Igbo Mass Readings for October 15 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 15 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

N’ihi nke a, gị bụ mmadụ, onye ọ sọrọ gị bụrụ, Ị nwegịi ngọpụ mgbe ị na-ama onyeọzọ ikpe. N’ihina mgbe ọbụla ị na-ama onyeọzọ ikpe ma gị onwe gị nọ na-eme ihe ahụ, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe.

Anyị ma na o ziri ezi mgbe ikpe Chineke na-adakwasa ndị na-eme ihe ndị dị otu a. Gị bụ mmadụ, gịnị mere I ji ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe, mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ?

I chere na ị ga-agbanahụ ikpe Chineke? Ihe I ji eleli eziomume anya ọ bụ n’ihina Chineke nwere oke obiọma, obi nnagide na ndidi? Ọ bụ na ị maghị na ihe Chineke ji emere gị ebere bụ ka o wee duba gị na nchegharị?

Site n’obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke n’ụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi. Chineke ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya niile si dị.

Ndị ji ndidi nọgide n’eziomume, na-achọ otito, na nsọpụrụ n’anwụghị anwụ ka Chineke ga-enye ndụ ebighịebi. Mana ndị ahụ na-ebute ịkpaoke, ndị jụrụ ikwenye n’eziokwu ahụ, ma na-eso ụzọ ajọomume, ka Chineke ga-awụkwasa iwe na ọnụma.

Mkpagbu na ihe mgbu ga-adịrị mmadụ niile ndị na-eme ihe ọjọọ, mbụ ọ ga-adịrị ndị Juu; e mechaa ọ ga-adikwara ndị mba ọzọ. Chineke ga-enye ndị niile na-eme iheọma otito, nsọpụrụ na udo; mbụ, Ọ ga-enye ndị Juu; Ọ ga-emechaa nyekwa ndị mba ọzọ. N’ihina Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 62:2-3, 6-7,9

Azịza: Onyenweanyị gị n’onwe gị na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya si dị

1. Sọ na Chineke ka mkpụrụobi m nwere ezumike,

Nzọpụta m si n’aka ya abịa;

Ebe ọ bụ sọ ya bụ nkume m na nzọpụta m

ebe nchedo m enweghị m ike ịda.

Azịza: Onyenweanyị gị n’onwe gị na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya si dị

2. Sọ na Chineke ka obi m ga-ezuike

na ya ka olileanya m si abịa

Naanị ya bụ nkume m nzọpụta m,

Ebe ọ bụ ebe nchedo m enweghị m ike ịda.

Azịza: Onyenweanyị gị n’onwe gị na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya si dị

3. Na Chineke ka m chọtara ebe nchedo

Ndị mmadụ daberenụ na ya oge niile;

buterenụ ya mkpa ụnụ,

Chineke bụ ebe nchedo anyị.

Azịza: Onyenweanyị gị n’onwe gị na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya si dị

MBEKU – Ps. 95:8

Alleluịa, Alleluịa:

Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 11:42-46

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu kwuru sị, “Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị Farisii! Ụnụ na-enye onyinye ego na nke osisi na nke nkpa akwụkwọ dị icheiche, ma leghara ikpe nkwụmọtọ na ịhụnaanya nke Chineke anya.

Ihe niile ndị a ka ụnụ kwesịrị ime n’elegharaghị ndịọzọanya. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ, ndị Farisii! N’ihina ọ na-amasị ụnụ ịnọ n’oche kacha mma n’ụlọnzukọ niile na ịnara ekele pụrụ iche n’ọma ahịa.

Ahụhụ ga-adịrị ụnụ! N’ihina ụnụ dịka ili ndị na-apụtaghị ihe nke ndị mmadụ na-agafe n’elu ha n’amaghị na ha dị.”

Otu onye n’ime ndị ọkaiwu zara ya sị, “Onyenkuzi, mgbe Ị na-ekwu otu a, anyị sokwa na ndị Ị na-akparị. Jesu wee sị, “Ahụhụ ga-adịkwara ụnụ, ndị ọkaiwu!

N’ihina ụnụ na-ebo ndị mmadụ ibu dị arọ ma ụnụ onwe ụnụ adịghị emetụ ibu ahụ ọ bụladị otu mkpịsị aka ụnụ.”

Igbo Mass Readings for October 16 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for October 15 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.