Igbo Mass Readings for October 7 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 7 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-2,7-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl degaara ndi Galatia

Mgbe afọ iri na anọ gachara, mụ na Banabas gaghachiri Jerusalem, akpọrọkwara m Taịtus jee. Agara m site na mkpughe nke Chineke. Mgbe anyị zukọrọ na nzukọ, egosịrị m ndị kwesịrị ntụkwasịobi n’etiti ndị mba ọzọ oziọma ahụ nke m na-ekwusa.

Emere m otu a n’ihina achọghị m ka ọrụ m rụrụ n’oge gara aga mọbụ nke m na-arụ ugbu a bụrụ ihe efu. Ma n’aka nke ọzọ, ha hụrụ na Chineke nyere m ọrụ izisa oziọma n’etiti ndị e bighị ugwu; dịka o nyere Pita ọrụ izisa oziọma n’etiti ndị e biri ugwu.

(N’ihi-na onye siri n’aka Pita rụọ ọrụ izisa oziọma n’etiti ndị e biri ugwu sikwa n’ime m rụọ ọrụ izisara ndị mba ọzọ). Ma mgbe ha hụrụ amara nke e nyere m, Jemis, Pita (Sefas) na Jọn ndị a na-asọpụrụ dịka ogidi, nyere mụ na Banabas ntụziaka nke ndị kwerenụ ịga n’ihu n’ọrụ ikwusa oziọma n’etiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha gakwaa n’ihu ịrụ ọrụ nke ha n’etiti ndị e biri ugwu.

Naanị otu ihe ha chọrọ bụ ka anyị cheta ndị ogbenye, bụ nke m ji ịnụọkụ n’obi na-eme. Mgbe Pita (Sefas) bịaruru Antiọk agwara m ya okwu n’ihu, n’ihina ihe o mere adịghị mma.

Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, Pita na ndị mba ọzọ na-eriko nrị; ma mgbe ha rutere, Pita wepụrụ aka na nri, laghachi azụ, n’ihina egwu ndị Juu na-atụ ya.

Ndị Juu ndịọzọ ya na ha nọ sooro ya mee omume ihuabụọ a. Banabas n’onwe ya sokwara ha mee otu a. Ma mgbe m hụrụ na ha emeghị omume kwụọtọ banyere eziokwu nke oziọma ahụ, agwara m Sefas n’ihu ha niile sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 117:1,2

Azịza: Gaanụ n’ụwa niile; kwusaaranụ ihe niile e kere eke oziọma

1. Toonụ Onyenweanyị mba niile

Toonụ ya ndị mmadụ niile.

Azịza: Gaanụ n’ụwa niile; kwusaaranụ ihe niile e kere eke oziọma

2. N’ihina ịhụnaanya ya siri ike

nkwụdosiike ya na-adị ọkpụ.

Azịza: Gaanụ n’ụwa niile; kwusaaranụ ihe niile e kere eke oziọma

MBEKU – Ps 130: 5

Alleluia, Alleluia:

Ana m eche Onyenweanyị, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.

Alleluia

OZIỌMA – 11:1-4

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu nọ n’otu ebe na-ekpe ekpere. Mgbe ọ kwụsịrị otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya sị, “Onyenweanyị kuziere anyị ka e si ekpe ekpere dịka Jọn si kuziere ndị na-eso ụzọ ya.”

Ọ sịri ha, “Mgbe ọbụla ụnụ na-ekpe ekpere, sịnụ: “Nna, ka otito dịrị aha gị, ka ọchịchị gị bịa, nye anyị taa, nri nke ụbọchị anyị. Gbaghara anyị mmehie anyị niile dịka anyị siri gbaghara ndị mehiere anyị. Ekwela ka anyị kwenye na nranye ma zọpụta anyị n’ajọ ihe.”

Igbo Mass Readings for October 8 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for October 7 2026, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.