Igbo Mass Readings for October 29 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 29 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:26-30
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka n’ime adịghị ike anyị. N’ihina anyị amaghị ka e si ekpe ekpere dịka o kwesịrị. Ma Mmụọ Nsọ n’onwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bu n’uche. N’ihina Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ. Anyị ma na Chineke na-eme ihe niile maka ọdịmma ndị niile hụrụ ya n’anya bụ ndị Ọ kpọrọ dịka O si chọọ.
N’ihina ndị O buru ụzọ mara, họpụtakwa, O kenyere ha oke dị iche inwe ụdị oyiyi Nwa ya, ka Nwa ya wee bụrụ onye e buru ụzọ mụọ n’etiti ọtụtụ ụmụnna.
Ndị ahụ Chineke buru ụzọ mara, ka Ọ kpọrọ; ndị ahụ Ọ kpọrọ ka Ọ gụrụ na ndị eziomume, ndị ahụ Ọ gụrụ na ndị eziomume ka O nyekwara otito.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 13: 4-5, 6
Azịza: Onyenweanyị nchekwube m niile bụ n’ịhụnaanya gị.
1. Lee anya ma za m oku, Onyenweanyị na Chineke m!
Nye m ihe nke Gị, ọdịghị otu a, aga m arahụ ụra nke ọnwụ
Mgbe ahụ onyeiro m ga-ekwu sị, ‘etigbuola m ya,”
Ha ga-enwe añụrị mgbe ha hụrụ na m adaala.
Azịza: Onyenweanyị nchekwube m niile bụ n’ịhụnaanya gị.
2. Mana mụ onwe m nwere
nchekwube n’ịhụnaanya gị Onyenweanyị
Ka mkpụrụobi m ñụrịa n’enyemaka nzọpụta gị
Aga m ekwere Onyenweanyị ukwe
Maka iheọma nke O meere m.
Azịza: Onyenweanyị nchekwube m niile bụ n’ịhụnaanya gị.
MBEKU – Ps. 147:2, 15.
Alleluịa, Alleluịa:
Jerusalem, toonụ Onyenweanyị, Ọ na-ezipụ okwu ya n’ụwa niile.
Alleluịa.
OZIỌMA – 13:22-30
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu na-agagharị n’obodo ukwu na n’obodo nta, na-akụzi nkuzi, ka ọ na-aga Jerusalem. Otu onye jụrụ ya sị, “Onyenweanyị ọ bụ naanị mmadụ olemole ka a ga-azọpụta?”
O wee gwa ha sị, “Gbaanụ mbọ ka ụnụ si n’ụzọ dị warawara banye, n’ihina agwa m ụnụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ ka ha banye, ma ha agaghị enwe ike.
Oge ọbụla onye nwe ụlọ biliri gbachie ọnụụzọ ya, ụnụ ga-amalite iguzo n’ezi na-akụ aka n’ụzọ na-asị, “Dinwenụ megheere anyị ụzọ.”
Ọ ga-aza ụnụ sị, “Amaghị m ebe ụnụ si bịa.” Mgbe ahụ ụnụ ga-ebido na-asị, “Anyị na gị riri, ñụkwaa; ịkụzikwara nkụzi n’ogbe anyị.”
Ma ọ ga-asị, “Agwa m ụnụ, amaghị m ebe ụnụ siri bịa. Sinụ n’ebe m nọ pụọ, ụnụ niile bụ ndị omenjọ!”
N’ebe ahụ ụnụ ga-akwa akwa, na-ata ikikere eze; mgbe ụnụ hụrụ Abraham, Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ n’alaeze Chineke.
Ma ụnụ onwe ụnụ ga-abụ ndị a chụpụrụ n’ezi. Ndị mmadụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ na ọdida anyanwụ, sikwa n’ugwu na ndịda, bịa nọdụ n’oche nri n’Alaeze Chineke.
Ma lee, ụfọdụ ndị ikpeazụ ga-ebu ụzọ, ụfọdụ ndị bu ụzọ ga-ekpe azụ.
Igbo Mass Readings for October 30 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for October 29 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.