Igbo Mass Readings for August 19 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 19 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 34:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel
Okwu nke Dinwenụ bịakwutere m sị, “Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị ncheatụrụ nke Izrel, buo amụma ma gwa ha sị, otu a ka Yahweh Chineke kwuru; Ahụhụ ga-adịrị ndị ncheatụrụ nke Izrel ndị nọ na-azụ onwe ha!
Ọ bụghị atụrụ ka ndị ncheatụrụ ga-azụ? Mana ụnụ na-eri abụba ha, ajị ahụ ha ka ụnụ na-eyi, ụnụ na-egbu ndị mara abụba n’agbanyeghị na ụnụ adịghị azụ atụrụ ndị a.
Ndị ahụ adịghị ike, ụnụ emeghị ka ha dị ike, ndị na-arịa ọrịa ụnụ agwọghịkwa ha, ndị ọkpụkụ ha gbajiri agbaji ụnụ elekọtaghị ha, ndị gbafuru ụzọ, ụnụ akpọghachighị ha azụ, ndị furu efu, ụnụ achọghị ha, kama naanị aka ike na mkpagbu ka ụnụ ji achị ha.
N’ihi ya ka ha jiri gbasaa maka ha enweghị onye ncheatụrụ, wee bụrụ nri nke ụmụanụ ọhịa. Ụmụatụrụ m wee gbasaa, ha gbafuru n’ugwu ukwu niile na n’elu ugwu nta niile, atụrụ m gbasara n’elu ụwa niile, ọ dịghịkwa onye na-ajụ ajụjụ banyere ha mọbụ onye na-achọ ha.
N’ihi ya ụnụ ndị ncheatụrụ nụrụnụ okwu nke Yahweh, ka mụ onwe m na-adị ndụ, Yahweh Chineke na-ekwu, n’ihina ụmụatụrụ m abụrụla ihe oriri nke ụmụanụ ọhịa, ebe ọ bụ na e nweghị onye ncheatụrụ;
ebe ọ bụ na ndị ọzụzụ atụrụ m achọgharịghị ụmụatụrụ m, kama ha na-enyeju onwe ha afọ ma hapụ igweatụrụ m ka agụụ gbuo ha, ụnụ ndị ncheatụrụ nụrụnụ okwu nke Dinwenụ: otu a ka Yahweh Chineke kwuru;
lee mụ onwe m ga-emegide ndị ncheatụrụ a, aga m ajụkwa ha ajụjụ banyere ụmụatụrụ m, aga m akwụsịkwa ha ịzụ atụrụ, ha agaghịkwa aga n’ihu ịzụ onwe ha.
Aga m azọpụta ụmụatụrụ m n’ọnụ ha, ka ha wee ghara ịbụruụ ha ihe oriri ọzọ. N’ihina otu a ka Yahweh Chineke kwuru: Lee mụ onwe m ga-ajụ ajụjụ banyere atụrụ m, aga m achọgharị ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 23:1-3, 3-4, 5, 6
Azịza: Chineke bụ Onyenche m Onweghị ihe m ga-achọ.
1. Chineke bụ onyenche m O nweghị ihe m ga-achọ
Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị
Ọ na-eduga m na mmiri
Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike.
Azịza: Chineke bụ Onyenche m Onweghị ihe m ga-achọ.
2. Ọ na-edu m n’ụzọ eziomume
n’ihi aha ya,
Ọbụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ
Egwu ọbụla agaghị atụ m,
i ji mkpara na ngu gị nọdebe m
Ọbụ ha na-enye m agbamume.
Azịza: Chineke bụ Onyenche m Onweghị ihe m ga-achọ.
3. Ị na-akwadoro m nri.
n’ihu ndịiro m
I teela isi m mmanụ,
iko m ejula n’ọnụ na-agbọtu.
Azịza: Chineke bụ Onyenche m Onweghị ihe m ga-achọ.
4. N’ezie obiọma na ebere ga na-eso m,
ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke
ebeebe ebeebe!
Azịza: Chineke bụ Onyenche m Onweghị ihe m ga-achọ.
MBEKU – Ps 145:13
Alleluia, Alleluia:
Alaeze gị ga-adị ebeebe, ọchịchị gị na-adị na ndụdụgandụ niile Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile, omume ya niile jupụtara n’obi ebere.
Alleluia
OZIỌMA – 20:1-16
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “N’ihina alaeze eluigwe dịka otu nwoke nwere ezinụụlọ nke pụrụ n’isi ụtụtụ igote ndị ọrụ ọ ga-etinye n’ugbo vaịn ya.
Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwubiri na ọ ga-akwụ ha otu dinarị n’ụbọchị, o zigara ha n’ubi ya. N’ihe dịka elekere itoolu ọ pụkwara hụ ndị ọzọ ebe ha guzo nkịtị n’ọma ahịa, Ọ sịrị ha, ‘Gabakwuonụ n’ugbo m aga m akwụ ụnụ ihe ọbụla ziri ezi.’ Ha wee gaba.
Ọ pụkwara n’elekere nke iri na abụọ na nke atọ, mekwaa otu ihe ahụ. N’ihe dịka elekere nke ise, ọ pụkwara hụ ndị ọzọ ka ha guzo nkịtị.
Ọ sịrị ha, ‘Gịnị mere ụnụ ji nọrọ nkịtị n’ebe a ụbọchị niile.’ Ha sịrị ya, ‘Ọ bụ n’ihina o nweghị onye goro anyị ọrụ. O wee sị ha, ‘Gabakwanụ n’ubi m.’
Mgbe o ruru na mgbede onye nwe ubi ahụ gwara odibo na-elekọtara ya ubi anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ, kwụọ ha ụgwọ, bido na ndị ikpeazụ ruo na ndị mbụ.
Mgbe ndị bịara ọrụ n’elekere nke ise pụtara, a kwụọ onye ọbụla n’ime ha otu dinarị. Mgbe ndị buru ụzọ bido ọrụ bịara ha chere na a ga-akwụ ha karịa.
Ma onye ọbụla n’ime ha natara otu dinarị dịka ndị ọzọ. Mgbe ha natara ego, ha tamuru ntamu megide onye ahụ nwe ubi, na-asị, ‘Ndị bịara n’ikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu elekere ma i meela ka anyị na ha hara.
Anyị bụ ndị ji ụtụtụ buru mgbu ọrụ na anwụ chara n’ụbọchị taa.’ Onye nwe ubi zara otu n’ime ha sị, ‘Enyi m, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị.
Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu dinarị n’ụbọchị. Nara nke ruru gị laba. N’ihina achọrọ m ịkwụ ndị a bịara ikpeazụ ụgwọ dịka m si kwụọ gị.
Ọ bụ na-agaghị m eji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ka ị na-arọ m anya n’ihi obiọma m?’ Onye mbụ ga-abụ onye ikpeazụ, onye ikpeazụ abụrụ onye mbụ.
Igbo Mass Readings for August 20 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for August 19 2026, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.