Igbo Mass Readings for October 22 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 22 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:12-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Ụnụ ekwela ka njọ na-achị eze n’ahụ ụnụ ọzọ, nke ga-eme ka ụnụ na-erubere agụụ nke anụahụ isi. Ụnụ enyefela ahụ ụnụ n’aka njọ ka ọ bụrụ ngwaagha nke ọrụ ọjọọ, kama nyefeenụ onwe ụnụ n’aka Chineke dịka ndị e siri n’ọnwụ kpọbata na ndụ.

Nyekwanụ ya ahụ ụnụ ka ọ bụrụ ngwaagha nke eziomume. Njọ agaghị achịkwa ụnụ ọzọ, ebe ụnụ anọghịkwa n’okpuru iwu kama n’okpuru amara Chineke. Gịnị kwa?

Anyị ga na-emehie n’ihina anyị anọghị n’okpuru iwu, kama n’okpuru amara Chineke? Chineke ekwela. Ọ bụ na ụnụ amaghị na ụnụ kwenye ife onye ọbụla dịka ohu, ụnụ abụrụla ohu ya n’ezie.

Ụnụ enweghị ike ịbụ ohu nke mmehie nke na-eduba n’ọnwụ, bụrụkwa ohu nke nrubeisi nke na-eduba n’oziomume. Ekele dịrị Chineke, na ụnụ ndị bụbu ohu nke njọ esila n’obi ụnụ nwee nrubeisi n’ozi ahụ nke a kụziiri ụnụ. A zọpụtara ụnụ n’ohu nke njọ ka ụnụ bụrụ ohu nke eziomume.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 124: 1-3, 4-6, 7-8

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị.

1. Ka Izrel kwuo sị:

A sị na Chineke anọnyeereghị anyị

Ha gaara elo anyị na ndụ

mụọ anyị ọkụ mgbe iwe were ha.

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị.

2. Ide mmiri gaara eri anyị,

ebili mmiri gaara ekpudo anyị,

Ngọzi dịrị Onyenweanyị, onye nke ekweghị

ka ndịiro anyị laa anyị n’iyi!

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị.

3. Anyị gbanarịrị ọnya ndịiro anyị kwere

dịka nnụnụ si agbapụ n’ọnya dinta,

ọ gbajiri ọnya ha,

anyị wee nwee ike gbalaga.

Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị Onye mere eluigwe na ala.

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị.

MBEKU – Ps. 119:135

Alleluịa, Alleluịa:

Mee  ka ihu gị chakwasị nwodibo gị ma kuziere m ime uche gị.

Alleluịa.

OZIỌMA – 12:39-48

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma matanụ nke a, ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matararị oge elekere onye ohi ga-abịa, ọ ga na-eche nche, ọ gaghị ahapụ ụlọ ya ka onye ohi gwupuo ya.

Ụnụ ga-adịkwa njikere n’ihina Nwa nke mmadụ na-abịa n’oge ụnụ atụghị anya.” Pịta jụrụ sị, “Dinwenụ ọ bụ naanị anyị ka I ji ụkabụilu a agwa okwu, ka ọ bụ maka onye ọbụla?”  

Ma Dinwenụ zara sị, “Onye bụ nwodibo ahụ kwesịrị ntụkwasịobi, nwekwaa uche, onye nke nna ya ukwu ga-enye ike ilekọta ezinụụlọn ya anya, ka ọ na-enye ha oke nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?

Ngọzi na-adịrị nwodibo ahụ onye, mgbe nna ya ukwu ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otu a.

N’ezie agwa m ụnụ, nna ya ukwu ga-eme ya onye nlekọta nke ihe niile o nwere. Kama, ọ bụrụ na nwodibo ahụ echee n’obi ya sị, Nna m ukwu anọọla ọdụ na mbata, wee bido iti ụmụodibo ndị nwoke na ndị nwaanyị ihe,

na-eri na-añụkwa, mmanya ana-egbu ya, nna ya ukwu ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya n’oge elekere ọ na-amaghị.

Ọ ga-ata ya ahụhụ, tinyekwa ya n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasịobi na-anọ. Odibo ahụ nke maara ihe nna ya ukwu na-achọ, mana ọ dịghị njikere ime ya,

o meghịkwa dịka ọchịchọ nna ya ukwu sị dị, ga-anata ọtụtụ ụtalị. Ma nwodibo nke na-amaghị ma mee ihe kwesịrị ịpịa ụtalị ga-enweta ụtalị olemole.

Onye ọ bụla nke e nyere ihe ukwu, a ga-achọkwa ihe ukwu n’aka ya; onye ndị mmadụ nyekwara  ihe ukwu n’aka, n’aka ya ka ha ga-achọ ihe nke kanụ.

Igbo Mass Readings for October 23 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for October 22 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.