Igbo Mass Readings for April 16 2025, Wenezde n’ime Izuụka dị Asọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 16 2025, Wenezde n’ime Izuụka dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 50:4-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Yahweh Chineke enyela m ire nke ndị azụrụ azụ ka m wee mara ka e si eji okwu agba onye ume dara mba ike. Ụtụtụ ọbụla, ọ na-akpọlite m, ka m nụrụ ihe, ka m gee ntị dịka onye a na-akụziri ihe.

Osebụrụwa Chineke emegheela ntị m, enupụghị m isi, alaghị m azụ. Enyere m ndị na-akụ m ihe azụ m, nye ndị na-adọ m aka n’ahụọnụ, agba m. Ezoghị m ihu m maka mkparị na asọ ha na-abụ m.

Maka na Osebụrụwa Chineke na-enyere m aka, ya mere, na-adaghị m mba. Edotere m ihu m ka okwute, ama m na ihere agaghị eme m. Onye na-agbara m aka ebe nọ nso.

Kedụ onye mụ na ya ga-ana aka? Kedụ onye bụ onyeiro m? Ya kpụdebe nso. Lee, Yahweh Chineke m na-enyere m aka, onye ga-ama m ikpe? Ha niile ga-erekacha ka uwe akịka tara.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69:8-10, 21-22, 31, 33-34.

Azịza: Onyenweanyị zaa m na nnukwu ịhụnanya gị.

1. Ọ bụ maka gị ka m jiri na-edi mkparị,

nke na-eme m ihere,

nke na-eme ka m bụrụ onye ọbịa n’etiti ụmụnne m,

na-emekwa m onye mbịambịa n’ụmụnne m ndị ọzọ;

Inwe mmasị nke ụlọ gị eriela m obi,

mkparị nke ndị na akparị gị na-adakwasị m.

Azịza: Onyenweanyị zaa m na nnukwu ịhụnanya gị.

2. Mkparị agbawala obi m,

Echere m na m gaara enweta ntasịobi,

mana ahụghị m.

Ha nyere m nsi ka m rie,

mgbe agụụ gụrụ m,

mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ,

ha nyere m mmanya gbakara agbaka ka m ñụọ.

Azịza: Onyenweanyị zaa m na nnukwu ịhụnanya gị.

3. Aga m eji ukwe too aha nke Chineke,

aga m eji ekele m bulie aha ya,

mgbe ahụ ndị umeala hụ nke a, ha ga-añụrị,

Ka ụnụ wee nwee ogologo ndụ ụnụ ndị na-achọ Chineke!

Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile,

ọ naghị echezo ndị nke ya eji eji.

Azịza: Onyenweanyị zaa m na nnukwu ịhụnanya gị.

MBEKU

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Ekele dịrị gị Eze anyị, onye rubeere Nna ya isi, Ọ naara ọnwụ ya n’elu obe dịka ezi nwatụrụ.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 26:14-25.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Mgbe ahụ otu onye n’ime ụmụazụ iri na abụọ ahụ a na-akpọ Judas Izkarịọt jekwuru ndịisi nchụaja jụọ ha sị: “Gịnị ka ụnụ ga-enye m ma m rara ya nye ụnụ?”

Ha wee kwụọ ya iri ego ọlaọcha atọ. Bidozie n’oge ahụ gaba, Judas malitere chọba ụzọ ọ ga-esi rara ya nye. N’ụbọchị mbụ nke oriri Achịcha na-ekoghịeko ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị: “Olee ebe ị ga-achọ ka anyị kwadooro gị maka oriri Ngabiga?”

Jesu sịrị ha: “Gakwurunụ otu nwoke n’ime obodo, gwanụ ya na onye nkuzi kwuru sị: ‘Oge m adịla nso, mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga n’ụlọ gị.”

Ndị na-eso ụzọ ya mere ihe Jesu gwara ha. Ha wee kwadoo oriri Ngabiga. N’uhuruchi ya, ya na ndị ụmụazụ ya iri na abụọ ahụ nọ n’oche nri. Mgbe ha na-eri nri, Jesu sịrị ha, “Ana m agwa ụnụ eziokwu, otu onye n’ime ụnụ ga-arara m nye.”

Okwu a wutere ha nke ukwuu, ha wee malite jụba n’otu n’otu sị: “Onyenweanyị, ọ bụ m? Ọ zara sị: “Onye mụ na ya manyekọtara aka n’efere nri ga-arara m nye.

Nwa nke mmadụ na-ala dịka Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ, onye a ga-esite n’aka ya rara nwa nke mmadụ nye. Ọ gaara akara ya mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”

Judas onye ahụ rara ya nye jụrụ ya sị, “Ọ bụ m, Nnamukwu?” Ọ zara ya sị, “i kwuola ya na onwe gị.”

Igbo Mass Readings for April 17 2025, Ncheta Oriri Ikpeazụ (Tọọzde)

Igbo Mass Readings for April 16 2025, Wenezde n’ime Izuụka dị Asọ.