akara. Keenụ ha n’egedege ihu dịka obodobo akwa.
Taa, ana m eguzobere ụnụ ngọzi na abụmọnụ n’ebe a. Iwu ndị a m na-etiri ụnụ n’ụbọchị taa bụ ngọzi n’aka onye sọpụụrụ iwu nke Onyenweanyị Chineke ụnụ.
Ọ bụ abụmọnụ n’aka onye nupụrụ isi n’iwu Onyenweanyị, Chineke ụnụ; Abụmọnụ n’aka onye gahiere n’okporo ụzọ nke a m na-ehibere ụnụ taa, wee soro ụmụ chi ndị ọzọ, nke ụnụ na-amabughị.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 30:2-4, 17.25 Az. 3
Azịza: Onyenweanyị, bụrụ nkume m na-agbaga ọsọ ndụ.
1. Onyenweanyị ọ bụ Gị ka m na-agbatara ọsọ ndụ.
E kwekwala ka ihere mee m.
Were ikpe nkwụmọtọ Gị gbapụta m.
Chee ntị nụrụ olu m.
Gbata ọsọ gbapụta m.
Azịza: Onyenweanyị, bụrụ nkume m na-agbaga ọsọ ndụ.
2. Bụrụ nkume m na-agbaga ọsọ ndụ.
Nnukwu ụlọ okwute m nọ ezere isi m.
Ị bụ nkume m na ebe e wusiri ike.
Ị ga-edu m, na-agbazikwara m n’ihi aha Gị.
Azịza: Onyenweanyị, bụrụ nkume m na-agbaga ọsọ ndụ.
3. Mee ka ihu Gị chakwasa nwodibo Gị.
Were obi ọma Gị zọpụta m.
Ndị niile chekwubere n’Onyenweanyị, jisienụ ike.
Nweenụ ntachị obi.
Azịza: Onyenweanyị, bụrụ nkume m na-agbaga ọsọ ndụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:21-25, 28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Ọ bụghị idebe Iwu agba ochie na-azọ mmadụ. Ọ bụ okwukwe na-azọ mmadụ.
Ma ugbu a, e gosila ụzọ Chineke si agụnye mmadụ n’onye ezi omume. Ụzọ ahụ esiteghị n’usoro Iwu Mosis, kama Iwu Mosis na okwu ndị amụma kwuru gbakwarala ụzọ ahụ akaebe.
Ụzọ ahụ bụ na, maka ndị niile kwerenụ, Chineke na-agụnyezi mmadụ na ndị ezi omume site n’okwukwe ha nwere na Jesu Kristi. N’ihi na mmadụ niile emeela njọ, a napụla ha ebube nke Chineke.
O nweghịkwa onye toruru nzọpụta n’ike aka ya. Kama, ọ bụ site n’amara Chineke, nke sitere na mgbapụta ahụ Kristi wetara, ka e si gụnye mmadụ niile na ndị ezi omume.
Ọ bụ site n’ọbara Kristi ka Chineke jiri mee ka Kristi bụrụ ihe medara Ya obi maka ndị niile kwerenụ. Ọ pụtara na ihe anyị kwere bụ na Chineke na-agụnye mmadụ n’onye ezi omume naanị site n’okwukwe. Ọ bụghị site n’idebezu ihe niile e dere n’Iwu Mosis.
MBEKU – Jọn 1:12.14
Aleluya, aleluya!
Okwu Chineke ghọrọ mmadụ wee binyere anyị. O nyere ndị nabatara Ya ike ịghọ ụmụ Chineke.
Aleluya!
OZIỌMA – 7:21-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ụlọ e wuru n’elu nkume na nke e wuru n’elu uzuzu.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla na-akpọ M, “Onyenweanyị, Onyenweanyị”, ga-aba n’alaeze Chineke, kama ọ bụ onye ọ bụla na-eme ihe Nna nke bi n’eluigwe na-achọ.
N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-asị M: Onyenweanyị! Onyenweanyị! Ọ bụkwa anyị jiri aha Gị buo amụma? Ọ bụkwa anyị jiri ike Gị chụpụ ekwensu? Ọ bụkwa anyị jiri aha Gị rụọ ọtụtụ ọrụ ebube?
Ma mgbe ahụ, aga M agwa ha hoo haa sị: ‘O nwebeghị mgbe ọ bụla M matara ụnụ. Sinụ n’ihu M pụọ, ụnụ ndị arụrụ ala!” “Ọ pụtara na onye ọ bụla nụrụ okwu M, bịakwa na-eme ya, dị ka nwoke maara ihe nke wuru ụlọ ya n’elu nkume.
Mgbe udu mmiri bịara mmiri wee zoo; ide wee tojuo; Oke ifufe wee fee; ha niile dachara n’ụlọ ahụ, ma Ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu nkume. “Ma onye ọ bụla nụrụ okwu M ma ghara ime ya eme dị ka onye nzuzu, nke wuru ụlọ ya n’elu uzuzu. Mmiri wee zoo, ide wee tojuo; oke ifufe wee fee; ha niile dachara n’ụlọ ahụ. O wee daa, laa n’iyii.”
Igbo Mass Readings for Ụka nke Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.