Igbo Mass Readings for March 26 2025, Wenezde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 26 2025, Wenezde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1, 5-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi
Mgbe ahụ, Mosis gwara ụmụ Izrel sị, “Dobenụ iwu niile m na-akuziri ụnụ. Ụnụ ga-adịkwa ndụ biri n’ala ahụ Yahweh, bụ Chineke nnanna ụnụ ha, na-enye ụnụ.
Akuzierela m ụnụ iwu ahụ niile, dịka Yahweh bụ Chineke m gwara m ka m mee. Dobenụ ha mgbe ụnụ ruru n’ala ahụ ụnụ ga-abanye, ibiri n’ime ya. Werenụ ikwesị ntụkwasịobi dobe ha.
Nke a ga-egosi mba dị iche-iche na ụnụ ma ihe. Mgbe ha nụrụ ihe banyere iwu a niile, ha ga-asị, ‘Leekwanụ ụdị amamihe na nghọta mba ukwu nke a nwere!”
“N’eziokwu, o nweghị nnukwu mba ọzọ chi ha nọ nso dịka Osebụrụwa bụ Chineke anyị si nọrọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya. O nweghịkwa nnukwu mba ọbụla nke iwu niile na-achị ha ziri ezi, dịka iwu ndị a m kuziri ụnụ taa!
“Ya mere, kpacharanụ anya! Hụkwanụ na, na ndụ ụnụ niile, ụnụ echefughị ihe ndị a ụnụ jiri anya ụnụ hụ. Kọọrọnụ ụmụ ụnụ na ụmụụmụ ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 147:12-13,15- 16,19-20.
Azịza: Jerusalem too Onyenweanyị.
1. Jerusalem too Onyenweanyị,
Zayọn too Chineke gị,
n’ihi na ọ bụ ya mere ọnụụzọ ama gị niile ka ha sie ike,
ọ na-agọzi ụmụ gị niile.
Azịza: Jerusalem too Onyenweanyị.
2. Ọ na-etiri ụwa iwu,
okwu ya agazuo ụwa niile ọsọ-ọsọ.
Ọ na-atụsa mkpụrụ mmiri ọcha n’ala dịka ute,
na-efesasị igirigi dịka ntụ.
Azịza: Jerusalem too Onyenweanyị.
3. Ọ na-ekpughere ụmụ Jekọb okwu ya,
na-egosikwa ụmụ Izrel iwu ya na ikpe ya.
Ọ naghị emere mba ndị ọzọ otu a,
ọ naghị akụziri ha iwu ya.
Azịza: Jerusalem too Onyenweanyị.
MBEKU – Matiu 4:4.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
‘Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 5:17-19.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ụnụ echekwala na m bịara imebi iwu Mosis na nkuzi ndị amụma. Abịaghị m imebi ha; kama abịara m imejupụta ha.
N’eziokwu, agwa m ụnụ, ruo mgbe eluigwe na ala ga-agabiga, ọdịghị otu ihe ọbụla dị nta, ọbụladị nke dịkarịchara nta, nke a ga-esi n’iwu Chineke wepụ ruo mgbe e mezuru ha niile.
Ya bụ, onye ọbụla ga-emebi otu n’ime iwu ndị a, ọbụladị nke dịkarịchara nta, ma kụzikwaara ndị mmadụ ime otu ahụ, ga-abụ onye dịkarịchara nta n’alaeze eluigwe. Ma onye ọbụla na-edobe ha, ma na-akuzikwa ha, ga-abụ nnukwu mmadụ n’ala eze eluigwe.
Igbo Mass readings for March 27 2025, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Igbo Mass Readings for March 26 2025, Wenezde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.