Igbo Mass Readings for March 4 2026, Wenezde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 4 2026, Wenezde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:18-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Jeremaya
Ndị obodo Judah na ụmụ afọ Jerusalem kwuru sị, “Bịa ka anyị tụọ aro ọjọọ banyere Jeremaya n’ihina ndị ụkọchukwu ga-enye anyị nkuzi, ma ọ bụ ndị amamihe ga-enye anyị ndụmọdụ, ma ọ bụ ndị amụma ga na-agwa anyị okwu agaghị akọ anyị, ma gharakwa ige okwu ya ọbụla.”
Gee m ntị O Yahweh, ma nụrụ arịrịọ m. E ji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ iheọma? Ha egwuorola m olulu, cheta otu m siri kwụrụ n’ihu gị na-ekwu iheọma banyere ha, ka m were wepụrụ ha iwe gị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 31: 5-6, 14, 15-16.
Azịza: Site na eziomume gị zọpụta m.
1. Ekwekwala ka m daba n’ọnya ha kweere m,
N’ihina gị bụ ebe mgbaba m,
N’aka gị ka m tinyere mmụọ m,
Ị gbapụtala m Osebụrụwa, Chineke nke eziokwu.
Azịza: Site na eziomume gị zọpụta m.
2. Ana m anụ nkwutọ ha niile,
iyi egwu si n’akụkụ niile abịa;
Ha na-agbakọ imegide m;
Ha na-agba izu iwere ndụ m.
Azịza: Site na eziomume gị zọpụta m.
3. Na gị ka m tụkwasịrị obi, O Osebụrụwa.
Ana m ekwu sị, “Gịnwa bụ Chineke m.”
Ụbọchị m niile dị gị n’aka;
Zọpụta m n’aka ndịiro m,
na ndị na-emekpa m ahọ.
Azịza: Site na eziomume gị zọpụta m.
MBEKU – Luk 8,15.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Añụrị ga-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesị ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 20:17-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Mgbe Jesu na-aga Jerusalem, ọ kpọpụtara ụmụazụ iri na abụọ ahụ iche sị ha, “Lee anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndịisi nchụaja na ndị odeakwụkwọ.
Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ. Ha ga-arara ya nye ndị mba ọzọ ka ha mee ya akaja, pịa ya ihe, wee kpọgbue ya n’obe. Ma ụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie”.
Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi kpọọrọ ụmụ ya ndịikom abụọ bịakwute Jesu. O sekpuuru ala rịọ Jesu arịrịọ. Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” Ọ zara sị, “Kwe m nkwa na ụmụ m abụọ ndị a ga-anọ otu n’aka nri, nke ọzọ n’aka ekpe n’alaeze gị.
Ma Jesu gwara ha sị, “Ụnụ amaghị ihe ụnụ na-arịọ. Ụnụ nwere ike ịñụ iko ahụhụ nke mụ onwe m ga-añụ?” Ha sị ya “Anyị nwere ike.” Jesu sịrị ha, “N’eziokwu ụnụ ga-añụ iko m ga-añụ, mana ọ bụghị m ka ọ dịịrị ikwu onye ga-anọ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m, kama ọ bụ ndị niile Nna m kwadooro ya.
Mgbe ụmụazụ ya mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, ha wesara ụmụnne abụọ ahụ iwe nke ukwu. Jesu kpọkọtara ha sị, “Ụnụ amarala na ndị na-achịachị n’etiti ndị mba ọzọ na-eji mmegbu na-achị ha dịka ndị nwe ha.
Ndị ukwu n’etiti ha na-egosikwa na ike dị ha n’aka. Ma ọ gaghị adị otu a n’etiti ụnụ. Kama onye ọbụla na-achọ ka emee ya onye ukwu n’etiti ụnụ ga-abụ onye na-ejere ụnụ ozi.
Ọzọkwa, onye ọbụla nke na-achọ ịbụ onye mbụ n’etiti ụnụ ga-abụ ohu ụnụ niile, dịka o si bụrụ na Nwa nke mmadụ abịaghị ka a gbaara ya odibo, kama ka ọ gbaara ndị ọzọ odibo, bịa werekwa ndụ ya nye maka mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
Igbo Mass Readings for March 5 2026, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Igbo Mass Readings for March 4 2026, Wenezde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.