Igbo Mass Readings for September 9 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 9 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:25-31
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Enweghị m ihe ọbụla Onyenweanyị nyere n’iwu banyere ụmụagbọọghọ na-enweghị di mọbụ ụmụokorobịa na-enweghị nwunye.
Ma aga m ekwu uche nke aka m na nke a, dịka onye kwesịrị ntụkwasịobi. Ana m eche na ọ ka mma, n’ihi ahụhụ ukwu ahụ nke dị nso ugbu a, ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya n’alụghị di mọbụ nwunye.
Ị lụọla nwaanyị? Achọla nkewa. Ma ọ bụrụ na ị lụbeghị, ejela ịchọ onye ịga-alụ. Ma ọ bụrụ na ị lụọ nwaanyị, ọ dịghị njọ.
Ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ na enweghị di alụọ di, ọ dịghịkwa njọ. Ma otu ọ dị, ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu n’ime ụwa.
Ọ ga-amasị m igbochiri ụnụ nsogbu ndị ahụ. Isi okwu m bụ nke a, ụmụnna m; oge fọdụụrụ anyị dị nkenke. Bido ugbu a gaba, ndị ji nwaanyị biri ka ndị na-ejighị.
Ndị na-eru ụjụ nọdụ ka ndị ihe anaghị ewute; ndị ihe na-agaziri nọrọ ka ndị anaghị añụrị. Ndị na-azụ ahịa, ha biri ka ọ bụghị ha nwe ihe ha zụtara.
Ndị na-agbaso akụnụụba na ihe ụtọ nke ụwa a, ha achọfela ya oke. N’ihina ọdịdị ụwa nke a bụ ihe na-agafe agafe.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 45:10-11,14, 15-16
Azịza: Gee ntị, ada m, chee ntị n’okwu m ma nụrụ.
1. Gee ntị, ada m, chee ntị n’okwu m ma nụrụ,
Chefuo ndị ala gị na ndị ụlọ nna gị
Mgbe ahụ ka onyeeze ga-ahụ gị na mma gị n’anya.
Ọ bụ ya bụ nna gị ukwu sọpụrụ ya.
Azịza: Gee ntị, ada m, chee ntị n’okwu m ma nụrụ.
2. Ada nke onyeeze yi uwe dị oke ọnụ
ya na ndị otu ya so na-abata n’ihu onyeeze.
Ụmụodibo ya ndị nwaanyị sokwa ya.
Azịza: Gee ntị, ada m, chee ntị n’okwu m ma nụrụ.
3. Ha ji nnukwu añụrị na-abata n’obi eze.
Ị ga-amụta ụmụ nke ga-anọchi anya ndị nnanna gị
Ị ga-eme ha ndị ọchịchị nke ụwa niile.
Azịza: Gee ntị, ada m, chee ntị n’okwu m ma nụrụ.
MBEKU – 1 Pita 1:25
Alleluia, Alleluia:
Okwu nke Onyenweanyị ga-adigide ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:20-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu lere ndị na-eso ụzọ ya anya sị, “Ngọzi na-adịrị ụnụ bụ ndị ogbenye, n’ihina alaeze Chineke bụ nke ụnụ. Ngọzi na-adịrị ụnụ ndị agụụ na-agụ ugbu a, n’ihina ụnụ ga-eriju afọ.
Ngọzi na-adịrị ụnụ ndị na-akwa akwa ugbu a, n’ihina ụnụ ga-achị ọchị. Ngọzi na-adịrị ụnụ mgbe ndị mmadụ na-akpọ ụnụ asị, mapụ ụnụ n’iwu, kparịkwaa ụnụ, mọbụ tee aha ụnụ unyi dịka ihe arụ, n’ihi Nwa nke mmadụ!
Ñụrịanụ ọñụ mgbe nke a mere wụlikwaanụ elu n’ọñụ, n’ihina ụgwọ ọrụ ụnụ buru ibu n’eluigwe; n’ihina otu a ka ndị nna ha mere ndị amụma.
Ma ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị ọgaranya, n’ihina ụnụ enwetala nkasịobi. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị afọ jurula ugbu a, n’ihina agụụ ga-agụ ụnụ.
Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị nọ n’ọchị ugbu a, n’ihina ụnụ ga-eru ụjụ beekwa akwa. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ mgbe mmadụ niile na-ekwu iheọma banyere ụnụ, n’ihina otu a ka ndị nna ha siri rafuo ndịamụma ụgha.”
Igbo Mass Readings for September 10 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for September 9 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.