Igbo Mass Readings for November 18 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 18 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-11
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.
Mgbe ihe ndị a gachara, ahụrụ m ọhụ ọzọ: nke a bụ ọnụụzọ ghere oghe n’eluigwe. Anụrụ m olu ahụ nke gwaburu m okwu ka ọ na-ada ka ụda opiike sị, Gbagote n’ebe a, aga m egosị gị ihe ga-emezurịrị mgbe ihe ndị a gachara.
N’otu ihu ahụ, e mere ka m baa n’eluigwe n’ime mmụọ m. Ahụrụ otu ocheeze na onye nọ nay a. Onye ahụ nọ n’ocheeze chawapụtara dịka okwute na-egbuke egbuke dị ka ọnụahịa a na-akpọ Jaspa na Kanelian.
Eke na egwurugwu nke na-achawapụta ka okwute dara oke ọnụ a na-akpọ emerald gbara ocheeze ahụ gburugburu.
Ocheeze iri abụọ na anọ gbara ocheeze ahụ gburugburu, ebe ndị okenye iri abụọ na anọ nọkwa na ha. Ndị okenye ahụ yi akwa ọcha, kpurukwa okpueze ọlaedo n’isi ha. Amụmammiri, olu dị icheiche, na egbeigwe si n’ocheeze ahụ na-apụta.
Oriọna asaa guzo n’ihu ocheeze ahụ na-enwu enwu. Ndị a bụkwa mmụọ asaa nke Chineke. N’ihu ocheeze ahụ, e nwere ihe yiri osimiri e ji enyo mee.
Ọ dịka ajaenyo nke e nwere ike isi na ya hụ ụzọ. N’akụkụ ocheeze ahụ niile, o nwere anụ anọ dị ndụ nwejupụtara anya n’ihu na azụ gbara ocheeze ahụ gburugburu.
Nke mbụ n’ime anụ anọ ahụ dị ndụ yiri ọdụm. Nke abụọ yiri ehi. Nke atọ nwere ihu dịka mmadụ, ebe nke anọ dịka ugo na-efe efe.
Nke ọbụla n’ime anụ anọ ahụ dị ndụ nwere nku isii. Ahụ ha niile bụ anya anya ma n’elu ma n’ime.
Ha na-ekwe ukwe ehihie na abalị na-asị, ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka ọ dị bụ Dinwenụ Chineke nke pụrụ ime ihe niile, onye dịbụ adị, onye dị adị na onye ga-abịanụ!’
Mgbe ọbụla, anụ anọ ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ nọ n’ocheeze ahụ otito, nsọpụrụ na ekele onye dị ndụ ebeebe ebeebe, ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ na-ada n’ala n’ihu onye ahụ nọ n’ocheeze na-esekpurukwa onye ahụ dị ndụ ebeebe ebeebe.
Ha na-ekpupụ okpueze ha n’ihu ocheeze ahụ na-ekwe ukwe sị, “I tozuru etozu Onyenweanyị Chineke anyị, ịnara otito, nsọpụrụ na ike.
N’ihina ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa site n’ọchịchị gị ka i mere ka ha dị, I kekwara ha site n’ọchịchị gị.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 150:1-2, 3-4, 5-6.
Azịza: Nsọ, Nsọ ka ọ dị bụ Dinwenụ Chineke nke pụrụ ime ihe niile.
1.Toonụ Chineke n’ime ụlọnsọ ya dị n’ụwa.
Toonụ ya n’ime ụlọnsọ ya dị n’eluigwe.
Toonụ ya maka ọrụ ebube ya niile,
Toonụ ya maka ịdị ukwuu ya kacha elu.
Azịza: Nsọ, Nsọ ka ọ dị bụ Dinwenụ Chineke nke pụrụ ime ihe niile.
2. Were ụda opiigwe too ya
Werenụ une na ụbọ too ya
Werenụ itiegwu na ịgbaegwu too ya
Werenụ ọja na ụbọakwara too ya.
Azịza: Nsọ, Nsọ ka ọ dị bụ Dinwenụ Chineke nke pụrụ ime ihe niile.
3. Werenụ ụjaigwe too ya.
Werenụ ajaigwe nke na-ada oke ụda too ya.
Ka ihe niile dị ndụ
too Onyenweanyị. Alleluịa!
Azịza: Nsọ, Nsọ ka ọ dị bụ Dinwenụ Chineke nke pụrụ ime ihe niile.
MBEKU – Luk 8:15
Alleluịa, Alleluịa:
Añụrị na-adịrị ndị were ikwesị ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie okwu Chineke ike werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 19:11-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ka ha na-anụ ihe ndị a, Jesu gara n’ihu jiri ụkabụilu gwa ha okwu, n’ihina Ọ bịaruwela Jerusalem nso, ya na maka ha chere na alaeze Chineke ga-abịa ozigbo.
Ọ gwara ha sị, “Otu nnukwu ọgaranya gara n’ala dị anya ka e chie ya eze; e mechaa ka ọ lọghachitakwa.
Ọ kpọrọ ụmụodibo ya iri, nye ha ego pam iri, gwa ha sị: ‘Werenụ nke a na-azụ ahịa tupu mgbe m ga-alọta.’ Ma ndị obodo ya, bụ ndị ọ ga-achị kpọrọ ya asị.
Ha zipụkwara ndị ụkwụọzi ka ha sochie ya azụ sị ha: ‘Anyị achọkwaghị ka nwoke a chịa anyị.’
Mgbe ọ lọtara dịka onye e chirila eze, o nyere iwu ka a kpọọrọ ya ụmụodibo ya ndị o nyere ego, ka ọ mata uru ha ritere site n’azụmahịa.
Onye nke mbụ bịakwutere ya sị: ‘Otu pam gị amụtala pam iri ọzọkwa.’ Ọ gwara ya sị: ‘Ezigbo odibo, i mere nke ọma!
N’ihina i gosịrị onwe gị onye kwesịrị ntụkwasịobi n’ihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri n’alaeze m.’
Onye nke abụọ bịakwutere ya sị: ‘Nna anyị ukwu, otu pam gị amụtala pam ise.’ Ọ gwara ya sị: ‘Ị ga-achịkwa mba ise n’alaeze m.’
Nwodibo ọzọ bịakwara sị ya, ‘Nna anyị ukwu lekwa otu pam gị, eji m akwa kechie ya, zokwaara gị ya nke ọma, n’ihina egwu gị na-atụ m, maka na ị bụ ajọ mmadụ.
Ị na-ewere ihe i dobeghị na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ Nna ya ukwu gwara ya sị, ‘Gị bụ ajọ nwodibo, aga m ama gị ikpe site n’okwu ọnụ gị.
Ị maara na m bụ ajọ mmadụ na-ewere ihe m na-edobeghị, n’aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị.
Gịnị mere i tinyeghị ego m n’ụlọakụ nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m nara ya na ọmụrụnwa ya? Ọ gwara ndị kwụ n’ebe ahụ sị, ‘Naranụ ya pam ahụ, nyenụ ya onye nke nwere pam iri.’
Ha gwara ya sị: ‘Nna anyị ukwu, o nwerenụ pam iri.’ A gwa m ụnụ, onye ọbụla nwerenụ, a ga-enyekwa ya, ma onye ọbụla na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere a ga-anapụ ya.
Gbasara ndị iro m niile ndị a, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụtanụ ha ebe a, gbukwaa ha n’ihu m.” Mgbe Jesu ji ụkabụilu gwachaa ha okwu a, ọ gara n’ihu ịgbago Jerusalem.
Igbo Mass Readings for November 19 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for November 18 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.