Igbo Mass Readings for September 2 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 2 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Ma mụ onwe m, ụmụnna m agaghị agwa ụnụ okwu dịka ndị Mmụọ Nsọ na-achị kama dịka ndị anụahụ na-achị, dịka ụmụntakịrị na Kristi.

Ihe m jiri zụọ ụnụ bụ mmiri ara, ọ bụghị nri siri ike n’ihina ụnụ etozubeghị maka ya; ọ bụladị ugbu a, ụnụ etozubeghị maka ya. N’ihina anụahụ ka na-achị ụnụ.

Ebe ekworo na esemokwu ka dị n’etiti ụnụ, ọ bụ na ụnụ abụghị ndị anụahụ na-achị, ndị na-ebi ndụ ka ndịọzọ?

Mgbe otu onye n’ime ụnụ na-asị, “Abụ m nke Pọl,” Onyeọzọ asị, “Abụ m nke Apọlọs,” omume ụnụ na-eme ọ bụghị dịka nke mmadụ nkịtị ndịọzọ? Ma gịnị ka Apọlọs bụ?

Gịnị ka Pọl bụkwa? Anyị bụ naanị ụmụodibo Chineke ndị ụnụ si n’aka ha kwere na Chineke. Onye ọbụla n’ime anyị na-arụ ọrụ nke Onyenweanyị tinyere ya n’aka.

Mụ onwe m kụrụ mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke mere ka o too. Ma onye kụrụ mkpụrụ ma onye gbara ya mmiri adịghị oke mkpa. Kama onye kachasị bụ Chineke onye na-eme ka ihe niile too.

O nweghị ihe dị iche n’etiti onye kụrụ mkpụrụ na onye gbara ya mmiri. Chineke ga-akwụ onye ọbụla n’ime ha dịka ọrụ ya si dị.

N’ihina anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ; ụnụ bụ ala ubi nke Chineke na ụlọ ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33:12-13, 14-15, 20-21

Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.

1. Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha,

ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya

Chineke si n’eluigwe eledata anya

Ọ na-ahụ ụmụ mmadụ niile.

Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.

2. O si n’ebe Ọ nọ na-ele anya

Na-ele ndị niile bi n’ụwa anya

Onye nke mere obi mmadụ niile

Na-agbakọkwa ihe niile ha na-eme.

Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.

3. Mkpụrụobi anyị na-eche Onyenweanyị,

Ya bụ onye enyemaka anyị na onye ogbugbo anyị

Mkpụrụobi anyị na-añụrị n’Onyenweanyị,

n’ihina anyị tụkwasịrịobi n’aha ya dị nsọ.

Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.

MBEKU – Ps. 119:88

Alleluia, Alleluia:        

Zọpụta m, Onyenweanyị ka m wee nwee ike idobe iwu gị.

Alleluia

OZIỌMA – 4:38-44

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu hapụrụ ụlọnzukọ banye n’ụlọ Saịmọn. Ugbu a oke ahụọkụ jidesiri ọgọ nwaanyị Saịmọn ike nke mere ha ji gwa Jesu maka ya.

O guzooro ebe nwaanyị ahụ nọ baara ahụọkụ ahụ mba o wee hapụ ya. Ngwa ngwa nwaanyị ahụ biliri, lee ha ọbịa. Mgbe anyanwụ na-ada, ndị niile nwere ndị ọrịa na ụdị ọrịa dị icheiche kpọkọtaara ha ya.

O bikwasa ha aka n’isi n’otu n’otu ahụ wee dị ha mma. Ọtụtụ Mmụọ ọjọọ sikwara n’ime ọtụtụ ndị mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, Ị bụ Nwa Chineke!” Ma Ọ gbọjara ha.

O kweghịkwa ka ha kwuo okwu n’ihina ha matara na ọ bụ Kristi ahụ. Mgbe chi foro, Jesu siri n’obodo ahụ pụọ gaa nọrọ naanị ya n’ebe dara jụụ.

Ndị mmadụ chọgharịrị ya, mgbe ha chọtara ya, ha achọghị ka O si n’obodo ha pụọ. Ọ sịrị ha, “Aga m agbasakwurịrị oziọma nke alaeze Chineke n’obodo ndị ọzọkwa, n’ihina ọ bụ maka nke a ka e jiri zite m.” Ọ gakwara n’ihu na agbasa oziọma n’ụlọnzukọ niile nọ na Judia.

Igbo Mass Readings for September 3 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for September 2 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.