Igbo Mass Readings for April 30 2025, Wenezde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 30 2025, Wenezde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:17-26

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi.

Obi onyeisi nchụaja na ndị otu ya so n’otu ndị Sadusii jupụtara n’ekworo, ha wee bilie jide ndịozi tụkpuo ha n’ụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ. Mmụọozi nke Onyenweanyị bịara n’abalị, meghee ọnụụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ahụ, dupụta ndịozi ahụ, sị ha, “Gaanụ guzoro n’ụlọnsọ Chineke, gwanụ ọha ndị mmadụ maka ndụ ọhụrụ nke a.”

Mgbe ndịozi ahụ nụrụ nke a, ha banyere n’ụlọnsọ Chineke n’ụtụtụ, malite ịkuzi ihe. Onyeisi nchụaja na ndị otu ya bịara kpọọ ọgbakọ ikpe nke ndị Juu na nzukọ ndị okenye Izrel niile.

Ha wee ziga ozi n’ụlọ mkpọrọ, nye iwu ka akpụta ndịozi ahụ n’ihu ha. Mgbe ndị ha ziri ozi bịaruru, ha ahụghị ndịozi ahụ n’ụlọ mkpọrọ. Ha wee laghachi kọọrọ ndị nzukọ Sanhendrịn ihe ha hụrụ si, “Anyị hụrụ ụlọ mkpọrọ ka a kpọchiri ya nke ọma, hụkwa ndị nche ka ha nọ na nche n’ọnụụzọ niile.

Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ, Ọ dịghị onye ọbụla anyị hụrụ n’ime ha.” Mgbe ọchịagha nke ụlọnsọ Chineke na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị otu e si achọ ha achọ.

Ha na-atụgharị n’uche ha ihe nke a ga-apụta. N’oge ahụ otu nwoke batara sị ha, “Geenụ ntị! Ụmụnwoke ahụ ụnụ tụbara n’ụlọ mkpọrọ, kwụ n’ụlọnsọ Chineke na-akuziri ndị Juu ihe.”

Mgbe ahụ ọchịagha nke ụlọnsọ Chineke na ndịagha nke ụlọnsọ Chineke na ndịagha ya jere kpọta ndịozi ahụ n’ihu nzukọ. Ma ha akpụtaghị ha n’ike, n’ihina ha na-atụ egwu, ka ọha ndị Juu ghara ịtụ ha okwute.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34:2-3, 4-5, 6-7, 8-9.

Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile,

Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla.

Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị,

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.

Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị,

soronụ m too aha ya.

Akpọkuru m Onyenweanyị, Ọ zaa m,

O zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m.

Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

3. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke-amụke,

ihere anaghị eme ya ma ọlị.

Onyenweanyi  na-anụ mkpu akwa nwogbenye,

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.

Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

4. Mmụọọma nke Onyenweanyị,

na-eche ndị na-atụ ya egwu nche;

Ọ na-azọpụta ha;

Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!

Añụrị na-adịrị onye gbabara n’Onyenweanyị.

Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Akpọdoro ya n’elu obe n’ihi anyị, mana ugbu a Dinwenụ esila n’ili bilie.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 3:16-21.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara Nịkọdemus sị: N’ihina Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, nke na o nyere sọ otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla n’iyi kama ka o nwee ndụ ebeebe, Chineke zitere nwa ya n’ime ụwa, ọ bụghị ka ọ maa ya ikpe kama ka azọpụta ụwa site n’aka ya.

A gaghị ama onye ọbụla kwenyere na ya ikpe, ma onye na-ekwenyeghị a malarị ya ikpe n’ihina o kwenyeghị n’aha sọ otu nwa Chineke. Nke a bụ ikpe ahụ, na ihè ahụ abịala n’ime ụwa, ma ndị mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya karịa ihe, n’ihi omume ọjọọ.

Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ na-akpọ ihe asị. Ọ naghị abịakwute ihé, ka a ghara ime ka ajọ omume ya pụta ihe. Ma onye na-eme eziomume na-abịakwute ihé ahụ, ka eziomume ya pụta ihe, na o mere ya n’ịtụ egwu nke Chineke.

Igbo Mass Readings for May 1 2025, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for April 30 2025, Wenezde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.