Igbo Mass Readings for February 23 2028, Wenezde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 23 2028, Wenezde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:13-17

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis

Ugbu a geenụ ntị ụnụ ndị na-asị,. Taa, mọbụ echi, anyị ga-eje obodo nke a mọbụ nke ọzọ nọọ ebe ahụ otu afọ zụọ ahịa, kpata ego buru ibu. Ma ụnụ amaghị ihe ga-eme echi.

Ndụ ụnụ dịka gịnị? Ndụ ụnụ dị ka igirigi nke na-apụta ihe nwa oge e mechaa o mie ala. Kama ihe kwesịrị ka ụnụ kwuo bụ nke a: Ọ bụrụ na Onyenweanyị kwe, anyị ga-adị ndụ mee nke a mọbụ nke ọzọ.

Ma otu ọ dị, ụnụ na-anya isi na-afụli onwe ụnụ elu. Ịnya isi dị otu a dị njọ. Ya mere onye ọbụla maara iheọma ma o meghị ya ọ bụụrụ onye ahụ njọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 49: 1-2,5-6,7-9,10

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.

1. Nụrụnụ nke a ụnụ mba niile

geenụ ntị ụnụ ndị bi n’ụwa.

Ma ndị dị elu ma ndị dị ala

ndị bara ụba na ndị ogbenye.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.

2. Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’oge nsogbu

Mgbe omume ọjọọ nke ndịiro gbara m gburugburu?

Ndị tụkwasaraobi ha n’akụnụụba

ma werekwa nnukwu akụnụba ha na-anya isi.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.

3. Ma o nweghị onye nwere ike ịgbapụta onwe ya

mọbụ jiri ego kwụọ Chineke ụgwọ ndụ ya,

n’ihi ụgwọ ndụ mmadụ dị oke ọnụ ahịa ọ kariri ya ịkwụ.

Ya mere, O nweghị ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịnwụ,

ka ọ ghara ịla mmụọ.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.

4. N’ihina ọ maara na ndị amamihe ga-anwụ,

Otu aka ahụkwa ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe ga-anwụkwa,

ha ga-anwụ hapụrụ ndịọzọ akụnụụba ha.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.

MBEKU – 2 Cor 5:19

Alleluia, Alleluia:

Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma. O tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.

Alleluia.                              

OZIỌMA – 9:38-40

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jọn sịrị Jesu, “Onyenkuzi, anyị hụrụ otu nwoke onye na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, anyị gbochiri ya, n’ihina ọ bụghị onye otu anyị”.

Ma Jesu zara sị, “Ụnụ egbochila ya, n’ihina ọ dịghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ebube n’aha m nke pụrụ ikwulụ m ọsọọsọ. N’ihina onye na-adịghị emegide anyị nọnyeere anyị.

Igbo Mass Readings for February 24 2028, Tọọzde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 23 2028, Wenezde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.