Igbo Mass Readings for May 7 2025, Wenezde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 7 2025, Wenezde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:1-8

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

N’oge ahụ oke ogbugbu ndị kwerenụ dakwasịrị ndị otu Kristi dị na Jerusalem. Ndị niile kwere na Kristi ma e wepụ ụmụazụ gbasara n’ala Judia na Sameria niile.

Ụfọdụ ụmụnwoke na-atụ egwu Chineke liri Stivin, ruoro ya uju nke ukwu. Sọl gbara mbọ nke ukwu ime ka nzukọ Kristi daa. Ọ na-aba n’ụlọ ndị mmadụ n’otu n’otu na-akpụpụta ndị kwere ekwe, ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, na-atụba ha n’ụlọ mkpọrọ.

Ugbu a, ndị ahụ kwere na Kristi, ndị si na Jerusalem gbasachaa, jegharịrị ebe niile, na-agbasa okwu Chineke. Filip gara n’otu obodo dị na Sameria gwa ha maka Kristi.

Igwe ndị obodo ahụ nabatara ozi Filip mgbe ha nụrụ ma hụkwa ihe ịrịbaama dị iche-iche o mere. Ọtụtụ mmụọ ọjọọ si n’ahụ ndị ha ji pụta, were oke olu na-eti mkpu.

O mekwara ka ahụ dị ọtụtụ mmadụ mma, ma ndị akụkụ ahụ ha nwụrụ anwụ ma ndị dara ngwọrọ. Nke a wetara oke ọñụ n’obodo ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 66:1-3, 4-5, 6-7.

Azịza: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọñụ.

1. Tikuenụ Chineke mkpu ọñụ, ụwa niile,

tierenụ aha ya dị otito egwu,

jirinụ ịja mma ụnụ nye ya otito.

Sịnụ Chineke, lee ka I si dị oke egwu!

Azịza: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọñụ.

2. Ụwa niile na-akpọ isiala nye gị,

na-akụrụ gị egwu,

na-akụ egwu na-asọpụrụ aha gị.

Bịa lee ọrụ ịtụnaanya Chineke rụrụ,

O kwesịrị ịtụ egwu n’ihi ọrụ ya n’etiti ụmụ mmadụ.

Azịza: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọñụ.

3. O mere ka osimiri ghọọ ala kpọrọ nkụ,

ha ji ụkwụ gafee osimiri ahụ!

N’ihi ya ka anyị ñụrịa n’ime ya.

Onye ji ike ya achị mgbe ebighịebi.

Azịza: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọñụ.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Kristi ebiliela ma chakwasịkwa anyị, ndị O ji ọbara Ya wee gbapụta.

ALLELUUIA.

OZIỌMA – 6:35-40.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Abụ m achịcha nke ndụ; onye na-abịakute m agụụ agaghị agụ ya, onye na-ekwerekwa na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.

Ana m agwa ụnụ, na ụnụ ahụla m, mana ụnụ ekweghị. Onye ọbụla Nna m na-enye m, ga-abịakwute m. Agaghị m achụpụkwa onye ọbụla nke na-abịakwute m.

N’ihi na-esighị m n’eluigwe bịa ime uche m, kama ọ bụ ime uche onye zitere m. Nke a bụ uche nke onye zitere m, ka m ghara ịtụfu ihe ọbụla n’ime ihe niile o nyere m, kama ka m mee ka ha si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ.

Nke a bụ uche nke Nna m, ka onye ọbụla hụrụ Nwa ahụ ma kwerekwa na ya, nwee ndụ ebeebe. Aga m akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.

Igbo Mass Readings for May 8 2025, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 7 2025, Wenezde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.