Igbo Mass Readings for August 12 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 12 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-7; 10:18-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel

Mgbe ahụ Dinwenụ tiri nnukwu mkpu ka m wee nụrụ sị, “bịanụ ndị na-ebibi obodo, onye ọbụla burukwa ngwa mbibi ya n’aka.”

Ozigbo, ụmụnwoke isii sitere n’ọnụụzọ nke dị n’ebe mgbago na-abịa, nke ọbụla bu ngwaagha n’aka ya. N’ime ha bụ otu nwoke yi uwe na-achake achake ma nyarakwa ihe edemede nke ndị oke akwụkwọ n’ukwu ya.

Ha wee bata n’ime ụlọnsọ ma kwụrụ n’ihu ebe nchụaja nke e jiri ọlaọkụ mee. Otito nke Chineke nke Izrel ewee site n’elu cherubim ebe ọ nọọrọ bilie nke chere ihu n’ọnụụzọ nke ụlọnsọ nke Chineke.

Ọ kpọọ nwoke ahụ yi uwe ọcha ma yirikwa ihe edemede n’ukwu, sị ya, “Gaa gburugburu obodo Jerusalem niile ma kaa akara n’ihu ndị niile na-eru ụjụ ma na-ebekwa akwa maka ihe ọjọọ nke na-eme na ya.”

Anụkwara m ka Ọ gwara ndịọzọ sị, “Soronụ ya gaa obodo niile ma gbuchapụnụ ha, ụnụ egosịkwala ha obi ebere ọbụla.

Ụnụ enwekwala obi ebere ọbụla n’ebe ndị okenye ndị nwoke, ụmụokorobịa, ndị agadi nwaanyị, ụmụagbọghọ na ụmụaka nọ.

Gbuchapụnụ ma kpochapụkwanụ ha niile. Ma ụnụ emetụkwala onye ọbụla nwere akara ahụ n’ihu ya aka.

Bidonụ n’ebe kacha nsọ nke m.” Nke a mere ha jiri bido site na ndị okenye, ndị nke nọ n’ụlọnsọ nke Yahweh.

Ya asị ha, “Merụọnụ ụlọnsọ nke Yahweh, werenụ ozu mechie ebe obibi niile, bidonụ ọrụ ozigbo.” Ha apụọ bido na-egbu ndị mmadụ, na-emebikwa ihe niile nọ n’obodo ahụ.

Mgbe ahụ, ebube nke Yahweh pụrụ n’ọnụụzọ nke ụlọnsọ ahụ, ma guzoro n’elu Cherub ndị ahụ. Ndị Cherub ahụ gbasara nku ha wee felie ka m na-ele ha anya.

Ha bukwa ụkwụ igwe ndị ahụ, guzoro n’ọnụụzọ nke nọ n’ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ nke Yahweh. Ebube nke Chineke nke Izrel nọ n’elu ha.

Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ n’okpuru Chineke nke Izrel n’akụkụ mmiri Keba. Ama m na ha bụ ndị Cherub.

Nke ọbụla nwere ihu anọ na nku anọ, ma n’okpuru nku ha ka m hụrụ ihe dịka aka mmadụ. Banyere ihe ha yiri, ha dịka ihu ndị m hụrụ n’akụkụ mmiri Keba. Ha niile na-aga n’ihu n’ihu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 113: 1-2, 3-4, 5-6

Azịza: Otito nke Onyenweanyị dị elu karịcha eluigwe niile.

1. Too, ụmụodibo nke Chineke,

too aha nke Onyenweanyị

Ngọzi dịrị aha nke Chineke

bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.

Azịza: Otito nke Onyenweanyị dị elu karịcha eluigwe niile.

2. Bido n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya,

otito dịrị aha nke Osebụrụwa!

Onyenweanyị dị elu karịcha ụwa niile

otito ya karịchakwara eluigwe niile.

Azịza: Otito nke Onyenweanyị dị elu karịcha eluigwe niile.

3. Onye dịka Onyenweanyị bụ Chineke anyị?

ocheeze ya dị n’elu,

mana ọ na-eledata anya n’eluigwe na ụwa.

Azịza: Otito nke Onyenweanyị dị elu karịcha eluigwe niile.

MBEKU – Ps 111:8

Alleluia, Alleluia:

Iwu gị dị ntụkwasịobi n’ụzọ niile nke a mere ka ọ dị ebeebe ebebe.

Alleluia

OZIỌMA – 18:15-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na nwanne gị emejọ gị, gaa gwa ya mmehie ya n’ebe naanị gị na ya nọ. Ọ bụrụ na ọ ñaa gị ntị, iritela nwanne gị ahụ n’uru.

Ma ọ bụrụ na ọ ñaaghị gị ntị, kpọrọ otu onye mọbụ mmadụ abụọ gakwuru ya, ka okwu ọbụla bụrụ nke mmadụ abụọ mọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.

Ọ bụrụ na ọ ñaghị ha ntị, gwa ndị nzukọ, ma ọ bụrụkwanụ na ọ ñaghị ọbụladị ndị nzukọ ntị were ya ka onye mba ọzọ mọbụ ka onye ọnaụtụ.

Ana m agwa ụnụ eziokwu, ihe ọbụla ụnụ ga-eke agbụ n’elu ụwa a, a ga-ekekwa ya n’eluigwe. Ihe ọbụla ụnụ ga-atọpụ n’elu ụwa a, a ga-atọpụkwa ya n’eluigwe.

Ọzọ agwa m ụnụ ọ bụrụ na mmadụ abụọ n’ime ụnụ ekwekọrịta n’ihe ọbụla ha na-arịọ n’elu ụwa, Nna m nke bi n’eluigwe ga-emere ha ya.

N’ihina ebe mmadụ abụọ mọbụ atọ zukọtara n’aha m, ebe ahụ ka m nọ n’etiti ha.

Igbo Mass Readings for August 13 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 12 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.