Igbo Mass Readings for July 1 2026, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 1 2026, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:14-15, 21-24
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Amọs
Chọba ezi ihe kama ajọ ihe, ka ụnụ wee dị ndụ, ka Yahweh nke igwe ndịagha wee nọnyere ụnụ, ka ụnụ siri kwuo.
Kpọọnụ njọ asị ma hụ iheọma n’anya, ma meenụ ka ikpe nkwụmọtọ bụrụ ihe kwụdosiriike n’ọnụụzọ mbata; n’ihina o nwere ike bụrụkwa na Yahweh Chineke ji ike niile ga-enwe amara n’ebe ndị ahụ fọdụrụ n’ezinụụlọ Josef nọ.
Akpọrọ m emume oriri na ọñụñụ ụnụ asị ma jụkwa ya. Ọgbakọ na ofufe ụnụ anaghịkwa amasị m. Ọ bụ eziokwu na ụnụ na-erunyere m aja nsureọkụ ụnụ na mkpụrụ ọka ụnụ, ma agaghị m anabata ha, ọ bụladị aja udo nke ụnụ ji ụmụanụ gbara abụba chụọ, agaghị m elekwasa ha anya.
Ya bụ, wezuganụ ukwe ụnụ ji eme ụzụ n’ebe m nọ, agaghịkwa m ege ntị n’egwu nke ụbọ akwara ụnụ. Kama kwerenụ ka ikpe nkwụmọtọ hudata ka mmiri, ka eziomume hukwaa ka iyi na-asọ asọ, mgbe niile.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50:7, 8-9, 10-11, 12-13, 16-17
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.
1. Geenụ ntị ndị nke m ana m ekwu okwu,
Izrel, ana m agba akaebe megide ụnụ
mụ Osebụrụwa, Chineke ụnụ.
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.
2. Ọ bụghị n’ihi aja ụnụ ka m ji wee na-abara ụnụ mba,
aja nsureọkụ ụnụ nọ n’ihu m oge niile;
agaghị m anabata oke ehi ọbụla nke si n’ụlọ ụnụ,
mọbụ ewu ọbụla nke si n’ụlọanụ ụnụ.
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.
3. N’ihina ụmụ anụọhịa niile bụ nke m
tinyekwara puku kwuru puku ehi n’elu ugwu m niile.
A maara m ụmụnnụnụ niile nke igwe,
o nweghị ihe bi n’ala na-abụghị nke m.
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.
4. Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m akọrọ ụnụ
n’ihina ụwa na ihe niile dị n’ime ya bụ nke m
Ana m eri anụ oke ehi,
ka ana m añụ ọbara ewu?
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.
5. Kedụ ikikere ụnụ nwere iji na-agụgharị iwu m
iji na-ekwupụta maka ọgbụgbandụ m?
n’ihina ụnụ jụrụ ịnabata nkuzi m,
ma leghara okwu m anya.
Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.
MBEKU – Ps. 145:13
Alleluia, Alleluịa:
Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile, omume ya niile jupụtara n’obi ebere.
Alleluịa.
OZIỌMA – 8:28-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe o rutere n’akụkụ nke ọzọ, n’obodo Gadara, mmadụ abụọ ndị ajọ mmụọ ji, si n’ebe a na-eliozu pụta zutere ya. Ha na-eyi oke egwu nke na o nweghị onye nwere ike ịgafe n’ụzọ ahụ.
Ozigbo ha tiri oke mkpu sị: “Kedụ ihe jikọrọ anyị na gị, nwa nke Chineke? Ị bịara ebe a ịta anyị ahụhụ tupu oge eruo? Mgbe ahụ e nwere igwe ezi nọ nso ebe ahụ na-ata nri.
Ajọ mmụọ ndị ahụ arịọ ya sị: “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, ziga anyị n’ime igwe ezi ndị a”. Jesu gwara ha sị, “Gabanụ!” Ha wee pụta, banye n’ime igwe ezi ahụ.
Ozigbo, ezi ndị ahụ weere ọsọ si n’ugwu ahụ gbadaa, wee wụba n’ime osimiri. Mmiri gbagburu ha niile. Ndị na-azụ ezi ahụ gbara ọsọ, gbaba n’ime obodo, ebe ha kọọrọ ndị mmadụ ihe merenụ, na ihe mekwara ndị ahụ ajọ mmụọ ji.
Ozigbo, ndị obodo ahụ niile pụtara izute Jesu. Mgbe ha hụrụ ya, ha rịọrọ ya ka o si n’obodo ha pụọ.
Igbo Mass Readings for July 2 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 1 2026, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.