Igbo Mass Readings for July 26 2028, Wenezde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 26 2028, Wenezde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1, 4-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah

Okwu nke Jeremaya nwa Hilkaya onye nchụaja n’usoro nke ndị Anatọt dị n’ala ndị Benjamin; Okwu nke Chineke bịakwutere m na-asị: “Tupu a tụrụ ime gị, amarala m gị, tupu a mụọ gị edoola m gị nsọ; ahọpụtakwala m gị ka onye amụma nke mba niile.”

Azara m ya sị, “Ah! Osebụrụwa Chineke! Lee amaghị m ka e si ekwu okwu n’ihina m bụ nwata.” Mana Osebụrụwa gwara m sị, “Ekwukwala na ị bụ nwata; ị ga-agakwuru ndị niile m ga-ezigara gị, ị ga-ekwukwa ihe ọbụla m gwara gị.

Atụkwala ha egwu n’ihina m nọnyeere gị ịzọpụta gị.” Osebụrụwa na-ekwu. Ma Osebụrụwa setịrị aka ya metụ n’ọnụ m, wee gwa m sị, “Lee, etinyela m okwu m n’ọnụ gị.

Lee, ezipụla gị taata n’ime mba niile nakwa ọchịchị niile, ka ị tọpụta ma kụtuo, ka i mebie ma weghara ọchịchị niile, ka ị rụzie ma kụọkwa.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 71:1-2, 3-4, 5-6, 15, 17

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta ike nke nzọpụta gị

1. Na gị Onyenweanyị ka m gbabara,

ekwela ka ihere mee m.

N’eziomume gị gbapụta m, zọpụta m

gee m ntị ma zọpụta m!

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta ike nke nzọpụta gị

2. Bụrụ okwute nke mgbaba m,

mgbidi aja nke ga-azọpụta m

n’ihina ị bụ okwute m, nchedo m.

Chineke m, zọpụta m n’aka ndị ajọ mmadụ.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta ike nke nzọpụta gị

3. N’ihina sọ gị Onyenweanyị bụ nchekwube m,

Onyenweanyị echekwubere m na gị bido na mgbe m dị n’okorobịa,

Atụkwasara m gị obi bido na mgbe a mụrụ m,

Ị bụrịị oke nke m site n’afọ nne m.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta ike nke nzọpụta gị

4. Ọnụ m ga-ekwupụta eziomume gị

na ike nke nzọpụta gị ụbọchị niile

O Chineke, Ị kuziiri m bido na nwata m,

aga m na-ekwupụta ọrụ ebube gị.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta ike nke nzọpụta gị

MBEKU – Matiu 4:4

Alleluia, Alleluia:

Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadị si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta”.

Alleluia.                  

OZIỌMA – 13:1-9

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

N’otu ụbọchị ahụ, Jesu siri n’ụlọ pụọ, gaa nọdụ n’akụkụ oke osimiri. Oke igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu, nke mere o jiri banye n’ụgbọmmiri wee nọdụ ala.

Igwe mmadụ ahụ guzokwa n’akụkụ oke osimiri ahụ. O jiri ụkabụilu gwa ha ọtụtụ okwu sị, “Ọgha mkpụrụ gara ịgha mkpụrụ n’ubi ya.

Ka ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ dara n’akụkụ okporo ụzọ, ụmụnnụnụ atụrịa ha. Ụfọdụ dara n’ala okwute, ebe ha enwetaghị aja zuuru ha.

Ozigbo ha pulitere, n’ihina aja dị ebe ahụ emighị emi, mgbe anwụ wara, ha chanwụrụ, kpọnwụọ n’ihina mgbọrọgwụ ha emibaghị n’ime ala.

Mkpụrụ ụfọdụ dara n’etiti ogwu; ogwu tolitere, kpagbuo ome ha pupụtara. Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ala dị mma, wee mịta mkpụrụ, ụfọdụ mịtara otu narị, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ iri atọ. Onye nwere ntị ya nụrụ”.

Igbo Mass Readings for July 27 2028, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for July 26 2028, Wenezde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.