Igbo Mass Readings for January 28 2026, Wenezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 28 2026, Wenezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:4-17

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke Samuel

Ma n’abalị ụbọchị ahụ, Yahweh ziri Natan sị, “Jee gwa odibo m, bụ Devid, na m sị ya, ‘Ọ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ ebe m ga-ebi? Site n’oge m siri n’ljipt kpọpụta ụmụ Izrel ruo taa, o nwebeghị oge m biri n’ụlọ, kama ana m ebigharị n’ụlọikwu ka onye ije.

Oge niile m so ndị Izrel na-ejegharị, o nweela mgbe jụrụ onye ọbụla n’ime ndị ndu ha niile m họpụtara, ihe mere o jibeghị wuru m ụlọ osisi sida.’ Ya mere, jee gwa odibo m bụ Devid, na mụ bụ Chineke nke igwe ndị agha, esiri m ebe ị na-azụ atụrụ n’ọhịa kpọpụta gị mekwaa ka ị bụrụ onyendu ndị nke m bụ Izrel.

Anọnyekwaara m gị ebe ọbụla i jere, merikwaa ndị iro gị niile nihu gị. Aga m emekwa ka aha gị dị ukwu dịka ndị aha ha kacha dị ukwuu. Aga m ahọpụtara ndị nke m bụ Izrel otu ebe, kụọkwa ha dịka osisi n’ebe ahụ.

Ha ga-ebikwa n’ebe ahụ na-enweghị nsogbu ọzọ; ndị obi ọjọọ agaghị akpagbukwa ha ka na mbụ, bido mgbe m họpụtaara ndị nke m Izrel ndịikpe; aga m enye ha ezumike site n’aka ndịiro ha. Aga m eme ka ị dị ukwuu, aga m ewuru gị ụlọ.

Mgbe ị nwụrụ, elie gị ebe e liri nna gị ha, aga m eme ka otu n’ime ụmụ gị ndị nwoke bụrụ eze. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. Ya onwe ya bụkwa onye ga-ewuru m ụlọnsọ. Aga m emekwa ka ọchịchị ya dị ebeebe. Aga m abụ nna ya; ọ ga-abụkwa nwa m.

Mgbe ọbụla o mere ihe ọjọọ, aga m enye ya ahụhụ dịka nna sị adụ nwa ya ọdụ site n’inye ya ahụhụ. Ma agaghị m ahapụ ịnọnyere ya dịka m si kwụsị ịnọnyere Sọl, bụ onye m wepụrụ ka ị wee bụrụ eze.

Ezinụụlọ gị na alaeze gị ga-adị ebeebe. Aga m akwụdosị ocheeze gị ike ebeebe. Natan gwara Devid ihe niile Chineke kpughere ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 110:1, 2, 3, 4.

Azịza: Aga m ahụ ya n’anya ebeebe.

1. Mụ na onye m họọrọ agbaala ndụ,

añụọrọla m Devid nwodibo m iyi.

Aga m eme ka ọchịchị gị dị ebeebe,

Aga m emekwa ka ocheze gị dịgide ruo na ndụdụgandụ niile.

Azịza: Aga m ahụ ya n’anya ebeebe.

2. ọ ga-ebeku m sị, “ị bụ nnam,

Chineke m na onye enyemaka m”.

Aga m eme ya nwa mbụ m,

Bulie ya elu karịchaa eze niile dị n’ụwa.

Azịza: Aga m ahụ ya n’anya ebeebe.

3. Aga m ahụ ya n’anya ebeebe,

ọgbụgbandụ mụ na ya ga-adị ọkpụ

ọchịchị ya ga-adị ebeebe,

Ocheeze ya ga-adịgide dịka eluigwe.

Azịza: Aga m ahụ ya n’anya ebeebe.

MBEKU

Alleluia, Alleluia.

Kwuwe Onyenwe m, nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluia.

OZIỌMA – 4:1-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere,

Jesu malitekwara ọzọ ikuzi ihe n’akụkụ osimiri Galili. Oke igwe mmadụ gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere n’ụgbọmmiri, wee nọdụ ala n’ime ya, n’elu mmiri. Igwe mmadụ niile ahụ guzoro n’ala n’akụkụ mmiri. O jiri ụkabụilu dị icheiche kuziere ha ọtụtụ ihe.

Na nkụzi ya, ọ sị ha; “Geenụ ntị! Onye ọgha mkpụrụ gara n’ubi ịgha mkpụrụ; ka ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, ụmụnnụnụ abịa tụtụrịa ha. Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ala okwute ebe ha na-enweghị aja buru ibu. Ngwangwa mkpụrụ ahụ pulitere, n’ihina ha enweghị aja miriemi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha chanwụrụ ma kpọnwụkwaa n’ihina ha enweghị mgbọrọgwu miriemi.

Mkpụrụ ụfọdụ dara n’etiti ogwu, ogwu wee tolite, kpagbuo ha; ha amịtaghị mkpụrụ ọbụla. Mkpụrụ ndị ọzọ dara n’ala dị mma, wee puo, topụta, mịkwaa mkpụrụ, ụfọdụ mịtara iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ otu narị”.

Na mmechi, ọ sịrị ha, “Onye nwere ntị ịnụ ihe ya nụrụ”. Ma mgbe naanị Jesu nọ, ndị na eso ụzọ ya na ụfọdụ ndị gbara ya gburugburu rịọrọ ya ka ọ kọwaara ha ihe banyere ụkabụilu ya. Ọ sịrị ha, “Ụnụ ka e nyere ike ịghọta na ịkọwa ihe banyere ihe omimi nke alaeze Chineke, mana ebe ndị ọzọ nọ, ihe niile bụ n’ụkabụilu.

Ka ha wee hụ ghara ịhụta, Ka ha wee nụ ghara ịghọta, Ka ha ghara ịtụgharị obi ma nwee mgbaghara”. Jesu jụkwara ha sị,”Ọ bụ na ụnụ aghọtaghị ụkabụilu a? Olee otu ụnụ ga-esi aghọta ụkabụilu ndị ọzọ? Ọgha mkpụrụ na-agha okwu ahụ.

Mkpụrụ ndị dara n’akụkụ ụzọ pụtara ndị a gwara okwu ahụ, mgbe ha nụrụ ya, ngwangwa Ekwensu bịara wepụ okwu nke a kụrụ n’obi ha. Otu aka ahụkwa, mkpụrụ ndị dara n’ala okwute bụ ndị ji ọñụ nara okwu Chineke mgbe ha nụrụ ya.

Ma ebe ọ bụ na okwu ahụ agbaghị mgbọrọgwụ n’obi ha, ọ nọrọ ntakịrị oge. Mgbe mkpagbu mọbụ nsogbu bịara n’ihi okwu ahụ ha na-esi n’okwukwe ha adapụ. Mkpụrụ ndị dara n’etiti ogwu bụ ndị nụrụ okwu Chineke, ma nchegbu na nchekasị nke ụwa a na oke ọchịchọ nke ihe ndị ọzọ abanye ha n’obi kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.

Ma ndị a ghara n’ala dị mma bụ mmadụ ndị nụrụ okwu ahụ, nabatakwa ya ma mịa mkpụrụ: ụfọdụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ otu narị.

Igbo Mass Readings for January 29 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 28 2026, Wenezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.