Igbo Mass Readings for December 16 2026, Wednezde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 16 2026, Wednezde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 45:6-8, 21-25

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Abụ m Yahweh, e wezuga m enweghị chi ọzọ dị nụ; ana m echekwa gị n’agbanyeghị na ị maghị m. Ka ndị mmadụ wee mara na site n’ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya na o nweghị onyeọzọ ma ewepụ m, abụ m Yahweh, e nweghị onye ọzọ.

Ọ bụ m na-enye ìhè ma na-eweta ọchịchịrị. Ọ bụ m na-enyekwa ngọzi, na-eweta ọdachi. Ọ bụ m bụ Yahweh na-eme ihe ndị a niile.

Ka eluigwe zodata mmeri dịka igirigi, ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri, ka ala meghee, ka nzọpụta topụta, ka o mee ka ikpe nkwụmọtọ topụtakwa, mụ bụ Yahweh ekeela ya. Nke a ka Yahweh kwuru, onye kere eluigwe, ya bụ Chineke, onye kere ụwa, ya kwụbara ya; o keghị ya ka ọ bụrụ ebe ọgbaaghara.

O kere ya ka ọ bụrụ ebe obibi. A bụ m Osebụrụwa, enweghị chi ọzọ. Bịakwutenụ m ka ụnụ nwee nzọpụta, nsọtụ niile nke ụwa!

Abụ m Chineke e nweghị chi ọzọ. Ejirila m onwe m ñụọ iyi, okwu si m n’ọnụ bụ eziokwu, okwu na agaghị alaghachi n’ebe m nọ. Ikpere niile ga-esekpuru m, ire niile ga-añụ iyi.’

E kwuru sị, ‘Sọọsọ na Yahweh ka mmeri na ike si bịa.” Ndị niile na-ebuso ya agha ga-eji ihere bịakwute ya. Mmeri na otito nke si n’aka Chineke ga-adịrị agbụrụ niile nke Izrel.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 85:9-10. 11-12. 13-14.

Azịza: Ka eluigwe zodata mmeri dịka igirigi, ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri.

1. Ana m ege ntị n’ihe Chineke Onyenweanyị na-ekwu,

ihe ọ na-ekwu bụ udo maka ndị nke ya.

N’ezie, nzọpụta ya dị nsọ maka ndị na-atụrụ ya egwu.

Ka ebube ya wee nogide n’ala anyị.

Azịza: Ka eluigwe zodata mmeri dịka igirigi, ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri.

2. Ịhụnanya na eziokwu amakụọla,

eziomume na udo ebiela ọma

Irubeisi ga-esi n’ala pulite,

eziomume ga-esi n’elu ledata anya.

Azịza: Ka eluigwe zodata mmeri dịka igirigi, ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri.

3. Ee, Onyenweanyị ga-enye anyị ọganiihu,

ala anyị ga-amịta mkpụrụ, bawanye.

Eziomume ga-aga n’ihu ya,

udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya.

Azịza: Ka eluigwe zodata mmeri dịka igirigi, ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri.

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Welie olu gị tisie mkpu ike; Osebụrụ Chineke anyị ji ike abịa.

ALLELUỊA.

OZIỌMA – 7:18-23

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jọn kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, zipụ ha ka ha ga jụọ Dinwenụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịanụ, ka anyị ga-ele anya onye ọzọ?”  

Mgbe ndị ahụ bịakwutere Jesu, ha sịrị, “Jọn onye na-eme mmirichukwu ziri anyị bịa jụta gị ma ọ bụ gị bụ onye ahụ e kwuru na ọ ga-abịa, ka anyị ga-ele anya onye ọzọ?”

N’oge elekere ahụ, Jesu gwọrọ ọtụtụ mmadụ ọrịa dị iche iche, ọ chụpụtakwara mmụọ ọjọọ n’ahụ ndị ha ji, meekwa ka ọtụtụ ndị isi hụ ụzọ.

Ọ zara ha sị, “Gaanụ gwa Jọn ihe ụnụ hụrụ na ihe ụnụ nụrụ: ndị isi na ahụ ụzọ, ndị ngwọrọ na-aga ije, a na-eme ndị ekpenta ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe; a na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, a na-akụziri ndị ogbenye oziọma. Ngọzi na-adịrị onye ọbụla nke  na-agaghị aghọtahie m.”

Igbo Mass Readings for December 17 2026 – Tọọzde

Igbo Mass Readings for December 16 2026, Wednezde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.