Igbo Mass Readings for July 30 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 30 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 34:29-35

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

Mgbe Mosis siri n’ugwu Sinaị gbadata, jirikwa mbadamba okwute abụọ nke ọgbụgbandụ ahụ n’aka ya, Ọ maghị na ihu ya na-amụkesi amụkesi n’ihina ya na Yahweh kparịtara ụka.

Ka Erọn na ndị Izrel niile hụrụ Mosis, egwu tụrụ ha ịbịaru ya nso n’ihina ihu ya na-amụkesị amụkesị. Mana Mosis kpọrọ ha; Erọn na ndị ndu nke ọgbakọ ụmụ Izrel abịakwute ya, ọ gwa ha okwu.

E mechaa ụmụ Izrel niile gbakọtara, o nyere ha iwu niile Yahweh gwara ya n’ugwu Sinaị. Mgbe ha na Mosis kwuchara, o weere akwa isi kpuchie ihu ya.

Ma mgbe ọbụla ọ gara n’ihu Yahweh ka ha kwuo okwu ọ na-ekpupụ ya ruo mgbe ọ pụtara gwakwa ụmụ Izrel ihe Yahweh nyere ya n’iwu.

Ụmụ Izrel na-ahụ na ihu Mosis na-egbuke egbuke ma ọ na-ezi ha ozi, o zichaa ha ọ na ekpuchikwa ya ọzọ, ruo mgbe ọ ga-eje ịgwa Yahweh okwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 99:5, 6, 7, 9

Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ

1. Ka anyị bulienụ Onyenweanyị Chineke anyị elu,

kpọọnụ isi ala n’ihu ya;

ọ dị nsọ.

Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ

2. Mosis na Erọn so na ndị ụkọchukwu ya,

Samuel so na ndị na-akpọku aha ya;

ha kpọkuru Onyenweanyị, ọ zara ha.

Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ

3. Ọ gwara ha okwu site n’ide igweojii,

ha dobere iwu niile o nyere ha.

Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ

4. Bulienụ Onyenweanyị Chineke anyị elu,

sekpuoronụ ya n’ihu ugwu ya dị nsọ;

n’ihina Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.

Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, meghee anya nke obi anyị, ka anyị wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ anyị.

Alleluia.

OZIỌMA – 13:44-46

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara oke igwe mmadụ sị,”Alaeze eluigwe dịka akụ e zoro n’ubi nke otu nwoke hụrụ wee kpuchie ya ihe, o were ọñụ laa, ree ihe niile o nwere, bịa zụrụ ala ubi ahụ”.

“Ọzọ, alaeze eluigwe dịka onye na-azụ ahịa nke na-achọ ụlarị ọma. Mgbe ọ hụrụ otu ụlarị dị oke ọnụ, ọ lara, ree ihe niile o nwere, wee zụta ụlarị ọma ahụ”.

Igbo Mass Readings for July 31 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for July 30 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.