Igbo Mass Readings for September 16 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 16 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:31-13:13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Ya mere, werenụ obi na-anụ ọkụ chọọ onyinye amara ndị dị elu karịa ndị a. Ma ugbu a, aga m egosikwa ụnụ ụzọ nke kacha mma.
Ọ bụrụ na m na-asụ n’olu dị icheiche, nke ndị mmadụ na nke ndị mmụọọma, ma enweghị ịhụnaanya, abụ m ogene na-eme naanị mkpọtụ, mọbụ mbadamba efere egwu na-ada ụda.
A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, matakwa ihe omimi niile na ihe ọmụma niile, a sịkwa na enwere m ụdị okwukwe ahụ nke pụrụ ibupu ugwu, ma enweghị m ịhụnaanya, abụghị m ihe ọbụla.
Ọ bụrụ na m enye ihe niile m nwere, a sịkwa na m weere ahụ m nye ka a kpọọ ọkụ, ka e wee too m, ma enweghị ịhụnaanya, ọ baraghị m uru ọbụla.
Ịhụnaanya nwere ndidi na obiọma. Ịhụnaanya adịghị ekwo ekworo, mọbụ na-anya isi. Ọ naghị afụli onwe ya elu, mọbụ akpa agwa onye a zụghị azụ.
Ọ naghị achọ naanị uche ya. Ọ naghỊ enwe mgbakasị ahụ mọbụ ewe oke iwe. Ịhụnaanya adịghị añụrị n’ihe ọjọọ, kama ọ na-añụrị n’eziokwu.
Ịhụnaanya na-edi ihe niile, na-ekwe ihe niile, na-echekwube ihe niile, na-enwe ogologo ntachiobi n’ihe niile. Ịhụnaanya enweghị njedebe.
Ibu amụma ga-agafe, ịsụ n’olu ga-akwụsị. Ihe mmụta niile ga-agafekwa. N’ihina ọmụma ihe anyị ezughịkwa oke. Ibu amụma anyị ezughị oke.
Ma mgbe ihe zuru oke bịara, ihe ezughị oke ga-ala. Mgbe m bụ nwata, ana m ekwu okwu ka nwata, ana m eche echiche ka nwata, na-atụgharịkwa uche ka nwata, ma oge m bụụrụ okenye, ahapụrụ m omume ụmụaka.
Ugbu a, anyị na-ahụ ihe niile n’onyinyo ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihe niile n’ihu n’ihu. Ugbu a, ama m na mpekere, ma mgbe ahụ, aga m aghọta n’uju dịka Chineke mazuru ihe banyere m.
Ihe atọ ndị a na-anọgide: okwukwe, nchekwube na ịhụnaanya, ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnaanya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33:2-3, 4-5, 12, 22
Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya
1. Werenụ ụbọ akwara too Chineke;
Werenụ une kụọrọ ya egwu
Kweerenụ Chineke ukwe ọhụrụ
Werenụ ike ụnụ niile kweere Onyenweanyị ukwe mmeri.
Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya
2. N’ihina okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu
Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile.
Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya,
ịhụnaanya ya jupụtara n’ụwa.
Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya
3. Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha,
ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya.
Ka ịhụnaanya gị dị n’ebe anyị nọ, O Chineke
ebe nchekwube anyị dị na gị.
Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya
MBEKU – Kol 3:16,17
Alleluia, Alleluia:
Werenụ abụọma na ukwe nke mmụọ kweere Chineke ukwe ekele n’obi ụnụ.
Alleluia
OZIỌMA – 7:31-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu kwuru sị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere ọgbọ a, olee ihe ha dị ka ya? Ha dịka ụmụntakịrị nọ n’ime ahịa, na-akpọ ibe ha oku sị, “Anyị gbuuru ụnụ ụja, ma ụnụ a gbaghị egwu, anyị tikuru ụnụ mkpu akwa, ma ụnụ ebeghị akwa.
N’ihina Jọn onye na-eme mmirichukwu bịara n’erighị ihe ndị ọzọ na-eri na-añụghịkwa mmanya, ụnụ wee sị, “O nwere mmụọ ọjọọ!”
Nwa nke mmadụ ahụ abịakwala na-eri ihe oriri na-añụkwa ihe ọñụñụ, ụnụ sị, “Leenụ onye oke afọ na onye añụrụma, enyi ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ! Ma amamihe ziri ezi dị n’ebe ụmụ ya nọ.”
Igbo Mass Readings for September 17 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for September 16 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.