Igbo Mass Readings for June 17 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 17 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2: 1, 6-14
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze
Ka Osebụrụwa chọrọ iji oke ifufe kpọrọ Elaịja laa n’igwe, Elaịja na Elaịsha si Gịlgal na-abịa. Oge ahụ, Elaịja gwara ya, “Biko chere ebe a n’ihina Yahweh zigara m Jọdan.”
Ọ zaa ya sị, “Ka Chineke dị ndụ, ka gị onwe gị dịkwa ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ha abụọ wee gaba. Ụmụ ndịamụma iri ise sokwara ha gaba ma kwụsị n’ebe tetụrụ anya, ka ha abụọ guzoro n’akụkụ Jọdan.
Mgbe ahụ, Elaịja apịakọọ uwe mwụda ya, pịa ya n’elu mmiri ahụ, o kewaa ụzọ abụọ, ha abụọ wee gafere n’ala ọkpọrọ.
Mgbe ha gafechara, Elaịja agwa Elaịsha sị, “Rịọ ihe ọbụla m ga-emere gị tupu a kpọpụ m ebe ị nọ.” Elaịsha rịọrọ ya sị, “Mee ka m keta oke mmụọ gị mmaji abụọ.”
Ọ zaa ya sị, “Ị rịọrọ ihe siri ike, ma ka o sila dị, ị hụ m mgbe a na-akpọpụ m ebe ị nọ, ọ ga-adị otu I siri riọ, mana ọ bụrụ na ị hụghị m oge a na-akpọpụ m, ọ gaghị adị otu ahụ.” Ka ha abụọ na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọịnyịnya ọkụ na-adọkpụ bịara kewaa ha abụọ.
Elaịja wee soro oke ifufe laa n’igwe. Oge ahụ, Elaịsha hụrụ ya wee tie mkpu sị, “Nna m, Nna m Dike ndị Izrel ji aga mba!” ma ọ hụkwaghị ya ọzọ.
O weere uwe mwụda Elaịja ahụ dapụrụ n’ahụ ya laghachi bịa guzoro n’akụkụ osimiri Jọdan. O weere uwe ahụ pịa n’elu mmiri ahụ tie mkpu sị, “Olee ebe Yahweh, Chineke nke Elaịja ahụ nọ?” Ozigbo ọ pịara uwe ahụ na mmiri, o kewaa ụzọ abụọ, Elaịsha wee gafee.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 31: 20, 21, 24
Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa
1. Lee ka ịdịmma gị siri dị ukwuu, O Osebụrụwa
nke i dobeere ndị niile na-atụrụ gị egwu,
na-enye ndị niile gbabara na gị
Ka ụwa niile wee jiri anya ha hụ.
Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa
2. N’ihu gị ka ị na-ezobe ha
ka atụmaatụ ndị ajọomume ghara imetụ ha;
na ndo nke gị ka ị na-ezobe ha
ka ọnụ ọjọọ ghara imetụ ha.
Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa
3. Ụnụ ndị kwụsiri ike hụnụ Osebụrụwa n’anya,
Chineke na-echekwaba ndị kwere na ya,
mana Ọ na-akwụ ndị ngala ụgwọ ka ọrụ ha si dị.
Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa
MBEKU – Ps. 19:9
Alleluia, Alleluịa:
Iwu nke Onyenweanyị na enye obi añụrị, ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya ime eziomume, naanị ka ndị mmadụ wee hụ ụnụ, n’ihina ụnụ mee otu a, Nna ụnụ nke bi n’eluigwe agaghị akwụ ụnụ ụgwọ ọrụ.
Ya mere mgbe ọbụla ụnụ na enye onyinye, ụnụ afụla opi dịka ndị ihuabụọ si eme n’ụlọ nzukọ ha, na n’okporo ụzọ niile, ka ndị mmadụ wee too ha.
N’ezie, agwa m ụnụ, ha anatala ụgwọ ọrụ ha. Mgbe ọbụla ị na-enye onyinye ebere, ekwela ka akaekpe gị mata ihe akanri gị na-eme; ka o wee bụrụ ihe i nyere na nzuzo, Nna ụnụ nke na-ahụ na nzuzo ga-akwụghachi ụnụ ụgwọ.
“Mgbe ọbụla ụnụ na-ekpe ekpere, ụnụ emekwala ka ndị ihuabụọ, n’ihina ọ na-amasị ha ịkwụrụ ma na-ekpekwa ekpere n’ime ụlọ nzukọ na n’akụkụ okporo ụzọ niile, ka ndị mmadụ wee hụ ha.
N’ezie agwa m ụnụ, ha anatala ụgwọ ọrụ ha. Ma mgbe ọbụla ụnụ na-ekpe ekpere, banyenụ n’ime ụlọ ụnụ, mechie ụzọ, kpeere Nna ụnụ nke nọ na nzuzo. Nna ụnụ nke na-ahụ na nzuzo ga-akwụghachi ụnụ ụgwọ.
Igbo Mass Readings for June 18 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for June 17 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.