Igbo Mass Readings for September 17 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 17 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:14-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara Timoti
Enwere m nchekwube na-aga m abịa ngwangwa ileta gị, ma ana m edere gị akwụkwọ ndụmọdụ nke a ka ọ ga-abụ, ọ bụrụ na m nọọ ọdụ ịbịa ị ga-ama otu mmadụ kwesịrị isi mee omume n’ezinụụlọ nke Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, bụrụkwa ide na ntọala nke eziokwu.
N’ikwu eziokwu, ihe anyị na-ekwupụta bụ nnukwu iheomimi dị n’okpukpe anyị. Chineke mere ka onye ahụ pụta ihe n’anụ ahụ, Ọ gụrụ ya n’onye eziomume n’ime mmụọ,
O mere ka ndị mmụọọma hụ ya anya; E kwusara ya na mba niile, Onye ụwa niile kwere na ya, E buliri ya elu n’otito.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 111: 1-2, 3-4, 5-6
Azịza: Lee ka ọrụ niile nke Onyenweanyị siri jupụta n’otito na ebube
1. Alleluia! Eji m obi m niile enya Onyenweanyị ekele,
N’ọgbakọ ndị eziomume
Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnaanya,
Ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya.
Azịza: Lee ka ọrụ niile nke Onyenweanyị siri jupụta n’otito na ebube
2. Ọrụ niile ọ na-arụ jupụtara n’otito na ebube,
Eziomume ya enweghị ike ịgbanwe agbanwe
Ọ na-ekwe ka anyị na-echeta ọrụ ebube ya
Onyenweanyị dị ebere, dịkwa obiọma.
Azịza: Lee ka ọrụ niile nke Onyenweanyị siri jupụta n’otito na ebube
3. Ọ na-enye ndị na-atụrụ ya egwu nri;
Ọ na-echetara ndị nke ya ike ọ na-akpa
Site n’inye ha oke mba ndịọzọ.
Azịza: Lee ka ọrụ niile nke Onyenweanyị siri jupụta n’otito na ebube
MBEKU – Kol 3:16,17
Alleluia, Alleluia:
Werenụ abụọma na ukwe nke mmụọ kweere Chineke ukwe ekele n’obi ụnụ.
Alleluia
OZIỌMA – 7:31-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu kwuru sị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere ọgbọ a, olee ihe ha dị ka ya? Ha dịka ụmụntakịrị nọ n’ime ahịa, na-akpọ ibe ha oku sị, “Anyị gbuuru ụnụ ụja, ma ụnụ a gbaghị egwu, anyị tikuru ụnụ mkpu akwa, ma ụnụ ebeghị akwa.
N’ihina Jọn onye na-eme mmirichukwu bịara n’erighị ihe ndị ọzọ na-eri na-añụghịkwa mmanya, ụnụ wee sị, “O nwere mmụọ ọjọọ!”
Nwa nke mmadụ ahụ abịakwala na-eri ihe oriri na-añụkwa ihe ọñụñụ, ụnụ sị, “Leenụ onye oke afọ na onye añụrụma, enyi ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ! Ma amamihe ziri ezi dị n’ebe ụmụ ya nọ.”
Igbo Mass Readings for September 17 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.