Igbo Mass Readings for August 5 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 5 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 31:1-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah
N’oge ahụ ọ bụ Yahweh na-ekwu, “aga m abụ Chineke ezinụụlọ niile nke Izrel, ha ga-abụkwa ndị nke m.” Yahweh kwuru sị, “Ndị nwụfọrọ n’agha n’ime ọzara nwere isiọma.
Mgbe Izrel chọrọ ka o zuo ike ma nweekwa ọnọdụ Yahweh siri n’ebe dị anya bịakwute ya. Ewerela m ịhụnaanya dị ebeebe hụ gị n’anya n’ihi nke a, aga m na-akwụdosiike n’ebe ị nọ.
Aga m arụ gị, aga m arụgharịkwa gị, Izrel nwaagbọghọ amaghị nwoke. Ị ga-ejikwa ihe egwu gị chọọ onwe gị mma, ị ga-esokwa ndị ọñụ juru obi ete egwu.
Ọzọ ị ga-akọkwa vaịn n’elu ugwu niile nke Sameria, ndị na-akụ mkpụrụ ga-akụ ma nwee ọñụ n’ihe mkpụrụ ha kụrụ mịpụtara.
N’ihina otu ụbọchị ndị nche ga-akpọ oku n’ugwu obodo nke Ifrem sị, ‘Kulienụ ka anyị gaa na Zayọn, gakwuru Osebụrụwa Chineke anyị.’
N’ihina Yahweh kwuru sị, “Werenụ ọñụ na oke olu bụọ abụ maka Jekọb, tiekwanụ mkpu maka eze mba niile, kwupụtanụ, nyenụ ekele na-asị, Yahweh azọpụtala ndị nke ya bụ ndị fọdụrụ n’Izrel.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Jer: 31:10, 11-12, 13
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya
1. Geenụ ntị n’okwu nke Yahweh, ụnụ mba niile
meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile, kwuonụ sị
na onye nke kposara Izrel ga-ekpokọtakwa ya ọnọ ọzọ
ọ ga-echekwa ya dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya
2. Maka na Yahweh agbapụtala Jekọb
mee ka o nwere onwe ya n’aka ndị na-akpagbu ya.
Ha ga-abịa bụọ abụ na-adasi ụda ike n’elu Zayọn.
ha ga na-egbuke site n’afọọma na ịma mma Chineke.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya
3. Mgbe ahụ ụmụagbọghọ ga-agba egwu ọñụ,
ụmụokorobịa na ndị okenye ga-ejupụtakwa n’añụrị.
Aga m agbanwe iru ụjụ ha ma mee ka ha nwee añụrị
aga m atasị ha obi were obi añụrị gbanwee ahụhụ ha.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya
MBEKU – Jọn 10:27
Alleluia, Alleluia
Atụrụ m na-anụ olu m, ọ bụ Dinwenụ na-ekwu; Amakwaara m ha, ha na-esokwa m.
Alleluia
OZIỌMA – 15:21-28
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu siri n’ebe ahụ pụta, jebe n’akụkụ obodo Taya na Sidọn. Otu nwaanyị onye Kenaan nke bi n’ala ahụ pụtara na-eti mkpu sị, “Meere m ebere Nna m ukwu nwa Devid, mmụọ ọjọọ jidesiri nwa m nwaanyị ike!”
Jesu egheghị ya ọnụ. Ndị na-eso ụzọ ya wee bịakwute ya, rịọ ya sị, “Chụlaa nwaanyị a n’ihina ọ na-eti mkpu na-eso anyị!”
Ọ zaa ha sị, “Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” Nwaanyị ahụ bịara sekpuru n’ihu Jesu na-arịọ ya sị, “Nna m ukwu biko nyere m aka.”
Jesu azaa ya sị, “Ọ dịghị mma iwere nri ụmụaka ga-eri tụpụrụ nkịta.” Nwaanyị ahụ zara ya sị, “Ee Nna anyị, ọbụladị ụmụ nkịta na eri irighịri nri nke siri n’okpokoro nna ha ukwu dapụ.”
Mgbe ahụ, Jesu zara ya sị, Nwaanyị okwukwe gị buru ibu! Ka ihe niile ị na-achọ mezuoro gị.” N’otu oge ahụ, ahụ dịrị nwa ya nwaanyị mma.
Igbo Mass Readings for August 6 2026, Emume Nnwogha nke Onyenweanyị
Igbo Mass Readings for August 5 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.