Igbo Mass Readings for November 19 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 19 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1, 20-31

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Makabii nke Abụọ

N’oge ọzọ, e jidere ụmụnne asaa na nne ha. Eze manyere ha ka ha rie anụ ezi, site n’ịpịa ha ụtalị na ntaramahụhụ ndịọzọ. Nne ụmụaka a bụ onye mere ihe tụkarịchara mmadụ n’anya, nke na o kwesịrị ka a na echeta ya n’ụzọ pụrụ iche.

Ọ bụ ezie na ọ nọ, were anya ya hụ ka ụmụ ya asaa siri nwụọ n’otu ụbọchị, o jiri obi siri ike were die ihe ndị a niile maka na ọ tụkwasara obi na Chineke.

O jiri ntachiobi nwoke were gbanworo obi mmiri nwaanyị o nwere, were si otu ahụ nwee ike ịgwa nwa ya ọbụla okwu agbamume n’asụsụ nnanna ha. “Amaghị m ka ụnụ siri bata m n’afọ.

Ọ bụghị m nyere ụnụ ndụ na ụfụrụ nke ndụ, mọbụ njikọta akụkụ ahụ ụnụ niile. Ya mere, onye okike nke ụwa niile, onye kere mmadụ na ihe niile dị adị, ga-esi n’ebere ya enyeghachi ụnụ ndụ na ume, maka na ụnụ hụrụ iwu ya n’anya karịa otu ụnụ siri hụ onwe ụnụ n’anya.”

O doro Antiokus anya na nwaanyị a na-eme ya akaja site n’okwu ọnụ ya. Ya kpatara o jiri mee ihe niile o nwere ike ime iji hụ na nwa ya nke obere hapụrụ omenaala nnanna ha.

Ọ ñụrụ iyi, kwe nwata a nkwa ime ya ọgaranya na nnukwu mmadụ, nakwa idobe ya n’ọkwa dị elu nke na a ga na-akpọ ya ‘Enyi Eze.’ Ebe ọ bụ na o geghị eze ntị ma otu, eze kpọrọ nne ya, gwa ya ka ọ dụọ nwa ya ọdụ, ka ọ zọpụta ndụ ya.

Ka ọ gwakatara nwaanyị a okwu, o kwetara ime otu o siri kwuo. Mana mgbe ọ dabeere nwa ya n’akụkụ, o bidoro ime onyeeze ọjọ a ihe ọchị site n’ịgwa nwa ya n’asụsụ ala ha sị, “Nwa m meerenụ m ebere.

Chetakwa na eburu m afọ ime gị ọnwa itoolu, mụọ gị, kuo gị afọ atọ. Ana m akpachaapụrụ gị anya, na-egboro gị mkpa gị niile were ruo taa. Ya bụ ana m arịọsị gị ike nwa m, ka ị lee anya n’eluigwe na n’ụwa, chịgharịa ihe niile ị hụrụ na ha n’ime obi gị, ka ị ghọta nke ọma na ọ bụ Chineke kere ha niile n’ejighị ihe ọbụla.

Otuakwa ka o siri kee mmadụ niile. Egwu atụla gị n’ebe onye ogbu ọchụ a nọ. Were mmụọ gị niile nabata ọnwụ, ka ọ ga-abụ site n’ebere nke Chineke, ka m nweghachita gị na ụmụnne gị ọzọ.”

Mgbe nne ya ka na-ekwu ihe ndị a, nwatakịrị ahụ kwuru sị, “Ọ bụ gịnị ka ị na-eche? Ajụla m ihe eze tiri n’iwu. Iwu m ga-erubere isi bụ nke ahụ e nyere nnanna anyị ha site n’aka Mosis.

Mana gị onwe gị, si n’ụzọ ọjọọ dị icheiche were na-emegide ndị Hibru, ghọta nke ọma na ị gaghị agbanahụ ahụhụ niile Chineke na-akwadoro gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 17: 1,5-6, 8, 15

Azịza: Onyenweanyị, mgbe ugwu gị chawapụtara, ọñụ ga-ezuoke.

1. Onyenweanyị, nụrụ arịrịọ m na-arịọ maka ikpe ziri ezi,

Gee ntị n’arịrịọ m

Chee ntị nụrụ ekpere m

N’ihina o nweghị asị ọbụla dị n’ọnụ m.

Azịza: Onyenweanyị, mgbe ugwu gị chawapụtara, ọñụ ga-ezuoke.

2. Ana m eso ụzọ gị mgbe niile

Ka m ghara ịda.

Ana m akpọku gị, Chineke, ma ị na-azakwa m

Chee ntị nụrụ ihe m na-ekwu.

Azịza: Onyenweanyị, mgbe ugwu gị chawapụtara, ọñụ ga-ezuoke.

3. Chekwa m dịka ọkụkọ si echekwa ụmụ ya

Ma mụ onwe m ụgwọ ọrụ eziomume m ga-abụ ịhụ ihu gị

Aga m ejupụta n’añụrị ị hụ ihu gị.

Azịza: Onyenweanyị, mgbe ugwu gị chawapụtara, ọñụ ga-ezuoke.

MBEKU – Luk 8:15

Alleluịa, Alleluịa:

Añụrị na-adịrị ndị were ikwesị ntụkwasịobi  na obi dị mma jidesie okwu Chineke ike werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 19:11-28

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ka ha na-anụ ihe ndị a, Jesu gara n’ihu jiri ụkabụilu gwa ha okwu, n’ihina Ọ bịaruwela Jerusalem nso, ya na maka ha chere na alaeze Chineke ga-abịa ozigbo.

Ọ gwara ha sị, “Otu nnukwu ọgaranya gara n’ala dị anya ka e chie ya eze; e mechaa ka ọ lọghachitakwa.

Ọ kpọrọ ụmụodibo ya iri, nye ha ego pam iri, gwa ha sị: ‘Werenụ nke a na-azụ ahịa tupu mgbe m ga-alọta.’ Ma ndị obodo ya, bụ ndị ọ ga-achị kpọrọ ya asị.

Ha zipụkwara ndị ụkwụọzi ka ha sochie ya azụ sị ha: ‘Anyị achọkwaghị ka nwoke a chịa anyị.’

Mgbe ọ lọtara dịka onye e chirila eze, o nyere iwu ka a kpọọrọ ya ụmụodibo ya ndị o nyere ego, ka ọ mata uru ha ritere site n’azụmahịa.

Onye nke mbụ bịakwutere ya sị: ‘Otu pam gị amụtala pam iri ọzọkwa.’ Ọ gwara ya sị: ‘Ezigbo odibo, i mere nke ọma!

N’ihina i gosịrị onwe gị onye kwesịrị ntụkwasịobi n’ihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri n’alaeze m.’

Onye nke abụọ bịakwutere ya sị: ‘Nna anyị ukwu, otu pam gị amụtala pam ise.’ Ọ gwara ya sị: ‘Ị ga-achịkwa mba ise n’alaeze m.’

Nwodibo ọzọ bịakwara sị ya, ‘Nna anyị ukwu lekwa otu pam gị, eji m akwa kechie ya, zokwaara gị ya nke ọma, n’ihina egwu gị na-atụ m, maka na ị bụ ajọ mmadụ.

Ị na-ewere ihe i dobeghị na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ Nna ya ukwu gwara ya sị, ‘Gị bụ ajọ nwodibo, aga m ama gị ikpe site n’okwu ọnụ gị.

Ị maara na m bụ ajọ mmadụ na-ewere ihe m na-edobeghị, n’aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị.

Gịnị mere i tinyeghị ego m n’ụlọakụ nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m nara ya na ọmụrụnwa ya? Ọ gwara ndị kwụ n’ebe ahụ sị, ‘Naranụ ya pam ahụ, nyenụ ya onye nke nwere pam iri.’

Ha gwara ya sị: ‘Nna anyị ukwu, o nwerenụ pam iri.’ A gwa m ụnụ, onye ọbụla nwerenụ, a ga-enyekwa ya, ma onye ọbụla na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere a ga-anapụ ya.  

Gbasara ndị iro m niile ndị a, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụtanụ ha ebe a, gbukwaa ha n’ihu m.” Mgbe Jesu ji ụkabụilu gwachaa ha okwu a, ọ gara n’ihu ịgbago Jerusalem.

Igbo Mass Readings for November 20 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for November 19 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.