Igbo Mass Readings for June 28 2028, Wenezde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 28 2028, Wenezde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:8-13; 23:1-3
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze
Hilkaya, onye ụkọchukwu agwa Shafan onye odeakwụkwọ sị, “Achọtala m akwụkwọ nke iwu n’ime ụlọ nke Yahweh.” O nyere Shafan akwụkwọ ahụ, o wee gụọ ya.
Shafan onye odeakwụkwọ bịakwutere eze gwa ya sị, “ndị odibo gị enyepụchaala ndị nlekọta ọrụ ụlọ nke Yahweh ego niila a hụrụ n’ụlọ ahụ.”
Shafan onye odeakwụkwọ gwara eze na Hilkaya onyeisi ụkọchukwu nyere ya akwụkwọ. Ọ gụụrụ eze akwụkwọ ahụ. Mgbe eze nụchara okwu nke akwụkwọ iwu ahụ ọ dọwaa akwa ya.
Eze nyere Hilkaya, onye ụkọchukwu, Ahịkam nwa Shafan, Akboa nwa Mikaya, Shafan bụ onye odeakwụkwọ, nakwa Asaya nwodibo eze iwu sị, ‘Jeenụ, jụpụtanụ Yahweh, maka m, maka ndị mmadụ na maka ndị Juda niile, gbasara okwu nke dị n’ime akwụkwọ a a chọtara n’ihina ọnụma nke Yahweh nwere n’ebe anyị nọ adịla ukwuu, ọ mụnyerela ka ọkụ n’ihina nna anyị ha egeghị ntị n’okwu nke akwụkwọ a ime ihe niile e dere gbasara anyị.”
Eze ziri ozi ka a kpọkọọrọ ya ndị okenye niile nke Juda na Jerusalem. Eze na ndị Juda niile, ndị bi na Jerusalem, ndị ụkọchukwu, ndị amụma, ndị obodo niile ma ndị ukwu na ndị nta banyere n’ime ụlọ Yahweh.
Eze agụpụtara ha okwu niile dị n’ime akwụkwọ ọgbụgbandụ nke a hụrụ n’ime ụlọ Yahweh. Eze guzoro n’akụkụ ogige dị n’ụlọnsọ ahụ, n’ihu mmadụ niile mesie ọgbụgbandụ ahụ ike site n’ikwe nkwa ime ihe niile Osebụrụwa nyere n’iwu, iji obi ya niile debe ha, na iso ụkpụrụ niile e dere n’akwụkwọ ahụ. Ndị mmadụ ahụ niile kwere nkwa idebe iwu ndị ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.119:33, 34, 35, 36, 37, 40
Azịza: Onyenweanyị kuziere m n’ụzọ iwu gị
1. Kuziere m ụzọ gị, O Onyenweanyị,
Ka m wee dobe ha oge niile.
Azịza: Onyenweanyị kuziere m n’ụzọ iwu gị
2. Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị,
Wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.
Azịza: Onyenweanyị kuziere m n’ụzọ iwu gị
3. Dube m n’ụzọ iwu gị
n’ihina ọ bụ ihe na-atọ obi m ụtọ.
Azịza: Onyenweanyị kuziere m n’ụzọ iwu gị
4. ka obi m nọgide n’iwu gị
ghara ịchọba akụnụụba.
Azịza: Onyenweanyị kuziere m n’ụzọ iwu gị
5. Wepụ anya m n’ile ihe efu,
ma nye m ndụ site n’okwu gị.
Azịza: Onyenweanyị kuziere m n’ụzọ iwu gị
6. Lee ka mkpụrụobi m si achọ gị,
nye m ndụ site n’eziomume gị.
Azịza: Onyenweanyị kuziere m n’ụzọ iwu gị
MBEKU – Jọn 10:27
Alleluia, Alleluịa:
Atụrụ m na-anụ olu m, amakwara m ha, ha na-esokwa m.
Alleluia.
OZIỌMA – 7:15-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Zerenụ ndị amụma asị, ndị na abịakwute ụnụ n’oyiyi atụrụ, ma n’ime ha, ha bụ agụ owuru. Site n’omume ha ka ụnụ ga-esi mata ha.
A na-aghọta ụdara n’osisi ogwu? Ka a na-aghọta ube n’osisi uke? Osisi ọma ọbụla na-amịta mkpụrụ ọma, ma osisi ọjọọ na-amịta mkpụrụ ọjọọ.
Osisi ọma apụghị ịmịta mkpụrụ ọjọọ, nke osisi ọjọọ pụrụ ịmịta mkpụrụ ọma. Osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma, a ga-egbutu ya, ma tụnye ya n’ọkụ. Ya bụ, ụnụ ga-amata ha site na mkpụrụ ha.
Igbo Mass Readings for June 29 2028, Nnukwu Emume Pita na Pọl dị Asọ – Ụmụazụ.
Igbo Mass Readings for June 28 2028, Wenezde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.