Igbo Mass Readings for May 26 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 26 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 36:1, 5-6, 16-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Meere anyi ebere, O Onyenweanyị, Chineke nke ihe niile, lekwasị anyị anya. Mee ka ha mata otu anyiị onwe anyị siri mata na o nweghị Chineke ọzọ dị belụsọ gị, O Onyenweanyị.

Gosi ihe ịrịbaama ọhụrụ ma rụkwaa ọrụebube ndịọzọ. Gosi ebube aka gị, ike nke aka nri gị. Zọpịa isi ndị ọchịchị ndịiro anyị. Ndị na-ekwu, na-asị, “O nweghị ike ọzọ dị n’ụwa karịa anyị”.

Kpọghachi agbụrụ Jekọb niile, nyeghachi ha oke ha dịka ọ dị na mbido. Meere ndị nke gị ebere, O Onyenweanyị, ha bụ ndị a na-akpọ aha gị, meere Izrel bụ onye nke ị kpọrọ ọkpara gị ebere.

Gosi ebere gị n’ebe obodo gị dị nsọ dị, Jerusalem, ebe ezumike gị. Ka otito gị jupụta na Zayọn. Ka ebube gị jupụta ụlọnsọ gị.

Gbaara ndị ahụ i kere na mbido akaebe; mejupụtakwa amụma a magara n’aha gị. Nye ndị nọ na-eche gị ụgwọ ha. Mee ka ndịamụma gị bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasịobi.

Nụrụ O Onyenweanyị, arịrịọ ụmụodibo gị dịka Erọn siri rịọ n’ekpere ngọzi ya, ka mmadụ niile nọ n’ụwa mara gị onwe gị bụ Onyenweanyị, Chineke nke dị ebeebe.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 79:8, 9, 11, 13

Azịza: Meere anyị bere, O Onyenweanyị, Chineke nke ihe niile, lekwasị anyị anya.

1. Atala anyị ahụhụ maka njọ nnanna anyị ha mere;

kama ka obiọma gị bịakwute anyị ọsọọsọ,

n’ihina ha ewotuola anyị ala nke ukwuu.

Azịza: Meere anyị bere, O Onyenweanyị, Chineke nke ihe niile, lekwasị anyị anya.

2. Nyere anyị aka, O Chineke onye nzọpụta anyị,

maka otito nke aha gị,

zọpụta anyị, ma gbagharakwa anyị njọ anyị,

n’ihi aha gị.

Azịza: Meere anyị bere, O Onyenweanyị, Chineke nke ihe niile, lekwasị anyị anya.

3. Meenụ ka akwa arịrị ndị nọ na nga ruo gị ntị,

were ike aka gị chekwaba ndị a amara ikpe ọnwụ!

Mgbe ahụ anyị bụ ndị nke gị, igwe atụrụ ị na-azụ,

ga-enye gị ekele ebeebe, ebeebe,

bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ anyị ga-ekwupụta otito gị.

Azịza: Meere anyị bere, O Onyenweanyị, Chineke nke ihe niile, lekwasị anyị anya. 

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

A na m akpọzi ụnụ ndị enyi, Onyenweanyị na-ekwu, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m.

Alleluia.

OZIỌMA – 10:32-45

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ka ha nọ n’ụzọ na-agaje Jerusalem, Jesu ganahụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Nke a tụrụ ha n’anya, bịakwa dị ndị mmadụ, ndị so ha egwu. Ma Jesu kpọrọ ndị ozi iri na abụọ ahụ iche ọzọ malite ikpughere ha ụfọdụ ihe ga-adakwasị ya.

Ọ sịrị ha, “Lee, anyị na-agbago Jerusalem, n’ebe ahụ, a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndịisi nchụaja na ndị odeakwụkwọ, ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, rara ya nye n’aka ndị mba ọzọ; Ndị a ga-eme ya ihe ọchị, bụọ ya asụ, pịa ya ụtalị, gbukwaa ya, ma mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ ga-esikwa n’ọnwụ bilie”.

E mechaa Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, were bịakwute Jesu, sị ya, “Onyenkuzi, anyị na-achọ ka i meere anyị otu ihe anyị ga-arịọ gị”. Jesu jụrụ ha sị, “Gịnị ka ụnụ chọrọ ka m meere ụnụ?”

Ha sịrị ya, “Biko, kwee ka anyị nọdụ, otu n’aka nri gị, otu n’aka ekpe gị, mgbe ọbụla ị ga-anọdụ n’ocheze gị”. Ma Jesu sịrị ha, “Ụnụ amaghị ihe ụnụ na-arịọ. Ụnụ nwere ike ịñụ iko m ga-añụ, mọbụ kwe ka e mee ụnụ ụdị mmirichukwu ahụ nke a ga-eme m?”

Ha zara ya, “Anyị nwere ike” Jesu sịrị ha, “Iko nke m ga-añụ ka ụnụ ga-añụ, mmirichukwu nke a ga-eme m ka a ga-emekwa ụnụ. Ma, ọ bụghị m ga-ekpebi onye ga-anọ n’aka nri m mọbụ n’aka ekpe m. Kama ọnọdụ ahụ dịịrị ndị niile a kwadebeere ya”.

Mgbe ụmụazụ Jesu mmadụ iri ọzọ nụrụ maka arịrịọ ụmụnne abụọ ahụ, iwe jupụtara ha obi n’ebe Jemis na Jọn nọ. Ma Jesu kpọkọtara ha ọnụ sị ha, “Ụnụ amarala na n’etiti ndị ọgọ mmụọ ndị kwesịrị ịchị ha na-achị ọchịchị nchịgbu.

Ndị nnukwu mmadụ ha na-egosịkwa na ha ji ike ọchịchị. Ma ọ gaghị adị otu a n’etiti ụnụ. Kama onye ọbụla ga-abụ onye ukwu n’etiti ụnụ ga-abụrịrị nwodibo ụnụ.

Onye ọbụlakwa nke ga-abụ onye mbụ n’etiti ụnụ ga-abụrịrị ohu ụnụ niile. N’ihina Nwa nke mmadụ bịakwara, ọ bụghị ka a gbaara ya odibo, kama ka ọ bụrụ odibo, werekwa ndụ ya nye maka mgbapụta ọtụtụ mmadụ”.

Igbo Mass Readings for May 27 2027, Tọọzde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for May 26 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.