Igbo Mass Readings for November 5 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 5 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:8-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ụnụ ejila onye ọbụla ụgwọ ọbụla, ma ọ bụghị ịhụrịta ibe ụnụ n’anya.
N’ihina onye na-ahụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuola iwu. Ihe niile e nyere n’iwu: Akwala iko; Egbula mmadụ; Ezula ohi; Enwela anya ukwu n’ebe ọkụ mmadụ ibe gị nọ; iwu ndị a niile na ndịọzọ e jikọtara ha n’otu iwu a: ‘Hụ mmadụ ibe gị n’anya dịka onwe gị.’
Onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya adịghị eme ya ihe ọjọọ. Ya bụ, ịhụnaanya bụ idebezu iwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 112: 1-2, 4-5, 9
Aziza: Añụrị na-adịrị ndị nwere ebere na-ebinyekwa ndị nọ na mkpa ihe.
1. Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,
Onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!
Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa
Agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi.
Aziza: Añụrị na-adịrị ndị nwere ebere na-ebinyekwa ndị nọ na mkpa ihe.
2. N’ihina onye ezigbo omume ga-achawapụta
dịka ihe n’etiti ọchịchịrị,
Ọ dị ebere, ịhụnaanya, na-akwụba aka ọtọ
Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego.
Aziza: Añụrị na-adịrị ndị nwere ebere na-ebinyekwa ndị nọ na mkpa ihe.
3. Ọ naghị atụfu oge inyere ndị ogbenye aka,
eziomume ya anaghị agbanwe agbanwe,
ndị dị otu a na-enweta nsọpụrụ mgbe niile.
Aziza: Añụrị na-adịrị ndị nwere ebere na-ebinyekwa ndị nọ na mkpa ihe.
MBEKU – Ọrụ Ndịozi 16:14.
Alleluịa, Alleluịa:
Dinwenụ, meghee obi anyị, k’anyị gee ntị n’okwu nke nwa gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 14: 25-33.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ugbu a ọtụtụ igwe mmadụ so Jesu, O wee tụgharịa sị ha, “Onye ọbụla nke na-abịakwute m, ma ọ kpọghị nna ya na nne ya asị, na nwunye ya na ụmụ ya na nwanne ya nwoke na nwanne ya nwaanyị, ee, ọ bụladị ndụ ya, ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
Onye ọbụla na-agaghị eburu obe ya sobe m n’azụ, Ọ pụghị ịhụ onye na-eso ụzọ m. Onye n’ime ụnụ chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ego ole ọ ga-ewe ka o wee mara ma o nwere ego ga-ezu ịrụ ụlọ elu?
O meghị otu a, mgbe ọ tọsịrị ntọala ma o nweghị ike ịrụcha ya, ndị niile hụrụ ya ga-ebido were ya mebe ihe ọchị na-asị, “Nwoke a bidoro ịrụ ụlọ ma o nweghị ike ịrụchapụ ya.”
Mọbụ, olee eze ga-achịrị naanị iri puku ndịagha gaa ibuso eze ibe ya nke nwere puku iri abụọ ndịagha, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, tụlee ma o nwere ike ibusoli ya agha?
Ọ bụrụ na o nweghị ike, mgbe onye na-ebuso ya agha ka nọ n’ebe dị anya, ọ na-ezipụ onyeozi ma rịọkwa maka ihe ga-eweta udo.
Ya bụ, onye ọbụla n’ime ụnụ na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
Igbo Mass Readings for November 6 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for November 5 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.