Igbo Mass Readings for April 2 2025, Wenezde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka April 2 2025, Wenezde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 49:8-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Nke a ka Chineke kwuru; Mgbe ụnụ kpọkuru m, azara m ụnụ; n’oge nzọpụta enyeere m ụnụ aka. Echekwara m ụnụ, were ụnụ mee ọgbụgbandụ mụ na ndị mmadụ, enyeghachiri m ụnụ ala ahụ, kesara ụnụ akụnụụba a gbahapụrụ agbahapụ.

Ọ na-agwa ndị nọ na mkpọrọ. “Pụtanụ” ndị nọ n’ọchịchịrị “Gosịnụ onwe ụnụ.” Ha ga-eri nri n’okporo ụzọ. Aga m azụ ha nri n’ugwu ebe ahịhịa na-adịghị.

Agụụ mmiri ma ọ bụ nri agaghị agụ ha. Ikuku kpọrọ nkụ ma ọ bụ oke anwụ agaghị achagbu ha, maka onye ahụ nwere ebere n’ebe ha nọ na-edu ha;

Ọ ga-eduga ha n’akụkụ mmiri. Aga m eme ugwu m niile ha abụrụ okporo ụzọ, mee okporo ụzọ m niile ka ha kwụrụ chim. Lee, ha si n’ebe dị anya na-abịa, ụfọdụ si ebe mgbago na ebe ọdịda anyanwụ, ndịọzọ si n’ala Simim.

Eluigwe na ihe niile dị n’ime ya ñụrịanụ: ugwu niile kweenụ ukwe añụrị maka na Yahweh agụgụọla ndị nke ya. Ọ ga-emere ndị nke ya nọ na nsogbu ebere.

Mana Zayọn sịrị, “Osebụrụwa agbahapụla m, Chineke echefuola.” Nne o nwere ike ichefu nwa ya na-añụ ara, nke na ọ gaghị enwe obi ebere n’ebe nwa ọ mụrụ amụ nọ? Ọ bụrụgodị na ha nwere ike ichezọ, agaghị m echezọ ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145:8-9, 13- 14, 17-18.

Azịza: Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere.

1. Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere,

ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ,

o jupụtara n’ịhụnaanya,

Onyenweanyị na-egosi mmadụ niile obiọma ya,

ebere nke Onyenweanyị na-erute ihe niile o kere.

Azịza: Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere.

2. Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile,

omume ya niile jupụtara n’obi ebere,

Onyenweanyị na-azọ ndị na-ada ada,

Ọ na-ekulite ndị a kụdara n’ala.

Azịza: Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere.

3. Onyenweanyị dị mma n’ụzọ ya niile,

ọrụ aka ya niile na-egosi ịhụnaanya ya,

Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku ya nso,

ndị ji ezi obi na-akpọku ya.

Azịza: Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere.

MBEKU – Jọn. 3:16.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

N’ihina Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, nke na o nyere sọ otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla n’iyi kama ka o nwee ndụ ebeebe.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 5:17-30.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu zara ndị Juu sị, Nna m na-arụ ọrụ n’ewepụghị aka ruo ugbu a. Mụ onwe m na-arụkwa n’ewepụghị aka.” Nke a mere ndị Juu ji chọsibe ike ụzọ ha ga-esi gbuo Jesu.

N’ihina ọ bụghị naanị na ọ na-emebi iwu ụbọchị izu ike, kama ọ na-ekwukwa na Chineke bụ Nna ya, na-emekwa ka ya na Chineke hara. Jesu gwara ha sị: “N’ezie agwa m ụnụ, Nwa apụghị ime ihe ọbụla n’onwe ya na-abụghị sọọsọ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme.

N’ihina ihe ọbụla Nna na-eme ka Nwa ya na-emekwa. Nna hụrụ Nwa ya n’anya, na-egosikwa ya ihe ọbụla ọ na-eme. Ọ ga-egosikwa ya ọrụ ebube karịrị ndị a ka o wee ju ụnụ anya.

Dịka Nna si akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma nye ha ndụ, otu ahụ ka Nwa ya si enye ndị masịrị ya ndụ. Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o werela ike ikpe ikpe niile nye nwa ya.

O mere otu a ka mmadụ niile na-asọpụrụ Nwa ahụ dịka ha si asọpụrụ Nna ya. N’ihina onye ọbụla na-adịghị asọpụrụ Nwa ahụ adịghị asọpụrụ Nna ahụ zitere ya.

Ka m gwa ụnụ eziokwu, onye ọbụla nke nụrụ okwu m, ma kwenye na onye nke zitere m nwere ndụ ebeebe, a gaghị ama ya ikpe, kama o sitela n’ọnwụ banye na ndụ.

N’eziokwu, oge na-abịa, ma oge ahụ abịala ugbu a, mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Nwa Chineke; ndị nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. Dịka Nna n’onwe ya si bụrụ isiiyi nke ndụ, otu ahụ ka Nwa ya si bụrụkwa isiiyi nke ndụ.

O nyekwara Nwa ya ike ikpe ikpe n’ihina ọ bụ Nwa nke mmadụ ahụ. Nke a atụla ụnụ n’anya n’ihina oge na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ga-anụ olu ya, wee si n’ili ha pụta.

Ndị mere iheọma ga-esi n’ọnwụ bilie dị ndụ: ndị mere ihe ọjọọ ga-esikwa n’ọnwụ bilie nata amamikpe. “Apụghị m ime ihe ọbụla n’ike aka m, otu m si nụ, ka m si ekpe ikpe. N’ihi nke a ikpe m ziri ezi, maka na ọbụghị uche m ka m na-eme kama ọ bụ uche onye zitere m.

Igbo Mass readings for April 3 2025, Tọọzde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for April 2 2025, Wenezde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.