Igbo Mass Readings for September 30 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 30 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-12, 14-16

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ nke Job

Job zara sị: “N’eziokwu ama m na ọ dị otu a, ma olee otu mmadụ ga-esi dịzu mma n’ihu Chineke?

Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka ya na ya gbaghaa okwu, onye ahụ apụghị ịza ya otu ugboro n’ime otu puku.

Ọ maara ihe, ike ya dị ebube, olee onye kpọchiri obi n’ebe ọ nọ ma nwee mmeri? Onye nke na-akwagharị ụwa n’ọnọdụ ya, ma mee  ka ide ya niile ma jijiji.

Onye na-etiri anyanwụ iwu, ọ hapụ ịwa, onye nke kpuchiri kpakpando ga. Onye ọ bụ naanị ya setịpụrụ eluigwe ma zọgidekwa ebilimmiri ụkwụ.

Onye nke mebere Bea na Ọrion, Plaịdes na ụlọ ọgbakọ nke ndịda. Onye na-eme nnukwu ihe nke karịrị nghọta na ihe dị ịtụnanya enweghị ịgụta ọnụ.

Lee, ọ na-esi n’ebe m nọ agafe, ma anaghị m ahụ ya. Ọ narịị agakwa ma amataghị m ya. Lee ọ na-apụnarị ihe n’ike, onye pụrụ igbochi ya?

Onye ga-ajụ ya: “Gịnị ka ị na-eme ihe a?” Kedụ ka m ga-esi zaghachi ya, ma kpachapụkwa anya n’okwu m?

Ọ bụ ezie na aka m dị ọcha ma apụghị m ịza ya okwu. Aga m arịọ ebere n’aka onye na-ebo m ebubo. Ọ bụrụ na m kpọkuo ya, ọ zam, agaghị m ekwere na ọ na-ege m ntị n’olu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 88:10-11, 12-13, 14-15

Azịza: Onyenweanyị mee  ka ekpere m ruo gị ntị

1. Ana m akpọku gị ụbọchị niile O Onyenweanyị

agbasapụrụla m gị aka m.

Ọrụ ebube gị niile ọ bụ maka ndị nwụrụ anwụ?

Mmụọ ha ọ ga-esi n’ili kulie too gị?

Azịza: Onyenweanyị mee  ka ekpere m ruo gị ntị

2. Onye na-ekwupụta ịhụnanya gị n’ime ili

Mọbụ ntụkwasịobi gị n’ala mmụọ?

Ndị nọ n’ime ili ha na-anụ maka ọrụ ebube gị niile

ndị e chezọrọ echezọ ha na-anụ maka eziomume?

Azịza: Onyenweanyị mee  ka ekpere m ruo gị ntị

3. Mana anọ m ebe a na-arịọ enyemaka gị

O Onyenweanyị na-ekpere m ụtụtụ niile!

Gịnị mere I jiri jụ m O Onyenweanyị?

Gịnị mere I jiri zonahụ m ihu gị?

Azịza: Onyenweanyị mee  ka ekpere m ruo gị ntị

MBEKU – 1 Sam 3;9; Jọn 6:69

Alleluịa, Alleluịa:

Kwuwe Onyenwe m, nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gị jị okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluịa.

OZIỌMA – 9:57-62

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya na-aga n’ụzọ, otu nwoke sịrị Jesu, “Aga m eso gị ebe ọbụla ị na-eje.”

Jesu asị ya, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụnnụnụ nke igwe nwekwara akwu, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-edobe isi.” 

Ọ gwara onyeọzọ sị, “So m.”  Ma onye ahụ sịrị, “Dinwenụ m, kwee ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”

Jesu sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie onwe ha. Ma gị onwe gị, gaa ka Ị kwusaa Alaeze Chineke.”

Onyeọzọ gwakwara ya sị, “Aga m eso gị Dinwenụ m, ma kwee ka m buru ụzọ gaa sị ndị nọ n’ụlọ m nọdụ mma.”

Jesu sịrị ya, “Onye ọbụla nke jidere ọgụ eji akọ ubi, ma anya atọ ya n’azụ, ekwesịghị alaeze nke Chineke.

Igbo Mass Readings for October 1 2026, Emume Nne anyị dị asọ Ezenwaanyị na Nne-Egwu nke Naịjiria

Igbo Mass Readings for September 30 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.